Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Anara Onyinye nke Ije Ozi Ala Ọzọ
NA MARCH 1, 1992, 22 ndị so na klasị nke 92 na-agụsị akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead naara otu onyinye—onyinye nke ije ozi ala ọzọ. Mgbe ọ na-agwa klasị ahụ okwu, Lloyd Barry nke so n’Òtù Na-achị Isi kwuru, sị: “Ka unu jiri ọṅụ nara onyinye ahụ mara mma, ka unu jirikwa ya wetara ndị ọzọ ọṅụ.”
Ihe dị ka 4,662 ndị a kpọrọ òkù na ndị sọ n’ezinụlọ Betel zukọtara n’Ụlọ Mgbakọ Jersey City, na New Jersey, maka usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ. E jikwa usoro nzipụ ozi nke ígwè telifonu mee ka 970 ndị ọzọ nọ n’ụlọ ọrụ New York nke Watchtower Society dị na Brooklyn, Wallkill, na Patterson nụrụ ihe omume ahụ. Mmadụ nile gere ntị nke ọma ka a na-enye ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ndụmọdụ ikpeazụ ndị ga-enyere ha aka iwere onyinye nke ije ozi ala ọzọ n’ihe dị oké ọnụ ahịa na iji ya na-eme ihe n’ụzọ amamihe.
Usoro ihe omume ahụ emeghewo site n’ịbụ abụ nke 155, bụ́ “‘Nabatanụ Ibe Unu’!” n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, a kpaliri mmadụ nile ka Frederick W. Franz, bụ́ onye isi oche gbara 98 afọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, kpere ekpere na-emetụ n’obi. Mgbe ahụ, onye isi oche, bụ́ Carey Barber nke so n’Òtù Na-achị Isi, nabatara mmadụ nile n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ wee sị: “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị ozi ala ọzọ nke Gilead karịa ka e nwere n’oge a.” Mgbe o kwusịrị okwu ya, ọ kpọlitere usoro okwu ndị dị mkpirikpi, na-enyekwa aka.
Curtis Johnson nke so na Kọmitii Ebe Obibi Betel bụ onye mbụ kwuru okwu, na-ewulite isiokwu ahụ bụ́ “Na-elekọta Ubi Gị Anya nke Ọma.” Nwanna Johnson kwuru na mgbe ndị ozi ala ọzọ ndị a ruru n’ebe e kenyere ha ọrụ, onye ọ bụla n’ime ha ga-enwe ubi ime mmụọ nke ọ ga-akọ ihe na ya. (1 Ndị Kọrint 3:9) Ndị Jehova n’ụwa nile bụ ubi ime mmụọ na-epupụta ezi omume na otuto n’ihu mba nile. (Aịsaịa 61:11) ‘Ụzọ i si elekọta ubi ime mmụọ gị n’ọdịnihu,’ ka ọkà okwu ahụ mere ka ọ pụta ìhè, ‘ga-emetụta inwe ihe ịga nke ọma nke ọrụ ozi ala ọzọ gị n’ụzọ dị mkpa.’ Gịnị ga-enyere ha aka ilekọta ubi ime mmụọ ha nke ọma? ‘Jehova pụrụ ịbụ mgbidi nke nchebe na gburugburu ubi ime mmụọ gị. Ọ bụrụ na i kpebisiri ike ịkọpụta ọrụ ziri ezi, nọrọ ya nso n’ekpere, mgbe ahụkwa na-arụ ọrụ kwekọrọ n’ekpere gị.’
Mgbe ahụ, Lloyd Barry kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ́ “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Onyenwe Anyị Mgbe Nile.” (Ndị Filipaị 4:4) N’inweta ihe ọ ga-ekwu site n’ihe karịrị 25 afọ nke ahụmahụ ije ozi ala ọzọ o nwetara na Japan, o nwere aro ụfọdụ a pụrụ itinye n’ọrụ iji nyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka irite uru n’onyinye nke ije ozi ala ọzọ. O kwuru, sị: ‘Ị ga-achọpụta na ọṅụ nke ị na-enweta n’ozi Chineke na-enyere gị aka imeri ọtụtụ n’ime ihe isi ike nakwa ma eleghị anya ụfọdụ n’ime nsogbu anụ ahụ ndị ị na-ezute.’ (Ilu 17:22) O chetaara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ na ha pụrụ izute ọnọdụ ndị dị iche pụọ n’ihe ndị ha mawooro. Ha pụrụ ịmụta asụsụ ọhụrụ. ‘Ị ga-arụsi ọrụ ike iji mụta asụsụ ahụ. Ma mgbe i nwere ike isoro ndị mmadụ na-ekwurịta okwu n’asụsụ nke ha, nke a kwa ga-ewetakwuru gị ọṅụ.’
N’iwulite isiokwu ahụ bụ́ “Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ Ahụ,” Eldor Timm nke so na Kọmitii Ebe Obibi Akwụkwọ bụ onye ọzọ kwuru okwu. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ ahụ? Ndụ ebighị ebi! Iji nweta ya anyị aghaghị ilekwasị anya anyị na ya. Onye ọkà okwu ahụ tụlere ụfọdụ n’ime myirịta na ọdịiche dị n’etiti ndị Kraịst na-agba ọsọ ndụ na ndị ọsọ so n’ịsọ mpi ọsọ na narị afọ mbụ. Dị ka ndị ọsọ, ndị Kraịst aghaghị inwe ọzụzụ siri ike, na-edebe ụkpụrụ, na-eyipụsị ihe nile dị ha arọ n’ahụ. Ma n’adịghị ka ndị na-agba ọsọ nkịtị, ndị Kraịst na-agba ọsọ ná ndụ ha nile, na-achọkwa ụgwọ ọrụ nke bụ ndụ ebighị ebi. Kama inwe nanị otu onye mmeri, mmadụ nile gbara ọsọ ndụ ahụ ruo ná ngwụsị ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ. Nwanna Timm kwubiri okwu ya, sị: ‘Iji nweta ụgwọ ọrụ nke ndụ, anyị na Jehova aghaghị ịnọ n’udo, bụ́ Onye Na-enye ụgwọ ọrụ ahụ. Ijikwa soro Jehova nọrọ n’udo, anyị na ụmụnna anyị aghaghị ịnọ n’udo.’
Milton Henschel nke so n’Òtù Na-achị Isi bụ onye ọzọ kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Site ná Nkasi Obi nke Akwụkwọ Nsọ, Anyị Na-enwe Olileanya.” (Ndị Rom 15:4) ‘Kemgbe ọnwa ise gara aga,’ ka ọkà okwu ahụ malite ikwu, ‘unu anọwo na-agụ Bible. E wulitewo oké ịdị nso. Unu nwere olileanya siri ike. Ka unu na-aga n’ebe e kenyere unu ọrụ, biko chetanụ ihe mere olileanya unu ji sie oké ike. Ọ bụ n’ihi na unu anọwo Akwụkwọ nsọ nso.’ Iji gosi otu ihe atụ nke ihe ndekọ Bible na-akpali olileanya, ọkà okwu ahụ zoro aka ná Ndị Ikpe isi 6 ruo 8, bụ́ nke kọrọ banyere otú e si nye Gideọn ọrụ ịgbapụta ndị Israel ná mmegbu nke ndị Midian. Mgbe ọ tụlesịrị ihe ndekọ ahụ na ihe ọ pụtara nye oge anyị a, o kwuru, sị: ‘Mgbe i nwere ohere ịnọ Akwụkwọ nsọ nso na iche echiche banyere ihe ndị a, ọ na-enye gị ume ọhụrụ. Obi na-esi gị ike.’
Mmadụ nile nọ na-echere ịnụ ndụmọdụ ikpeazụ ndị nkụzi abụọ bụ isi nke ụlọ akwụkwọ ahụ ga-enye ụmụ akwụkwọ ahụ. Jack Redford bụ onye mbụ kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Na-eme Ihe Ziri Ezi.” O chetaara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị: ‘Na Gilead, e nyere unu ọzụzụ nke ọma n’ihe banyere ihe ziri ezi dị ka Akwụkwọ nsọ si chọọ. Ugbu a unu na-aga n’ọrụ ije ozi ala ọzọ nke bụ ihe ịma aka. Anyị makwaara na ma eleghị anya unu ga-enweta nsogbu ndị siri ike n’ụzọ. N’agbanyeghị nke a, nakwa n’agbanyeghị ihe bụ mmetụta unu, anyị maara na unu pụrụ ime ihe ziri ezi.’ Gịnị ga-enye aka? Na nke mbụ, inwe echiche ziri ezi banyere ndị ọzọ. Ọkà okwu ahụ siri: ‘Atụla anya izu okè site n’aka ezughị okè.’ Inwe echiche ziri ezi banyere ọnọdụ ndị na-eweta ọnwụnwa pụkwara inye aka. ‘Anyị nile na-enwe oge ihe ịga nke ọma na oge ihe isi ike ná ndụ,’ ka o kwuru. ‘Onye ọ bụla pụrụ ime ihe n’oge ihe ịga nke ọma. Ọ bụ ụzọ i si mee ihe n’oge ihe isi ike ga-ekpebi ma ị ga-anọgide n’ozi ala ọzọ.’—Jemes 1:2-4.
Onye na-edeba aha ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Ulysses Glass, họọrọ isiokwu ahụ bụ́ “Olileanya Dị Aṅaa Dị n’Ọdịnihu?” N’olu nke onye bụ nna, ọ gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha nwee olileanya dị ndụ. (Ilu 13:12) ‘Ọ pụrụ isi ike ịchọpụta mmalite nke enweghị olileanya,’ ka ọ kọwara. ‘Ọnọdụ dị iche iche pụrụ ime ka anyị na-eche nanị banyere onwe anyị kama iche banyere mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị pụrụ ịda ọrịa ma ọ bụ chee na ndị ọzọ na-emeso anyị omume na-adịghị mma. Ụfọdụ pụrụ inwe ihe onwunwe karịa nke anyị nwere ma ọ bụ ha pụrụ ịrụpụta ihe ka mma n’ije ozi ha, anyị pụkwara inwe ekworo. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka ihe ndị dị otú ahụ bụrụ ihe anyị na-eche mgbe nile, n’oge na-adịghị anya izi ezi nke olileanya Alaeze ga-apụ n’obi nakwa n’uche anyị, anyị pụkwara ọbụna ịkwụsị ịnọgide n’ọsọ nke ndụ.’ Gịnị ka a pụrụ ime? ‘Anyị aghaghị ime ihe ndị ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ga-atụteghachi olileanya anyị. Anyị aghaghị imejupụta uche na obi anyị site ná nkwa ndị e ji aka nke Chineke ma tụkwasị uche anyị zuru ezu n’izi ezi nke Alaeze Chineke. Anyị aghaghịkwa iweghachi nkwurịta okwu anyị na Jehova, n’ihi na nke a ga-eduga n’inwe ọṅụ n’ezie.’
Karl Klein nke so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu ngụsị akwụkwọ ahụ. Isiokwu ya bụ “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Dị Umeala?” Gịnịkwa bụ azịza nke ajụjụ ahụ? “N’ihi na ọ bụ ihe dị mma na ihe ziri ezi ime otú ahụ, ihe amamihe na ịhụnanya dị na ya ime,’ ka ọ kọwara n’okwu mmeghe ya. A kpaliri mmasị nke ndị na-ege ntị mgbe ọ tụlere ihe atụ anọ nke ịdị umeala n’obi nke anyị ga-eme nke ọma iṅomi: (1) Jehova Chineke, bụ́ onye dị umeala n’ezie mgbe ọ na-emeso Abraham na Mosis (Jenesis 18:22-33; Ọnụ Ọgụgụ 14:11-21; Ndị Efesọs 5:1); (2) Jisọs Kraịst, bụ́ onye ‘wedara onwe ya ala, wee bụrụ onye na-aṅa nti ruo n’ọnwụ nke osisi ịta ahụhụ’ (Ndị Filipaị 2:5-8; 1 Pita 2:21); (3) Pọl onyeozi, onye ‘bụ ohu Onyenwe anyị n’obi dị umeala nile’ (Ọrụ 20:18, 19; 1 Ndị Kọrint 11:1); nakwa (4) ‘ndị na-edu ndú n’etiti anyị,’ dị ka onye isi oche mbụ nke Society, bụ́ Nwanna Russell, onye dere n’otu mgbe, sị: “Ọrụ ahụ nke ọ dịworo Onyenwe anyị ụtọ iji onyinye anyị dị ala mee ihe na ya abụchaghị ọrụ a malitere ọhụrụ, kama ọ bụ ọrụ nke ime nhazigharị, mgbanwe, na nkwekọrịta.” (Ndị Hibru 13:7) Nwanna Klein kwupụtara ihe ndị ọzọ dị ike mere a ga-eji dị umeala n’obi. N’ezie, ịṅa ntị na ndụmọdụ nke ịdị umeala n’obi ga-enyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka iji onyinye nke ije ozi ala ọzọ mee ihe n’ụzọ amamihe!
Mgbe e kwusịrị okwu ndị ahụ, onye isi oche gụpụtara ozi ekele a natara site n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ugbu a oge eruwo mgbe ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ga-anata akwụkwọ diplọma ha. Ha sitere ná mba asaa—Canada, Finland, France, Mauritius, Netherlands, Sweden, na United States. Ma ebe e kenyere ha ọrụ ije ozi ala ọzọ wegara ha ná mba 11—Bolivia, Estonia, Grenada, Guatemala, Honduras, Hungary, Mauritius, Peru, Togo, Turkey, na Venezuela.
Mgbe e nwesịrị nkwụsị nwa oge, usoro ihe omume nke ehihie malitere site n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e mere ka ọ dị mkpirikpi nke Joel Adams so ná Ngalaba Kọmitii Ije Ozi duziri. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ kọrọ ụfọdụ ahụmahụ ndị ha nwetaworo n’ozi ubi n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’ikpeazụ, e mere ihe nkiri bụ́ N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Sọpụrụ Ndokwa Ọchịchị Chineke? iji gbaa ndị nile na-ege ntị ume, gụnyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ.
N’ezie, ndị a gụsịrị akwụkwọ gawara n’ebe ọhụrụ e kenyere ha ọrụ, na-eji ndụmọdụ na agbamume ndị ga-enyere ha aka iji onyinye nke ije ozi ala ọzọ mee ihe iji wetara ọ bụghị nanị onwe ha, kamakwa ndị ọzọ, ọṅụ.
[Chaatị dị na peeji nke 22]
Ihe Banyere Klasị Ahụ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 7
Ọnụ ọgụgụ mba e zipụrụ: 11
Ngụkọta ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 22
Nkezi afọ ndụ: 33.4
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.7
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 11.8
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Klasị nke 92 nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Chan Chin Wah, M.; Bouancheaux, N.; Chapman, B.; Östberg, A.; Cole, L.; Jackson, K.; Meerwijk, A. (2) Smith, J.; Wollin, K.; Chapman, R.; Gabour, N.; Chan Chin Wah, J.; Smith, C.; Edvik, L. (3) Bouancheaux, E.; Östberg, S.; Cole, K.; Jackson, R.; Gabour, S.; Edvik, V.; Meerwijk, R.; Wollin, G.