Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na September: Asụsụ nile—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (nke nnukwu, ₦120; nke obere, ₦120). E kwesịrị ime mgbalị iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi. October: Asụsụ nile—Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche. Mee mgbalị pụrụ iche iji tinye ọtụtụ magazin. A pụkwara inyefe ụtụ ná nletaghachi. November: Bekee—New World Translation of the Holy Scriptures na akwụkwọ The Bible—God’s Word or Man’s? Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Asụsụ ndị ọzọ—Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peji nke 21-23 nke Ụlọ Nche, April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.
◼ Ndị nkwusa na-eme atụmatụ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’October kwesịrị itinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enye ndị okenye ohere ime ndokwa ndị dị mkpa maka akwụkwọ na ókèala.
◼ Akwụkwọ Ndị E Nwere Ugbu A:
Bekee: Akwukwọm nke Akukọ Bible; Sing Praises to Jehovah (nke nnukwu); Sing Praises to Jehovah (mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo); mpịakọta Ụlọ Nche nke 1985. Hausa: Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? Igala: Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi (Traktị nke 20); Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kwere? (Traktị nke 14); “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ.” Tiv: Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba: Questions Young People Ask—Answers That Work.
◼ Kaseti Ọhụrụ E Nwere:
Bekee: Kingdom Melodies Album (njikọ nke kaseti asatọ).
◼ N’October 21, a ga-emechi ogige Betel. Ya mere, biko abịala maka ime ngagharị nleta ma ọ bụ iwere akwụkwọ n’ụbọchị a.
◼ Akụkọ Ozi Ubi Kwa Ọnwa: Ná ngwụsị nke ọnwa ọ bụla, e kwesịrị izigara ọfịs akụkọ ozi ubi kwa ọnwa nke ọgbakọ ozugbo, na-eji kaadị S-1 eme ihe. Ọ dị mkpa nke ukwuu ide aha ọgbakọ ahụ na kaadị ahụ na ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ndị nyere akụkọ ozi n’ọnwa ahụ. Ọ bụrụ na e nweghị ihe ọmụma a, kaadị ahụ agaghị abara anyị uru. E kwesịrị ide ọnụ ọgụgụ ozi ubi ndị ọzọ nke ọma: ngụkọta akwụkwọ, akwụkwọ nta na broshuọ, hour, ụtụ, magazin n’otu n’otu, nletaghachi, na ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọzọ, e kwesịrị idenye nọmba ọgbakọ ahụ nke ọma na kaadị ahụ. Nke a ga-eme ka ọ dị mfe karị izighachi kaadị ahụ n’ọgbakọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na mkpa ya ebilite. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na onye isi oche ndị nlekọta na ndị okenye ndị ọzọ enyochaa kaadị ahụ iji jide n’aka na ihe ọmụma nile kwesịrị ekwesị dị na kaadị ahụ, tupu e zigara ya Society.