“Nye Ha Magazin Ọ Bụla Merela Ochie Ma Ọ Bụkwanụ Broshuọ Ọ Bụla Ga-amasị Ha”
N’ọnwa ụfọdụ, a na-agwa anyị ka anyị nye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gbalịa malitere ha ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ anyị ziri ha ozi ọma. A na-agwakwa anyị na ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ ahụ ma kwuo na ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, anyị nwere ike “nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshuọ ọ bụla ga-amasị ha.” Ị̀ ma ihe mere e ji agwa anyị mee otú ahụ?
Broshuọ na magazin ndị merela ochie nwere isiokwu ndị ga-abara ndị mmadụ uru taa. Ihe e dere n’otu n’ime broshuọ ma ọ bụ magazin ndị ahụ nwere ike iru onye nwe ụlọ n’obi. N’ihi ya, i tinyewe akwụkwọ ndị ị chọrọ iji aga ozi ọma n’akpa ozi ọma gị, gbalịa tinye ụfọdụ broshuọ na magazin ndị merela ochie. Ọ bụrụ na i nweghị magazin ndị merela ochie, i nwere ike gaa ebe a na-edewe magazin n’Ụlọ Nzukọ Alaeze were ndị nke dị ebe ahụ. I ruzie na nke onye nwe ụlọ, ya abụrụ na o nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ chọghị ka ị malitere ya ọmụmụ Baịbụl, i nwere ike igosi ya ụfọdụ n’ime magazin na broshuọ ndị ahụ ka ọ họrọ ndị nke masịrị ya. Ọ bụrụ na o nwere nke o weere, gị na ya kwuo mgbe ọzọ ị ga-abịa na nke ya. I nwere ike imecha si otú ahụ mụwara ya Baịbụl.