Ndị E Nyere Ọzụzụ na Gilead Amalite Ụzọ Ndụ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
“LEE nnọọ ihe omume obi ụtọ nke a bụ, bụ́ ememe ngụsị akwụkwọ klasị nke 90 nke Gilead!” Onye isi oche, bụ́ Karl F. Klein, onye so n’Òtù Na-achị Isi, ji okwu ndị a malite usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ. N’ichetaghachi mgbe ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead ahụ malitere, o kwukwara, sị: “Ònye gaara echeworị, laa azụ na 1943, mgbe klasị mbụ nke Gilead gụsịrị akwụkwọ na mgbe 48 afọ gasịrị, na anyị ka ga na-ezukọta maka ememe ngụsị akwụkwọ nke klasị ọzọkwa—nke 90?”
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, na March 3, 1991, n’ụbọchị nwere okpomọkụ nke na-eyighị otú ọ na-adị n’oge a na New Jersey, ihe karịrị 4,000 ndị a kpọrọ òkù na ndị so n’ezinụlọ Betel zukọtara n’Ụlọ Mgbakọ Jersey City, nke dị n’ófè nke ọzọ nke osimiri ahụ site na New York City, maka ememe ngụsị akwụkwọ nke ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ndị a. Tupu ha amalite ndụ ha dị ka ndị ozi ala ọzọ, ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ gaje ịnata ndụmọdụ ụfọdụ e ji asị ha gaa nke ọma n’ụbọchị nke a nke ngụsị akwụkwọ ha.
E ji abụ meghee usoro ihe omume ahụ. Mgbe e mesịrị, o metụrụ ndị nile bịara n’ebe ahụ n’obi n’ụzọ dị omimi mgbe Frederick W. Franz, bụ́ onye isi oche Watchtower Bible School of Gilead ahụ gbaworo 97 afọ, kpere ekpere mmeghe. Mgbe ahụ, mgbe onye isi oche kwusịrị okwu mmeghe, ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ—tinyere ndị nile bịaranụ—ji mmasị gee ntị n’usoro isiokwu dị iche iche dị mkpirikpi, ndị na-enye aka.
Max H. Larson nke so na Kọmitii Ebe Obibi Akwụkwọ bu ụzọ kwuo okwu, n’isiokwu bụ “Ndị Ha Na Jehova Na-arụkọ Ọrụ.” Mgbe ọ dọrọsịrị uche gaa n’ụgbọ nchebe ahụ nke Noa na ezinụlọ ya wuru, o kwuru, sị: ‘Taa, Jehova na-achịkọta ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ọtụtụ nde mmadụ, o zubekwara iduru nnukwute ezinụlọ nke a gabiga mkpagbu ukwu ahụ.’ Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, ọ bụ site n’ụgbọ ahụ nke oge a—paradaịs ime mmụọ! O chetaara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị. ‘Unu gaje ịga n’akụkụ ụwa dị iche iche, ebe unu ga-abụ ndị ha na Jehova na-arụkọ ọrụ n’iwu ụgbọ ahụ nke oge a.’ N’ịkwadebe ha maka ihe na-eche ha n’ihu, ọ sịrị: ‘Ọ gaje ịchọ ọrụ n’aka unu. Ọ gaje ịchọ inwe ndidi. Unu gaje izute ihe mgbochi dị iche iche. Ọ bụ n’ebe a ka nkà ndị ọzụzụ unu nyeworo unu gaje ịdị unu mkpa.’
Daniel Sydlik, onye so n’Òtù Na-achị Isi ka jesịrị n’oge na-adịghị anya ileta ndị nọworo ogologo oge n’ije ozi ala ọzọ na Japan na Costa Rica. N’iwulite isiokwu ahụ bụ “Nke Unu Bụ Ụzọ Ndụ Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ,” o sooro ha kerịta ụfọdụ n’ime aro ndị na-enye aka ndị o nwetaworo site n’ọnụ ndị ozi ala ọzọ ndị a, bụ́ ndị nweworo ihe ịga nke ọma. Ọ kọwara na otu nwanna nwanyị kọọrọ ya otu ndụmọdụ nke nne ya nyeworo ya rịị, sị: ‘Nwee ịhụnanya maka ije ozi ubi. Mee ka gị na ndị mmadụ bụrụ enyi. Soro ndị ọzọ kerịta ndụ gị, ọ ga-ewetakwara gị obi ụtọ.’ Nwanna nwanyị ọzọ sịrị: ‘N’ime ọtụtụ afọ ndị gaworo aga, anyị aghọtawo na ọ bụrụ na anyị atụghị anya ihe hiri nne gabiga ókè site n’aka ndị ọzọ, anyị agaghị na-abụkebe ndị e mechuru ihu. Omume obi ebere ọ bụla nke na-egosi iche ezi echiche nke e mesoro anyị na-abụrụ anyị nnọọ oké ihe.’ Ihe ịrụ ụka adịghị ya na itinye aro ndị dị otú a na-enye aka n’ọrụ ga-enyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka ịbụ ndị ozi ala ọzọ nwere ihe ịga nke ọma n’onwe ha.
Ndị Tesalọnaịka nke Mbụ 5:14 na-asị, “Nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.” Leon Weaver nke so na Kọmitii Ngalaba Ije Ozi kọwara ihe odide nke a mgbe ọ na-ekwu okwu n’isiokwu ahụ bụ “Nwee Ndidi n’Ọrụ Gị Nile.” Òle ndị ka a gụnyere ná “mmadụ nile” ndị anyị na-aghaghị inwe ndidi n’ebe ha nọ? Onye ọkà okwu ahụ zara, sị: ‘Ndị unu gaje izute n’ozi ubi. Ụmụnna nwoke na ndị nwanyị ndị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ unu. Ndị ozi ala ọzọ ibe unu. Ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ. Di ma ọ bụ nwunye gị. Onwe gị.’ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee ndidi n’ọrụ anyị nile? Onye ọkà okwu ahụ kọwara, sị, ‘Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị, inwe ndidi na-ebelata ahụ mgbakasị na nchekasị. Inwe ndidi na-eweta udo. Inwe ndidi na-eme ka olileanya na-adị ndụ. Inwe ndidi na-enyere anyị aka ijigide ọṅụ anyị n’ije ozi.’
Albert D. Schroeder, onye so n’Òtù Na-achị Isi, onye bụkwa onye mbụ na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ onye ọzọ kwuru okwu. N’ikwu okwu n’isiokwu ahụ bụ “Nọgidenụ Na-agbaso Ihe Nlereanya Unu—Bụ́ Jisọs Kraịst,” o mere ka okwu ya dabere ná Ndị Filipaị isi 2. “Nweenụ uche a [“burunụ nke a n’uche,” nkọwa ala ala peji] n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs,” ka amaokwu 5 na-ekwu. Onye ọkà okwu ahụ kọwara, sị, ‘Nke a na-egosi na ọ dị mkpa ka anyị nwee echiche guzoziri eguzozi, ọbụna dị ka Jisọs n’onwe ya nwere echiche guzoziri eguzozi.’ N’ịmalite n’amaokwu 6, ọ gara n’ihu ime nkọwa na-akpali mmasị, na-egosi na Pọl bu ụzọ nye ihe àmà nke na-egosi na Jisọs nwere echiche guzoziri eguzozi (amaokwu 6-8), wee gaa n’ihu isetịpụ ụzọ ndị Jehova si nyeghachi ya ụgwọ ọrụ n’ihi ụzọ nrubeisi ọ gbasoro (amaokwu 9-11). O kwubiri, sị, ‘Nke a bụ otu akụkụ nke ihe ùgwù unu, ịnọ na-ekwusa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enyere ndị ọzọ aka inwe otu ụdị uche ahụ nke o nwere.’
Okwu ikpeazụ dị aṅaa ka ndị nkụzị ụlọ akwụkwọ ahụ ga-agwa ụmụ akwụkwọ ha? Jack D. Redford bu ụzọ kwuo okwu n’isiokwu ahụ bụ “Ike Iche Echiche Ga-echebe Unu.” (Ilu 2:10, 11) ‘Ka ị na-apụ ugbu a,’ ka ọ kọwara, ‘obi ụtọ gị agajeghị ịdabere n’onye ị bụ ma ọ bụ n’ihe i nwere ma ọ bụ ọbụna n’eziokwu ahụ nke bụ na ị bụ onye a zụrụ na Gilead. Obi ụtọ gị ga-adabere n’otú i si eche echiche. Ọ bụrụ na i jiri ike iche echiche gị mee ihe, tinyekwa ihe ọmụma i nwere n’ọrụ, ị ga-enwe obi ụtọ.’ N’igosi ịdị mkpa nke ike iche echiche, ọ kọwara, sị: ‘Ọdịiche dị n’etiti ime ezi ihe na ime ihe na-ezighị ezi bụ iche echiche. Ihe ị na-eche na-ekpebi ihe ị na-eme.’ J. D. Redford ji okwu agbamume ndị a ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ mechie okwu ya: ‘E nwere ọtụtụ ndị nwere ọgụgụ isi nọ n’ụwa ndị na-amaghị otú e si eche echiche, e nwekwara ndị na-enweghị ọgụgụ isi nke ukwuu ndị ghọworo ndị nwere nkà n’iche echiche. Ya mere, mụta nkà ahụ. Kpebisie ike iji uche gị mee ihe. Jiri ihe ọmụma gị mee ihe. Nagide ihe isi ike nile. Mee ka gị na ndị mmadụ dịrị ná mma. Doo onwe gị n’okpuru ndị na-achị isi. Rụpụta ihe n’ọrụ gị. Nọgidesie ike n’ọrụ e kenyere gị.’
Ulysses V. Glass, bụ́ onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, họọrọ isiokwu bụ “Jehova Na-akwado Aka Anyị,” nke dabeere n’Abụ Ọma 37:23, 24. Ọ sịrị, ‘M ghaghị ịja klasị nke a mma ná mmasị ha nwere n’ịmụ ihe.’ O chetaghachiiri ha ụfọdụ n’ime enyemaka ndị Jehova nyeworo iji kwadoo ha—Okwu Chineke, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche n’okpuru nduzi nke Jisọs n’inye nkọwa na nghọta nke Akwụkwọ nsọ, akwụkwọ dị iche iche e bipụtaworo, nzukọ dị iche iche, na mgbakọ dị iche iche. ‘Enyemaka ndị unu jiworo mee ihe n’ihe ọmụmụ unu,’ ka ọ gara n’ihu ikwu, ‘yiri mkpanaka na mkpara ime mmụọ. Ha dị anyị mkpa iji kwadoo anyị n’ụzọ ime mmụọ, ha na-emekwa ka anyị nwee ike iji nkwuwa okwu na-ekwu okwu n’ịgwa ndị ọzọ Okwu Chineke.’ Ná mmechi, ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ okwu agbamume ndị a: ‘Ọ bụrụ na obi unu jupụtara n’ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ndị nwere obi eziokwu ga-azaghachi. Unu ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ije ozi unu, unu ga-amatakwa na Jehova na-akwado aka unu.’
Onye ikpeazụ kwuru okwu n’usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ bụ Carey W. Barber onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye họọrọ isiokwu bụ “Sinụ n’Ọnụ Ụzọ ahụ Dị Warara Baa.” N’inye nkọwa na Luk 13:23, 24, o kwuru, sị: ‘Ọtụtụ ndị na-achọ inweta ngọzi ndị na-abịa ná ndụ, ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole dị njikere ịdọgbu onwe ha n’ọrụ ruo n’ókè zuru ezu iji nweta ha.’ Gịnị banyere anyị? ‘Ọ dị mma ka anyị jụọ onwe anyị, sị, “Gịnị ka ihe onyinyo nke a nke ọnụ ụzọ dị warara pụtara nye m n’onwe m?”’ Ndị na-esighị n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara baa enweghị ike ime otú ahụ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme, kama n’ihi na ha adịghị njikere ịdọgbu onwe ha n’ọrụ. ‘Jehova adịghị achọ n’aka anyị ihe karịrị ike anyị,’ ka onye ọkà okwu ahụ kọwara. ‘Site n’enyemaka Jehova,’ ka o kwubiri, ‘ka anyị nile jiri ọṅụ dọgbuo onwe anyị n’ọrụ n’ókè zuru ezu isi n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ndụ ebighị ebi, udo, ọṅụ, na obi ụtọ, iji wetara Jehova otuto ebighị ebi!’
Mgbe e kwusịrị okwu ndị a, onye isi oche ziruru ozi ekele ndị a natara site n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ugbu a, oge eruwo ka ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ nata akwụkwọ diplọma ha. Ụmụ akwụkwọ ahụ esitewo ná mba isii dị iche iche bịa—Canada, Finland, Germany, Great Britain, Switzerland, na United States. Ma, ebe e kenyere ha ọrụ ga-eduru ha jee ná mba ndị dị ka Argentina, Benin, Bolivia, Dominican Republic, Papua New Guinea, Peru, St. Lucia, na Taiwan. Oleekwa mmetụta ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ nwere n’ụbọchị ngụsi akwụkwọ ha? N’otu akwụkwọ ozi na-emetụ n’obi nke e zijeere Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel, ha kwuru n’otu akụkụ, sị: “Anyị nwere obi ike na Òtù Na-achị Isi, ezinụlọ Betel, na nzukọ Jehova dum na-akwado anyị. Ka anyị na-eche ọnwụnwa ndị na-abịanụ ihu, nkwado ahụ bụ ihe anyị ga-eji kpọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa. Anyị nwere ekele maka nke ahụ n’ezie.”
Mgbe e nwesịrị nkwụsị nwa oge, usoro ihe omume nke ehihie malitere site n’Ọmụmụ Ụlọ Nche e mere ka ọ dị mkpirikpi, nke Karl A. Adams duziri. Mgbe nke ahụ gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ mere ihe ngosi nke ahụmahụ ndị ha nwetara n’ezie banyere irute n’obi ụmụ mmadụ mgbe ha na-akụzi Okwu Chineke. N’ikpeazụ, ndị nile bịaranụ, gụnyere ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ na klasị nke 90, kiriri otu ihe nkiri nke bịara n’ezi oge, nke isiokwu ya bụ Zere Nchekasị Ndị Dị ná Ndụ, bụ́ nke ụmụnna ndị bi n’ebe ahụ mere.
Onye isi oche, bụ́ Karl Klein, kwuchitere ọnụ mmadụ nile mgbe o kwuru n’okwu mmechi ya, sị: “N’ezie, ọ bụworo anyị ezi ihe ịnọ n’ebe a n’ụbọchị nke atọ nke a nke March 1991!” Mgbe ahụ, ọmarịcha usoro ihe omume ahụ mechiri site n’abụ mmechi, nke ekpere mmechi sochiri, bụ́ nke Harold J. Dies kpere.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ihe Banyere Klasị ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 10
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ dum: 24
Nkezi afọ ndụ: 31.2
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 15
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 11
[Foto dị na peeji nke 26]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 90 nke Watchtower Bible School of Gilead
N’ihe ndepụta dị n’okpuru, a gụrụ ahịrị ndị ahụ site n’ihu ruo n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla. (1) Miller, M.; Helenius, S.; Marsh, L.; Kleeman, A.; Loosli, Y.; Nizan, H. (2) Skogen, R.; Nutter, D.; Noack, E.; Diehl, L.; Hair, J. (3) Marsh, C.; Helenius, H.; Loosli, M.; Danio, A.; Danio, A.; Nizan, D. (4) Miller, L.; Noack, J.; Hair, L.; Kleeman, W.; Skogen, D.; Diehl, S.; Nutter, W.