Ṅụrịanụ Ọṅụ na Jehova Tegharịakwanụ Egwú Ọṅụ
OGE e nwere ihe ịga nke ọma n’ịrụzu ọrụ ọ bụla kwesịrị oge e tinyere na ya na-abụkarị oge ịṅụrị ọṅụ. Ihe omume ngụsị akwụkwọ ndị e mere na March 13, 1999, n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, bụ oge dị otú ahụ n’ezie nye ụmụ akwụkwọ 48 nke klas 106 nke Watchtower Bible School of Gilead.
Okwu mmeghe nke Theodore Jaracz kwuru, onye so n’Òtù Na-achị Isi, nke gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Gilead, bụ́kwa onyeisi oche nke usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ, mere ka okwu ndị dị n’Abụ Ọma 32:11 pụta ìhè: “Ṅụrịanụ ọṅụ na Jehova, tegharịakwanụ egwú ọṅụ, unu ndị ezi omume.” N’ịkọwa ihe mere o ji kwesị ekwesị ka mmadụ nile ṅụrịa ọṅụ n’ihe omume a, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi ihe Jehova ji ndị ahụ obi ha ziri ezi, gụnyere ụmụ akwụkwọ Gilead anyị, na-arụzu, ka anyị ji aṅụrị ọṅụ n’ihe omume ndị yiri nke a.” Ọ bụ ezie na ụmụ akwụkwọ ahụ emeela atụmatụ dị iche iche iji bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilead ma gbasie mbọ ike iji ruo eru maka ozi ala ọzọ, ọ bụ Jehova mere ka ihe nile bịaruo ná njedebe n’ụzọ gara nke ọma. (Ilu 21:5; 27:1) Nwanna Jaracz mesiri ike na nke ahụ bụ ihe mere a ga-eji ‘ṅụrịa ọṅụ na Jehova.’
Ndị òtù ezinụlọ na ndị ọbịa nke ụmụ akwụkwọ ahụ bụ́ ndị si ná mba 12 bịa iji kirie ihe omume a na-enye ọṅụ, so n’ime ndị nọ n’ụlọ mgbakọ ahụ dị na Patterson. Ka mmadụ 5,198 ahụ bịaranụ—gụnyere ndị òtù ezinụlọ Betel dị na Brooklyn, Patterson, na Wallkill, bụ́ ndị sonyere n’ihe omume ahụ site na tepụ na vidio—nọ na-atụ anya usoro ihe omume ga-esochinụ, o doro anya na mmụọ ọṅụ jupụtara n’ebe ahụ.
Ndị A Gbara Ume Ịnọgide Na-enwe Mmụọ nke Ọṅụ
Ka Nwanna Jaracz kwusịrị okwu mmeghe ya, ọ kpọpụtara onye mbụ n’ime ndị ọkà okwu ise kwadebeworo ndụmọdụ ndị na-agba ume dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị nanị maka ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na Gilead kama maka ndị nile bịaranụ.
Onye mbụ kwuru okwu bụ William Malenfant, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 34 nke Gilead, nke na-eje ozi ugbu a dị ka onye inyeaka na Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi. Banyere isiokwu ya bụ́ “‘Ihe Nile’ Abụghị Ihe Efu!” nke dabeere n’Eklisiastis 1:2, ọ jụrụ ajụjụ bụ́: “Solomọn ò bu n’uche n’ezie na ihe nile, n’ihe nile nke okwu ahụ pụtara, bụ ihe efu?” Azịza ya: “Ee e. Ọ nọ na-arụtụ aka na ihe omume mmadụ nke na-eleghara ihe bụ uche Chineke anya, nchụso ndị dị iche n’ihe bụ uche Chineke—ihe ndị ahụ nile bụ ihe efu.” N’ụzọ dị iche, ife ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, abụghị ihe efu; ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, na ịkụziri ya ndị ọzọ abụghịkwa ihe efu. Chineke adịghị echezọ mgbalị dị otú ahụ ndị ohu ya na-eme. (Ndị Hibru 6:10) N’ezie, ọ bụrụgodị na ndị ahụ nwere ihu ọma Chineke enwee ọdachi, a ‘ga-eke ha ná ngwugwu nke ndị dị ndụ n’aka Jehova.’ (1 Samuel 25:29) Lee echiche na-enye obi ụtọ ọ bụ! Icheta isi ihe ndị a pụrụ inyere ndị nile na-efe Jehova aka ịnọgide na-enwe mmụọ nke ọṅụ.
John Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi, ji okwu ya bụ́ “Chọtanụ Ọṅụ n’Ọrụ Ozi Ala Ọzọ Unu,” gbaa klas ahụ na-agụsị akwụkwọ ume. O gosipụtara na ije ozi ala ọzọ anọwo na-amasị Jehova Chineke nke ukwuu mgbe nile. “Ọ bụ ihe e jikọtara ya na ịhụnanya Jehova gosipụtara n’ebe ụwa nọ. O zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa a. Jisọs bụ onye ozi ala ọzọ kasịnụ, onye ozi ala ọzọ mbụ.” Ọ bụ ezie na ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ pụrụ ịtụgharị uche ná mgbanwe ndị Jisọs na-aghaghị ime iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ e nyere ya n’ụwa, abamuru nke ozi ala ọzọ Jisọs jere ka dịịrị ndị nile ga-eji ohere ndị ahụ mee ihe. Dị ka Nwanna Barr gosipụtara, nke a bụ n’ihi na ịrụ ọrụ Chineke na-atọ Jisọs ụtọ, ọ hụkwara ụmụ mmadụ n’anya. (Ilu 8:30, 31) Nwanna Barr gbara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ume ịnọgidesi ike n’ọrụ e nyere ha, ọ bụghị nanị n’ihi ịtachi obi, kama n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ ime otú ahụ. “Daberenụ n’ebe Jehova nọ; ọ gaghị emechu unu ihu,” ka ọ rịọrọ klas ahụ.—Abụ Ọma 55:22.
“Ijegharị n’Aha Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi” bụ isiokwu ọkà okwu na-esonụ, bụ́ Lloyd Barry, onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, họọrọ. N’ịbụ onye jeworo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ ruo ihe karịrị afọ 25 na Japan mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke 11 nke Gilead, Nwanna Barry kọrọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị ozi ala ọzọ bu ụzọ nwere ma kọwaa ihe ịma aka ndị ha na-aghaghị iche ihu. Ndụmọdụ dị aṅaa bara uru ka o nwere inye klas ahụ na-agụsị akwụkwọ? “Karịsịa, nọgidenụ na-enwe ezi ọnọdụ ime mmụọ unu. Ọzọkwa, mụtanụ asụsụ na ọdịbendị ha. Nọgidenụ na-enwe omume ịkpa ọchị. Nọgidesiekwanụ ike n’ọrụ ahụ; ike agwụla unu, unu adakwala mbà.” Nwanna Barry gwara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na n’ọrụ ala ọzọ ha, ha ga-ezute ọtụtụ ndị na-ejegharị n’aha chi na arụsị dị iche iche, o chetakwaara ha okwu Maịka bụ́: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya, anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Ihe nlereanya nke ndị bụbu ndị ozi ala ọzọ bụụrụ ndị ohu Chineke nile ihe mkpali dị ike n’ezie iji nọgide na-ejegharị n’aha Jehova na ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.
Onye ọzọ kwuru okwu n’usoro ihe omume ahụ bụ onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen. Isiokwu ya welitere ajụjụ bụ́, “Gịnị Ka Unu Ga-aghọ?” O gosipụtara na inwe ọganihu n’ozi Chineke dabeere n’inwe okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ wetaara Eze Esa mmeri kpụ ọkụ n’ọnụ megide usuu ndị agha nke ndị iro ya dị otu nde ndị ikom. Ma, Azaraịa onye amụma chetaara ya mkpa ọ dị ịnọgide na-adabere n’ebe Chineke nọ: “Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere Ya.” (2 Ihe E Mere 14:9-12; 15:1, 2) Ebe ọ bụ na aha Chineke, bụ́ Jehova, na-enye echiche na ọ na-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nzube ya—ma nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ ga-abụ Onye Na-enye Ihe, Onye Nchebe, ma ọ bụ ọbụna Onye Mmezu Ikpe—ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị dabeere n’ebe Jehova nọ ma na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya, ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ ndị e nyere ha. (Ọpụpụ 3:14) “Unu echezọla ma ọlị,” ka Nwanna Bowen kwubiri, “na ọ bụrụhaala na unu emee ka nzube Jehova bụrụ nzube unu, ọ ga-eme ka unu ghọọ ihe ọ bụla a chọrọ iji rụzuo ọrụ e nyere unu.”
Onye ọkà okwu ikpeazụ n’akụkụ a nke usoro ihe omume ahụ bụ Wallace Liverance, onye bụbu onye ozi ala ọzọ nke bụzi onye na-edebanye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Okwu ya, nke isiokwu ya bụ “Meenụ Ka Okwu Chineke Dịrị Ndụ ma Na-arụ Ọrụ n’Ime Unu,” kpọtụrụ uche n’ozi, ma ọ bụ nkwa Chineke ahụ na-adịghị agha agha bụ́ nke na-aga n’ihu mgbe nile iru mmezu ya. (Ndị Hibru 4:12) Ọ na-emetụta ndụ nke ndị kwere ka o mee otú ahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Olee otú a pụrụ isi mee ka okwu ahụ dị ndụ ma na-arụ ọrụ ná ndụ anyị? Ọ bụ site n’iji ịdị uchu na-amụ Bible. Nwanna Liverance chetaara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ banyere usoro ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị ha mụtara na Gilead nke gụnyere ịgụ na ịkọwa echiche dị na ya nakwa itinye Okwu Chineke n’ọrụ. O hotara okwu Albert Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke jere ozi dị ka onyeisi oche nke kọmitii guzobere Ụlọ Akwụkwọ Gilead n’ihe karịrị afọ 50 gara aga: “Site n’iji ihe a na-ekwu mee ihe, mmadụ pụrụ inweta ikike ime mmụọ zuru ezu, zie ezi, nke Chineke mere ka ọ dịrị n’Okwu ya.” Iji otú a na-amụ Bible na-eme ka Okwu Chineke dị ndụ ma na-arụ ọrụ.
Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ Ndị Na-enye Ọṅụ
Mgbe okwu ndị ahụ gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ kọọrọ ndị na-ege ntị ahụmahụ ụfọdụ na-enye ọṅụ. N’okpuru nduzi nke Mark Noumair, onye bụbu onye ozi ala ọzọ nke bụzi onye nkụzi Gilead, ìgwè ụmụ akwụkwọ kọrọ ma mee ihe ngosi banyere otú ha si gbalịa ịgba àmà n’ọnọdụ ndị dịgasị iche. Ụfọdụ malitere ma duziere ndị nọ n’ógbè ahụ ọmụmụ Bible site n’ịchọpụta ọnọdụ ndị ha nọ na ya na ihe ndị ha na-ekwu nakwa site n’inwe mmasị n’ebe ha nọ. N’ụzọ dị otú a, ụmụ akwụkwọ ahụ nọ ‘na-arịba onwe ha na ozizi ha ama,’ ha nwekwara mmasị n’ezie n’inyere ndị ọzọ aka inweta nzọpụta.—1 Timoti 4:16.
A tụrụ ọtụtụ aro dị irè, ụfọdụ ụmụnna nwoke nwere ahụmahụ bụ́ ndị nọ na-anara ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ maka ndị so n’òtù kọmitii alaka, nke a nọ n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower duzie, mekwara ka ọṅụ a na-enwe n’ije ozi ala ọzọ pụta ìhè. Nwanna Samuel Herd na Nwanna Robert Johnson bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ, gbara ndị nnọchiteanya sitere n’alaka ụlọ ọrụ Society ndị dị na Bolivia, Zimbabwe, Nicaragua, Central African Republic, Dominican Republic, Papua New Guinea, na Cameroon, ajụjụ ọnụ.
Mgbe a kọsịrị ahụmahụ ma gbasịa ajụjụ ọnụ ndị ahụ, Gerrit Lösch, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 41 nke Gilead, onye sozikwa n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu ikpeazụ n’isiokwu ahụ na-akpali iche echiche bụ́ “Ị̀ Bụ ‘Onye A Na-achọsi Ike’?” Nwanna Lösch bu ụzọ chetara ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na ndị mmadụ eleghị Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke nke zuru okè, anya dị ka onye a na-achọsi ike, kama “e ledara ya anya, ọ bụkwa onye mmadụ hara aka.” (Aịsaịa 53:3) Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya na taa n’ọtụtụ akụkụ ụwa, a na-ele ndị ozi ala ọzọ anya dị ka ndị a jụrụ ajụ, ndị a na-anakwereghị ma ọ bụ ndị a na-anabataghị. N’aka nke ọzọ, n’oge Daniel jere ozi na Babilọn ruo ogologo afọ, Onye Okike si n’ọnụ otu mmụọ ozi kpọọ Daniel “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu,” ugboro atọ. (Daniel 9:23; 10:11, 19) Gịnị mere ka Daniel dị otú ahụ? O mebighị ụkpụrụ Bible ma ọlị mgbe ọ na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọdịbendị dị na Babilọn; ọ kwụwara aka ya ọtọ n’ụzọ ọ bụla, n’adịghị mgbe ọ bụla o ji ọkwá ya mee ihe maka uru onwe onye; o jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-amụ Okwu Chineke. (Daniel 1:8, 9; 6:4; 9:2) O kpegakwaara Jehova ekpere mgbe nile, ọ dịkwa njikere mgbe dum inye Chineke otuto maka ihe ndị ọ rụzuru. (Daniel 2:20) Site n’ịgbaso ihe nlereanya Daniel, ndị ohu Chineke pụrụ ịbụ ihe a na-achọsi ike, ọ bụchaghị nye ụwa, kama nye Jehova Chineke.
Iji mechie usoro ihe omume ahụ na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ, onyeisi oche gụpụtara ụfọdụ n’ime telegram na ozi ndị si gburugburu ụwa bịa. Mgbe e mesịrị, nke ọ bụla n’ime di na nwunye 24 ahụ natara diplọma ha, e kwupụtakwara mba ebe ndị e zigara ha. N’ikpeazụ, onye nnọchiteanya klas ahụ gụpụtara akwụkwọ ozi klas ahụ degaara Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel, na-ekwupụta ekele klas ahụ nwere maka ọzụzụ na nkwadebe ha nataworo n’ime ọnwa ise gara aga.
Ka usoro ihe omume ahụ bịaruru ná njedebe, a pụrụ ịnụ ‘ọṅụ na ikele ekele’ n’etiti ìgwè mmadụ ahụ na-alasasịnụ.—Nehemaịa 12:27.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Klas
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10
Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 19
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Ọnụ ọgụgụ ndị lụrụ di na nwunye: 24
Nkezi afọ ndụ: 33
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13
[Foto dị na peeji nke 25]
Klas nke 106 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Deakin, D.; Puopolo, M.; Laguna, M.; Davault, S.; Dominguez, E.; Burke, J. (2) Gauter, S.; Vazquez, W.; Seabrook, A.; Mosca, A.; Helly, L.; Breward, L. (3) Brandon, T.; Olivares, N.; Coleman, D.; Scott, V.; Petersen, L.; McLeod, K. (4) McLeod, J.; Thompson, J.; Luberisse, F.; Speta, B.; Lehtimäki, M.; Laguna, J. (5) Gauter, U.; Dominguez, R.; Helly, F.; Smith, M.; Beyer, D.; Mosca, A. (6) Scott, K.; Seabrook, V.; Speta, R.; Coleman, R.; Breward, L.; Davault, W. (7) Smith, D.; Lehtimäki, T.; Petersen, P.; Thompson, G.; Vazquez, R.; Beyer, A. (8) Luberisse, M.; Deakin, C.; Brandon, D.; Puopolo, D.; Olivares, O.; Burke, S.