Igbe Ajụjụ
◼ Nlebara anya dị aṅaa ka ọ dị mkpa inye ngwá ọrụ ndị anyị ji eme ihe n’ọrụ ịgba àmà?
1 N’agbanyeghị na onye nkwusa bu okwu kwesịrị ekwesị nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’uche, o nwere ike ghara ịkwado akwado mgbe a bịara ná ngwá ọrụ ndị o ji eme ihe. Mgbe ọ nọ n’ọnụ ụzọ, e nwere ike o nweghị akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa ahụ, ma ọ bụ magazin, broshuọ na traktị ndị dị n’akpa ozi ọma ya pụrụ ịhịkọsị ahịkọ ma ọ bụ dị njọ n’anya. Ọ pụrụ ịghara inwe ike ịchọta pensụl ma ọ bụ ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ n’ihi na a hazighị akpa ozi ọma ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
2 Ọ dị mkpa iji nlezianya lebara ngwá ọrụ gị anya tupu i kere òkè n’ozi ubi.
3 Ihe ndị dị aṅaa kwesịrị ịdị n’ime akpa ozi ọma a haziri nke ọma? Bible dị mkpa. Tinye ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ. Jide n’aka na i ji mbipụta nke a na-enyefe n’ọnwa ahụ. Mbipụta magazin ndị ọhụrụ tinyekwara traktị na broshuọ dị iche iche dịkwa mkpa. Jiri akwụkwọ Reasoning. Inwe Ozi Alaeze Anyị nke kasị ọhụrụ ga-eme ka ị tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a tụrụ aro ha tupu gị agaa n’ọnụ ụzọ. Mgbe ị na-arụ ọrụ n’ókèala ebe o yikarịrị ka ị ga-ezute ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ, ọ ga-adị mma ka i jiri akwụkwọ nta ahụ bụ́ Good News for All Nations. Inwe otu n’ime mbipụta anyị ndị e mere maka ndị na-eto eto ga-enyere gị aka ịdị njikere ịgwa ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu okwu.
4 Ihe ọ bụla e ji na-eme ihe kwesịrị ịdị n’ọnọdụ dị mma, bụrụkwa nke a haziri n’ụzọ dị mma n’ime akpa gị. Ọ dịghị mkpa na akpa ahụ n’onwe ya ga-abụ nke ọhụrụ, ma o kwesịrị ịdị ọcha na n’ọnọdụ dị mma.
5 Akpa ozi ọma gị bụ akụkụ nke ngwá ọrụ gị maka iji kpọsaa ozi ọma ahụ. Dote ya n’ọnọdụ dị mma.