Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 6/1 p. 23-27
  • Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 50 Ma Na-esiwanye Ike!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 50 Ma Na-esiwanye Ike!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị E Nyere Ọzụzụ na Gilead Amalite Ụzọ Ndụ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead—“Ezi Ndị Ozi Ala Ọzọ!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • E Nwekwuo Ndị Ozi Ala Ọzọ Maka Owuwe Ihe Ubi Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ṅụrịanụ Ọṅụ na Jehova Tegharịakwanụ Egwú Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 6/1 p. 23-27

Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 50 Ma Na-esiwanye Ike!

“E NWERE ọtụtụ ebe a na-agbabeghị àmà banyere Alaeze ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu,” ka N. H. Knorr gwara klasị mbụ nke Gilead na February 1, 1943, bụ́ ụbọchị mmepe nke ụlọ akwụkwọ ahụ. O kwukwasịrị: “A ghaghị inwe ọtụtụ narị na ọtụtụ puku ndị ọzọ a pụrụ irute ma ọ bụrụ na e nwekwuru ndị ọrụ n’ubi. Site n’amara Onyenwe anyị, a ga-enwekwu.”

E nwewokwa ndị ọrụ karị​—⁠ọtụtụ nde ndị ọzọ! Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze amụbawo site na 129,070 mmadụ na 54 ala na 1943 ruo 4,472,787 na 229 ala na 1992! Ụlọ Akwụkwọ Gilead etinyewo ihe dị ukwuu n’àmà nke rụpụtaworo mmụba ahụ. Mgbe 50 afọ gasịrị ọ nọgidewo na-ekere òkè dị mkpa n’ịzụ ndị ọrụ bụ ndị ozi ala ọzọ ije ozi n’ebe ọ bụla e nwere mkpa ha n’ubi ụwa.

Na March 7, 1993, e nwere 4,798 ndị a kpọrọ òkù na ndị òtù ezinụlọ Betel nke U.S. bụ́ ndị zukọrọ n’Ụlọ Mgbakọ Jersey City, na New Jersey, maka ngụsị akwụkwọ nke klasị nke 94. Ọnọdụ nke a pụrụ iche n’ezie nyekwara ohere ileghachi anya azụ n’afọ 50 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ị̀ ga-achọ ịmatatụ banyere usoro ihe omume ahụ?

Mgbe abụ mmepe gasịrị, George D. Gangas so n’Òtù Na-achị Isi kpere ekpere si n’ala ala obi. E mesịa, mgbe Carey W. Barber, bụ́ onye isi oche kwusịrị okwu mmepe, ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ​—⁠na ndị nile bịaranụ​—⁠ṅara ntị nke ọma n’usoro okwu ndị dị mkpirikpi.

Robert W. Wallen bu ụzọ kwuo okwu, n’isiokwu bụ́ “Ọ Dịghị Mgbe Ị Na-anọ Nanị Gị.” N’olu na-ekpo ọkụ, ọ sịrị: ‘N’ụbọchị ndị na-abịa n’ihu, ọnọdụ dị iche iche ga-ebilite ná ndụ gị mgbe ọ ga-adị gị nnọọ ka ị nọ nanị gị, nọrọ nnọọ ebe dị anya site n’ezinụlọ na ndị enyi gị.’ Mgbe ahụ, olee otú a pụrụ isi kwuo, “Ọ dịghị mgbe ị na-anọ nanị gị?” Ọ kọwara, sị: ‘N’ihi na onye ọ bụla n’ime unu nwere ohere nke iso Jehova Chineke kwurịta okwu mgbe ọ bụla.’ Ọ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume iwere ihe ùgwù nke ekpere n’ihe dị oké ọnụ ahịa ma jiri ya na-eme ihe kwa ụbọchị. E mesịa, dị ka Jisọs, ha ga-enwe ike ikwu sị, “Nanị mụ anọghị.” (Jọn 16:32) Lee aha ihe agbamume okwu ndị ahụ bụụrụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ!

Ka ọ na-ewulite isi okwu bụ́ “Jigidesie Olileanya Gị Ike” (nke dabeere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke March 7), Lyman A. Swingle so n’Òtù Na-achị Isi kwuziri okwu maka mkpa nke àgwà abụọ​—⁠ntachi obi na olileanya⁠—​dị. ‘Nkọcha, ibu iwe n’obi, ịkpọasị, ịtụ mkpọrọ, ọbụna ọnwụ, bụ ihe ndị mere e ji chọọ ntachi obi n’aka ndị Kraịst,’ ka o kwuru. ‘E nweghị njedebe nke ike karịrị nke mmadụ bụ́ nke Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ iji mee ihe n’oge mkpa. Nke a n’ezie bụ ihe na-emesi obi ike, karịsịa maka unu ndị na-agụsị akwụkwọ.’ Gịnị banyere olileanya? ‘A pụghị iwezụga olileanya n’ụsọ,’ ka ọ kọwara. ‘Dị ka okpu agha na-echekwa isi onye yi ya, otú ahụ ka olileanya nke nzọpụta si echebe ma na-echekwa ike echiche nke onye Kraịst, na-enyere ya aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.’​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 5:8.

Ọkà okwu na-esote, Ralph E. Walls, họọrọ isiokwu na-akpali akpali, “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gbanarị Gaa ná Nchebe nke ‘Ebe Sara Mbara’?” Gịnị bụ “ebe sara mbara” nke a? (Abụ Ọma 18:19) “Ọnọdụ nke mgbapụta nke na-eweta udo nke uche na ịnọ ná ntụkwasị obi nke obi,” ka ọkà okwu ahụ kọwara. Gịnị ka anyị chọrọ mgbapụta site na ya? ‘Onwe gị​—⁠ndahie ndị nke onwe gị.’ O kwukwasịrị: ‘Ọzọ, ọnọdụ ndị dị n’èzí nke Setan na-akwanye ọkụ.’ (Abụ Ọma 118:5) Olee otú anyị pụrụ isi gbanarị gaa ná nchebe nke ebe sara mbara? ‘Site n’ịchọ iwu Jehova n’ihe nile anyị na-eme na site n’ikpekusi Jehova ekpere ike n’okwukwe n’ihi ihe nile na-echegbu anyị.’

“Gịnị Na-echere n’Ọdịnihu?” bụ isiokwu nke Don A. Adams họọrọ. Gịnịkwa na-echere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ndị ahụ n’ọdịnihu? Oge nke nhazigharị, ka ọ kọwara. “E nwekwara ọtụtụ ngọzi dị n’ihu unu.” Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ abụọ, bụ́ ndị, mgbe ha nọzichara n’ebe e kenyere ha ọrụ, dere, sị: “Chee echiche banyere ụbọchị kachasị mma i nwetụworo n’ozi, nke ahụ bụkwa otú ụbọchị nile dị ka ya. Anyị apụghị ibuli akwụkwọ ole anyị chọrọ, ndị mmadụ na-anọgidekwa na-asị anyị duziere ha ọmụmụ ihe.” Ọkà okwu ahụ chere okwu ụfọdụ ihu n’ebe ezinụlọ na ndị enyi nke ndị ahụ na-agụsi akwụkwọ nọ: ‘Ọ dịghị mkpa ka unu na-echegbu onwe unu banyere ndị a na-agụsị akwụkwọ. Unu pụrụ inyere ha aka site n’idegara ha okwu agbamume.’​—⁠Ilu 25:25.

Ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ kwuziri okwu. Jack D. Redford họọrọ isiokwu bụ́ “Atụla Anya Ihe Ọ Bụla n’Aka Onye Ọ Bụla.” Otu n’ime ihe ịma aka ndị ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ga-eche ihu bụ iso ndị mmadụ na-akparịta, ka ọ kọwara. Gịnị pụrụ inye aka? “Leghara mmejọ ha anya. Atụla anya ihe gabigara ókè n’aka ndị ọzọ. Atụla anya ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu nke ihe i chere ruuru gị mgbe nile. Nye ohere maka ezughị okè ndị ọzọ, obi ọma nke a ga-enyekwara gị aka iso ndị ọzọ na-akparịta. Ikike i nwere iso ndị ọzọ na-akparịta ga-abụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ntozu okè gị.” (Ilu 17:9) N’ezie, itinye ndụmọdụ amamihe nke a n’ọrụ ga-enyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịhazigharị onwe ha ịbụ ndị ozi ala ọzọ n’ala ọzọ!

“Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá,” ka 2 Ndị Kọrint 4:7 na-ekwu. Ulysses V. Glass, onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, kwuru okwu n’akụkụ ihe odide nke a mgbe ọ na-ewulite isiokwu bụ́ “Tụkwasị Ụmụnna Gị A Nwapụtaworo, Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Obi.” Gịnị bụ ‘ite ájá’ ndị ahụ? “Ndị a aghaghị izo aka n’ebe anyị nọ dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè,” ka ọ rịbara ama. Gịnị bụ “akụ̀” ahụ? “Ọ bụ ozi ndị Kraịst anyị,” ka ọ kọwara. (2 Ndị Kọrint 4:1) Gịnịkwa ka a ga-eji akụ̀ a mee? “Akụ̀ Jehova tinyeworo anyị n’aka abụghị nke a ga-ezochi. Ya mere, unu ndị na-aga ịghọ ndị ozi ala ọzọ a hụrụ n’anya, kesaanụ akụ̀ ahụ n’ebe ọ bụla unu na-aga, kụziekwara ọtụtụ ndị ọzọ ụzọ isi kesaa ya.”

Ọ bụ oge ichetaghachi oge ndị gara aga mgbe Albert D. Schroeder batara n’ikpo okwu, n’ihi ọ bụ ya na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead mgbe ọ malitere. “Ọkara Narị Afọ nke Ọzụzụ Ọchịchị Chineke” bụ isiokwu ya. “Jehova maara ụzọ e si enye ọzụzụ dị irè, nke a ka o mewokwara,” ka o kwuru. N’ụzọ dị aṅaa? Nwanna Schroeder zoro aka n’ọzụzụ a natara site n’ụlọ akwụkwọ abụọ e guzobere 50 afọ gara aga​—⁠Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ọ rụtụrụ aka na ngwá ọrụ bara uru n’inye ezi ihe ọmụma abụwo Bible New World Translation. O mesiri ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ obi ike, sị: “Unu pụrụ ịga n’ala ọzọ e kenyere unu ọrụ na-enwe nchekwube dị ukwuu na Society ga na-enye unu ezi ihe ọmụma nke nzube Jehova nile n’ụzọ zuru ezu.”

Milton G. Henschel, onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ndị Karịrị Ndị Mmeri.” Nwanna Henschel weere isiokwu ya site n’isiokwu dịịrị afọ 1943: “Ndị karịrị ndị mmeri site n’onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya.” (Ndị Rom 8:37, King James Version) Ọ bụ isiokwu kwesịrị ekwesị nke dịịrị afọ ahụ, ka ọ kọwara, n’ihi na n’ime Agha Ụwa nke Abụọ, ụmụnna anyị n’ọtụtụ mba na-enwe mkpagbu dị ukwuu. Nwanna Henschel gụpụtara ihe ụfọdụ sitere ná mbipụta Ụlọ Nche nke tụlere isiokwu ahụ dịịrị afọ wee kọwaa, sị: “Klasị mbụ nke Gilead mụrụ isiokwu Ụlọ Nche [January 15, 1943, Bekee] n’ọnwa February, ọ kwadebekwara ha maka ihe dị n’ihu.” Ọtụtụ n’ime ndị gụsịrị akwụkwọ n’ime 50 afọ gara aga anwapụtaworị onwe ha ịbụ ndị mmeri, ka ọ kọwara. Gịnị banyere klasị nke 94? “Nọrọ Jehova nso, nọrọ ịhụnanya ya nso, mmeri gị bụkwa nke e ji n’aka.”

Mgbe okwu ndị e kwuru n’ụtụtụ ahụ gasịrị, onye isi oche kerịtara ekele ndị a natara site n’ala dị iche iche. Mgbe ahụ oge 24 ndị di na nwunye ahụ jiworo oké mmasị na-echere ruru​—⁠nkesa nke satịfiketi ngụsị akwụkwọ. Leenụ, ụmụ akwụkwọ Gilead ahụ abụrụwo ugbu a ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead! Ha sitere mba 5, ma ọrụ e kenyere ha ga-ewega ha n’ala 17, gụnyere Hong Kong, Taiwan, Mozambique, na akụkụ ụfọdụ nke Ọwụwa Anyanwụ Europe.

Mgbe oge nzurutụ ike gasịrị, usoro ihe omume nke ehihie ji Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e mere ka ọ dị mkpirikpi nke Robert L. Butler duziri, malite. Mgbe ahụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ meghachiri ihe ngosi nke ahụmahụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ha nwetara mgbe ha na-agba àmà nso Wallkill, New York. Usoro ihe omume ahụ gosipụtara otu n’ime ihe ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ha wetara ha na Gilead​—⁠ịhụnanya ha miri emi maka ozi ubi.

Mgbe ihe omume ụmụ akwụkwọ ahụ gasịrị, ọtụtụ ndị bịara nọ na-eche ma usoro ihe omume ahụ ọ̀ ga-enwe ihe pụrụ iche iji cheta 50 afọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead. E mechughị ha ihu!​—⁠Lee igbe sonụ, “Ịtụleghachi 50 Afọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead.”

Iri afọ ise gara aga, Nwanna Knorr gosipụtara na ya bụ nwoke nke okwukwe na ọhụụ. E gosipụtara obi ike ya na Ụlọ Akwụkwọ Gilead ga-enwe ihe ịga nke ọma n’okwu mmepe ọ gwara klasị mbụ, mgbe o kwuru, sị: “Anyị kwenyere na, dị ka aha ya si dị, ‘obo ihe àmà’ ga-esi ebe a gaa n’akụkụ nile nke ụwa nakwa na àmà dị otú ahụ ga-eguzo dị ka ihe ncheta nye ebube Chineke nke a na-apụghị ibibi ebibi. Unu dị ka ndị ozi a họpụtara ahọpụta ga-etinye ntụkwasị obi unu zuru ezu n’Onye Kachasị Elu, na-amara na ọ ga-eduzi ma tụziere unu ụzọ n’oge ọ bụla nke mkpa, unu ga-amarakwa na ọ bụkwa Chineke nke ngọzi.”a

Mgbe 50 afọ gasịrị, Ụlọ Akwụkwọ Gilead ka na-esiwanye ike! Ndị gụsịrị akwụkwọ na klasị nke 94 nwere ugbu a ihe ùgwù nke isonyere ihe karịrị 6,500 ndị ọzọ gụsịrị akwụkwọ bụ́ ndị bu ha ụzọ. Ka ha tinye ntụkwasị obi ha zuru ezu n’Onye Kachasị Elu ka ha na-eme òkè ha n’ikpokọta “obo ihe àmà” nke ga-eguzo dị ka ihe àmà nye otuto Jehova Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Na Hibru okwu ahụ bụ́ “Gilead” pụtara “Obo Ihe Àmà.”​—⁠Jenesis 31:​47, 48.

[Igbe dị na peeji nke 25]

Ihe Banyere Klasị Ahụ

Ngụkọta ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 5

Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 17

Nkezi afọ ndụ: 32

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 15.3

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 9.6

[Igbe dị na peeji nke 26, 27]

ỊTỤLEGHACHI 50 AFỌ NKE ỤLỌ AKWỤKWỌ GILEAD

Olee ụzọ dị mma isi leghachi anya n’akụkọ ihe mere eme nke Gilead karịa site n’ahụmahụ dị iche iche nke ndị nọrọ na ya​—⁠ndị mbụ gụsịrị akwụkwọ na ya, ndị nkụzị ya, na ndị ọzọ nyere aka ịhazi ya? Ndị na-ege ntị nwere obi ụtọ ka ha gere ntị n’akụkụ ahụ bụ́ “Ịtụleghachi 50 Afọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead,” nke Theodore Jaracz duziri.

Olee ọnọdụ ndị dugara n’ihiwe ụlọ akwụkwọ ahụ? Nwanna Schroeder kọwara na e nyere ya na ndị nkụzi abụọ ndị ọzọ nanị ọnwa anọ iji hazie ụlọ akwụkwọ ahụ. “Ma mgbe ọ na-eru Monday, February 1, 1943, anyị dị njikere ịrara ya nye.”

Gịnị ka ọ dị ka ya nye ndị ozi ala ọzọ mbụ e zipụrụ? Nwanna Henschel na-echeta, sị: “Anyị mere ka ngalaba Society na-ahụ maka izipụ ihe kwakọnye ngwongwo nile ha chọrọ iburu n’igbe. Mgbe igbe ndị ahụ rutere, ha ji nlezianya mepee ha ma were ngwongwo ha. Ma ha jiri igbe ndị ahụ rụọ arịa ụlọ.” E mesịa, ka ọ rịbara ama, Society mere ndokwa maka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ndị dị mma.

Ọzọ n’usoro ihe omume ahụ, ụfọdụ ndị gụsịrị akwụkwọ na klasị ndị mbụ nke Gilead bụ ndị bụ ugbu a ndị òtù ezinụlọ Betel na U.S. kerịtara ncheta ha, mmetụta ha, na ahụmahụ ndị ha nwere. Okwu ndị ha kwuru n’ezie metụrụ ndị nile bịaranụ n’obi.

“Mgbe m natasịrị ọkpụkpọ òkù ịbịa klasị mbụ, m nụrụ na mama m na-arịa ọrịa cancer. Ma ebe ọ sụworo ụzọ malite mgbe ọ gbara afọ 16 gaa n’ihu, ọ gwasịrị m ike ka m nara ọkpụkpọ òkù ahụ. Ya mere site n’ọnọdụ obi gwara ọgwa na ịtụkwasị Jehova obi, m gara South Lansing. Ọzụzụ Gilead ahụ masịrị m n’ụzọ nile, enwekwara m ekele miri emi maka ya. Nne m gasịrị ozi elu ala ya n’oge na-adịghị anya mgbe m gụsịrị akwụkwọ.”​—⁠Charlotte Schroeder, o jere ozi na Mexico na El Salvador.

“Ebe Jehova lekọtaworo m n’akụkụ ụwa ebe m nọ, echere m na ebe ọ bụla m jere ka bụkwa ụwa ya, ọ ga-elekọtakwa m. Ya mere enwere m nnọọ obi ụtọ ịnakwere ịkpọ òkù ahụ a kpọrọ m na klasị mbụ.”​—⁠Julia Wildman, o jere ozi na Mexico na El Salvador.

“Ọ bụ ihe dị ebube! Anyị pụrụ ikwu okwu n’ọnụ ụzọ ọ bụla. N’ọnwa mbụ, etinyere m 107 akwụkwọ, duziekwa ọmụmụ Bible 19. N’ọnwa nke abụọ eduziri m 28 ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, e nwere ihe ndị na-aghaghị ịmara anyị ahụ​—⁠okpomọkụ, ikuku mmiri mmiri, chinchi. Ma ọ bụ ihe ùgwù dị ebube ịnọ n’ebe ahụ. Ọ bụ ihe m ga-eji akpọrọ ihe mgbe nile.”​—⁠Mary Adams, klasị nke abụọ, banyere ọrụ e kenyere ya na Cuba.

“Ọnọdụ ihu igwe bụ otu n’ime oké ihe mgbochi ndị anyị ga-eche ihu n’Alaska. N’ebe ugwu ọ na-ajụbiga oyi ókè, ebe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ na-agbada ruo 60 degree Fahrenheit mgbe mmiri kpụkọsịworo na ọbụna jụọ oyi karị. A na-eru ime obodo ndị India na obodo ndị dị nta dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Alaska site n’ụgbọ mmiri ma ọ bụ ụgbọ elu.”​—⁠John Errichetti, klasị nke atọ.

“Nye m, Gilead bụ ọkpụkpọ òkù sitere n’aka Jehova site ná nzukọ ya nke elu ụwa iji gbaa anyị ume n’ụzọ ime mmụọ ma gosi anyị ụzọ ndụ dị ebube.”​—⁠Mildred Barr, klasị nke 11, o jere ozi na Ireland.

Ajụjụ ọnụ ndị na-enye obi ụtọ karị sochiri​—⁠Lucille Henschel (klasị nke 14, o jere ozi na Venezuela), Margareta Klein (klasị nke 20, o jere ozi na Bolivia), Lucille Coultrup (klasị nke 24, o jere ozi na Peru), Lorraine Wallen (klasị nke 27, o jere ozi na Brazil), William na Sandra Malenfant (klasị nke 34, ha jere ozi na Morocco), Gerrit Lösch (klasị nke 41, o jere ozi n’Austria), na David Splane (klasị nke 42, o jere ozi na Senegal).

Gịnị banyere ụmụnna ndị jere ozi dị ka ndị nkụzi? A gbakwara ọtụtụ n’ime ha ajụjụ ọnụ​—⁠Russell Kurzen, Karl Adams, Harold Jackson, Fred Rusk, Harry Peloyan, Jack Redford, na Ulysses Glass. Ha kwuru okwu n’ihe ùgwù ha dị iche iche, na-akọwa ụzọ o siworo metụta ha ruo taa.

Lloyd Barry, onye jere ozi na Japan, nyere akaebe na-akpali akpali n’ịdị irè nke ndị ozi ala ọzọ a zụrụ na Gilead. Na 1949, mgbe e zigara ndị ozi ala ọzọ 15 n’ebe ahụ, e nwere ihe na-erughị ndị nkwusa 10 na Japan nile. Ma mgbe 44 afọ gasịrị, e nwere ihe ruru 175,000 ndị nkwusa Alaeze n’ala ahụ! Robert Wallen kwuziri banyere ihe ịga nke ọma pụtara ìhè nke ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nweworo n’inyere ndị mmadụ aka ịbata n’eziokwu, gụnyere otu nwanna nwanyị bụ onye ozi ala ọzọ nke nọworo na Panama ruo 45 afọ, bụ́ onye nyewokwaara 125 mmadụ aka ruo ime nraranye na baptism.

E ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ihe omume ahụ dum mgbe a kpọrọ ndị nile bịaranụ bụ́ ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead òkù ịgbagote n’elu ikpo okwu. Ọ bụ n’ezie oge na-emetụ n’obi. Ụmụnna ndị ikom na ndị inyom nọgidere na-enugota​—⁠89 n’ezinụlọ Betel gụnyere ndị gụsịburu akwụkwọ bụ́ ndị bịara abịa​—⁠kwụ n’ahịrị si n’ebe ndị na-ege ntị nọ pụta wee rịgoro n’elu ikpo okwu. Ụmụnna jeworo ozi dị ka ndị nkụzi n’afọ ndị gafeworonụ sonyeere ha, ndị nke klasị nke 94 wee sonye​—⁠ihe dị ka 160 mmadụ ná ngụkọta!

“Ọrụ Ụlọ Akwụkwọ Gilead n’ịzụ ndị ozi ala ọzọ maka mba ndị ọzọ ò nwewo ihe ịga nke ọma pụtara ìhè?” ka Nwanna Jaracz jụrụ. “Ihe àmà nke 50 afọ gara aga bụ ee na-ada oké ụda!”

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị na-agụsị akwụkwọ na klasị nke 94 nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) De La Garza, C.; Borg, E.; Arriaga, E.; Chooh, E.; Purves, D.; Fosberry, A.; Delgado, A.; Drescher, L. (2) Scott, V.; Fridlund, L.; Kettula, S.; Copeland, D.; Arriaga, J.; Thidé, J.; Olsson, E.; Widegren, S. (3) Delgado, F.; Keegan, S.; Leinonen, A.; Finnigan, E.; Fosberry, F.; Halbrook, J.; Berglund, A.; Jones, P. (4) Watson, B.; Frias, C.; Chooh, B.; Halbrook, J.; Purves, J.; Finnigan, S.; Jones, A.; Cuccia, M. (5) Scott, G.; Copeland, D.; Drescher, B.; De La Garza, R.; Leinonen, I.; Keegan, D.; Watson, T.; Kettula, M. (6) Widegren, J.; Borg, S.; Cuccia, L.; Berglund, A.; Olsson, B.; Frias, J.; Fridlund, T.; Thidé, P.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya