Ndị Mmụta nke Okwu Chineke Na-agụsị Akwụkwọ
N’IṄOMI ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, a maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile maka nkwusa ụlọ n’ụlọ ha. E mere ka ọrụ a pụta ìhè n’okwu mmeghe nke usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas 102 nke Watchtower Bible School of Gilead.
Na March 1, 1997, Albert Schroeder, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kpọtụrụ uche n’otu isiokwu pụtara n’oge na-adịbeghị anya na magazin French bụ́ Le Point. O kwuru banyere atụmatụ Roman Katọlik ịmalite nkwusa ụlọ n’ụlọ n’Itali. “Ka [ndị ozi ala ọzọ nke Vatican] ghara ịgbara aka lọghachi ka ha na-asọ mpi n’ókèala Ndịàmà Jehova,” ka isiokwu ahụ kwuru, “ọbụna na Vatican emewo ndokwa ka e bipụta otu nde nke Oziọma Senti Mak, ka ndị ozi ha na-ezute ndị ọkachamara [Ndịàmà] ‘n’inyefe’ okwu ọma ahụ ụlọ n’ụlọ.”
Mmadụ 48 ahụ gụsịrị akwụkwọ so n’ime ndị ṅomiworo ụzọ nkwusa bụ́ ọkpọka nke Jisọs n’ịgbasa Okwu Chineke. Ha esiwo n’ala asatọ bịa n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Watchtower dị na Patterson, New York. N’ọnwa ise nke agụmakwụkwọ ha, ha mụrụ Bible site n’isi ruo n’ọdụ. Ihe ọmụmụ ha gụnyekwara akụkọ ihe mere eme nke nzukọ Chineke, akụkụ dị irè nke ndụ ozi ala ọzọ, na mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Ihe ndị a nile bụ n’iburu otu nzube n’uche—ịkwadebe ha maka ije ozi ala ọzọ n’ofesi n’ala 17 ebe a na-ezije ha. Ka ha na-agụsị akwụkwọ, ndị na-ege ntị dị 5,015 sitere ọtụtụ mba keere òkè n’ọṅụ nke ememe ahụ. Olee ndụmọdụ ikpeazụ dị irè ụmụ akwụkwọ Gilead ahụ nwetara?
Agbamume Bịara n’Oge Ya Maka Ndị Ozi Ala Ọzọ Ọhụrụ
Mgbe okwu mmeghe onye isi oche gasịrị, Ralph Walls, onye inyeaka nke Kọmitii Ndị Ọrụ nke Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu mbụ dị mkpirikpi nke nwere ndụmọdụ dị irè maka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ. Isiokwu ya bụ “Chetanụ Inwe Ịhụnanya.” O gosipụtara na Bible, na 2 Timoti isi nke 3, buru amụma na ụwa ga-aghọwanye ebe ịhụnanya na-adịghị. O nyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ihe ncheta a bịara n’oge ya, n’ikwekọ ná nkọwa ịhụnanya nke dị ná 1 Ndị Kọrint 13:1-7: “Unu, dị ka ndị ozi ala ọzọ, pụrụ ịgafe hour a chọrọ unu n’aka. Unu pụrụ inwe oké ihe ọmụma site n’ọzụzụ Gilead unu. Ma ọ bụ anyị pụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ gabiga oge n’ọrụ e kenyere anyị n’alaka anyị. Ma mgbalị anyị na àjà anyị nile enweghị ihe ha pụtara ma ọ bụrụ na anyị echezọọ inwe ịhụnanya.”
Onye ọzọ nọ n’usoro ihe omume ahụ bụ Carey Barber, nke Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye tụlere isiokwu bụ́ “Jehova Na-edu Anyị Aga ná Mmeri.” Site ná ntakịrị mmalite ha mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Jehova Chineke eduruwo ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi gaa ná mmeri n’ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ya, n’agbanyeghị mkpagbu. Na 1931 Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara ha mgbe ahụ, nakweere aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova, na-emechu ndị ụkọchukwu nke Krisendọm ihu. “Klas nke 102 nke ndị ozi ala ọzọ e nyere ọzụzụ na Gilead nwere ugbu a oké ihe ùgwù nke ikere òkè buru ibu n’ọrụ dị ebube nke inye ọtụtụ ndị dị ka o kwere omume ohere ịmụta aha ahụ dị nsọ,” ka Nwanna Barber kwuru. Ha na-esonye ná ndepụta dị ogologo nke ndị ozi ala ọzọ 7,131 a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ ndị nyewokwara aka ịgbasa nkwusa nke Okwu Chineke site n’ala 54 na 1943 ruo n’ala 233 taa.
Ọkà okwu na-esonụ, Lloyd Barry, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi, gụsịrị akwụkwọ na klas nke 11 nke Gilead ma jee ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Japan ruo ihe karịrị afọ 25. O nyere agbamume site n’isiokwu ya, bụ́ “Na-anọgide n’Ihe Ndị A.” “Unu ga-enweta ihe dị ukwuu n’ọṅụ unu site n’inwe ntachi obi,” ka ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ. Ụgwọ ọrụ ndị dị aṅaa na-esite n’ịtachi obi n’ọrụ ozi ala ọzọ ma ọ bụ n’ọrụ ọchịchị Chineke ọzọ abịa? “Karịa ihe nile, ntachi obi anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa . . . E nwere afọ ojuju dị ukwuu a ga-achọta n’iguzosi ike n’ezi ihe n’okpuru ule . . . Meenụ ozi ala ọzọ ọrụ unu ná ndụ . . . Ụgwọ ọrụ unu ga-abụ ‘i mere nke ọma’ na-enye obi ụtọ.” (Matiu 25:21; Ilu 27:11) N’imechi okwu ya, Nwanna Barry ji obi ya nile tụọ aro ka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ “na-anọgide n’ihe ndị a” site n’ikpebisi ike na ubi ozi ala ọzọ ga-abụ nnọọ ndụ ha.—1 Timoti 4:16.
“Gịnị Ka Ị Ga-ahụ?” bụ ajụjụ Karl Adams, bụ́ onye soworo kụziere ọtụtụ klas Gilead ihe, jụrụ. O gosipụtara na ihe ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ga-ahụ n’ebe e kenyere ha ọrụ na-adabere ọ bụghị nanị n’ọhụhụ ụzọ nkịtị kamakwa n’anya nke obi ha. (Ndị Efesọs 1:18) Ihe ndị nledo Israel hụrụ mgbe ha nyochara Ala Nkwa ahụ mere ihe atụ nke a. Ndị nledo 12 nile hụrụ otu ihe ahụ ma e lee ya anya n’ụzọ nkịtị, ma nanị abụọ hụrụ Ala Nkwa ahụ site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya. Ndị ozi ala ọzọ pụkwara ịhụ ihe n’ụzọ dịgasị iche. N’ụfọdụ ala ebe ha ga na-eje ozi, ha pụrụ ịhụ ịda ogbenye, ihe mgbu, na enweghị olileanya. Ma ha ekwesịghị imeghachi omume n’ụzọ na-ezighị ezi wee gbahapụ ala ahụ. Nwanna Adams kọrọ banyere otu onye ozi ala ọzọ sitere na klas e nwere ná nso nso a bụ́ onye sịrị: “Ahụmahụ ndị a mere ka m ghọta na m ghaghị ịnọ n’ebe a. Olileanya maka ọdịnihu dị ndị a mkpa. Achọrọ m ime ka e nwee ọdịiche ná ndụ ha.” Nwanna Adams mechiri site n’ịgba ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ume ịhụ ala e kenyere ha ọrụ dị ka ebe Jehova kpebiworo ime akụkụ nke Paradaịs Ya zuru ụwa ọnụ, werekwa ndị nọ n’ebe ahụ dị ka ndị ga-eso n’ọha mmadụ nke ụwa ọhụrụ ahụ.
Okwu ikpeazụ n’akụkụ a nke ihe omume ahụ bụ nke Wallace Liverance kwuru, bụ́ onye jere ozi ruo ọtụtụ afọ n’ubi ozi ala ọzọ tupu ọ ghọọ onye nkụzi Gilead. “Jiri Nghọta Mee Ihe n’Ọrụ Dị Ebube nke Chineke” bụ isiokwu ya. Iji nghọta eme ihe gụnyere iji akọ, nkà, na amamihe eme ihe. Nke ahụ bụ ihe Eze Sọl nke Israel na-emeghị.—1 Samuel 13:9-13; 15:1-22.
Otu ụzọ isi jiri nghọta mee ihe bụ site n’ịnakwere ihe ịma aka nke ịgbanwe gaa n’ụzọ ndụ ọhụrụ, tinyere ịmụ asụsụ ọhụrụ na ịmara ndị mmadụ. Ahụmahụ ndị ndị ozi ala ọzọ na-enwe n’izute ihe ịma aka ma imeri ihe mgbochi pụrụ iwusi ha ike n’ụzọ ime mmụọ otú ahụ e si wusie Joshua na Keleb ike ka ha meriri ala ahụ Chineke nyeworo ha.
Ajụjụ Ọnụ
Akụkụ na-esonụ nke usoro ihe omume ahụ gụnyere ajụjụ ọnụ dị iche iche. Harold Jackson gbara Ulysses Glass ajụjụ ọnụ, onye na-edeba aha na onye nkụzi Ụlọ Akwụkwọ Gilead eri ogologo oge, bụ́ onye dị afọ 85 ugbu a. Ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ka nọ n’ubi na-echeta nke ọma ọtụtụ afọ ya nke nkụzi na ọzụzụ o ji ikwesị ntụkwasị obi mee. Onye ọzọ bụ Mark Noumair, onye nkụzi Gilead nọrọ ọtụtụ afọ n’ozi ofesi n’Africa tupu o sonyere ndị ọrụ Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ banyere ozi ha n’ọnwa ise nke agụmakwụkwọ ha. Ahụmahụ ha gosiri nke ọma na e nwere ndị nwere mmasị n’Okwu Chineke n’ókèala ahụ.
Mgbe nke ahụ gasịrị Robert Ciranko na Charles Molohan sooro ndị ikom nweworo ahụmahụ bụ́ ndị na-aga ụlọ akwụkwọ ọzọ n’ihe owuwu ahụ, ụlọ akwụkwọ maka ndị ọrụ alaka, kwurịta okwu. Ndụmọdụ ha nyere klas ahụ na-agụsị akwụkwọ gụnyere mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi ma tụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke ọgbakọ. Ha tụrụ aro na ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ekwesịghị ibu ụzọ buru ihe ga-eme n’ọrụ ozi ala ọzọ n’obi, kama nke ahụ, dịrị nnọọ njikere ịnabata ihe ọ bụla ha hụrụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na itinye ndụmọdụ a n’ọrụ ga-enyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a aka ịrụzu ọrụ ha dị ka ndị nkụzi nke Okwu Chineke.
N’ikpeazụ, Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, gwara ndị na-ege ntị okwu n’isiokwu bụ́ “Gịnị Na-enwe Mmetụta n’Ahụ Onye?” Ọ kọwara na mgbe anyị, dị ka ndị Kraịst, na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ, anyị pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị ọzọ. “Ndị ozi ala ọzọ nzukọ Jehova na-ezipụ enwetawo ihe ndekọ kwesịrị ịja mma nke imetụta ndị mmadụ n’ụzọ ime mmụọ, dị mma,” ka o kwuru. Mgbe ahụ o zoro aka n’okwu nke ụfọdụ ndị e nyewooro aka ijere Chineke ozi n’ihi ezi ihe nlereanya nke ndị ozi ala ọzọ setịpụrụ. “Ka unu jigide ezi aha nke ndị Jehova nwetaworo ma nọgide na-akụ aka n’ọnụ ụzọ ndị ahụ n’ọrụ e kenyere unu n’ofesi n’ịchọ ndị kwesịrị . . . Ọzọkwa, site n’àgwà unu dị ọcha, nke guzoziri eguzozi, guzogidenụ mmụọ nke ụwa a, bụrụkwanụ mmetụta dị mma maka otuto na nsọpụrụ Jehova,” ka o kwuru ná mmechi.
Ná mmechi nke usoro ihe omume ahụ, onye isi oche ziri ozi ekele sitere n’ebe dị nso na n’ebe dị anya wee nyezie diplọma ndị ahụ ma kwupụta ebe e kenyere ọrụ ozi ala ọzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, otu n’ime ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ gụrụ nkwupụta klas ahụ nke na-egosi ekele maka ntụziaka e nyere. N’ụzọ doro anya, usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas nke 102 mere ka ndị gere ntị kpebisikwuo ike ịga n’ihu n’ịkpọsa Okwu Chineke.
[Foto dị na peeji nke 31]
Klas nke 102 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Duffy, C.; Alexis, D.; Harff, R.; Lee, J.; Corey, V.; Nortum, T.; Mora, N.; Journet, F. (2) Djupvik, L.; Singh, K.; Hart, B.; Kirkoryan, M.; Lee, S.; Rastall, S.; Zoulin, K.; Kollat, K. (3) Singh, D.; Pitteloud, J.; Pitteloud, F.; Bokoch, N.; Torma, C.; Muxlow, A.; Richardson, C.; Nortum, D. (4) Harff, J.; Journet, K.; Barber, A.; Loberto, J.; Loberto, R.; Muxlow, M.; Mora, R.; Hart, M. (5) Torma, S.; Rastall, A.; Diaz, R.; Diaz, H.; Weiser, M.; Weiser, J.; Kirkoryan, G.; Zoulin, A. (6) Alexis, R.; Barber, D.; Djupvik, H.; Duffy, C.; Kollat, T.; Richardson, M.; Bokoch, S.; Corey, G.