Nye Ndị Mmadụ Magazin Ochie
Ọ bụrụ na anyị na-atụfu magazin ndị ochie anyị nwere ma ọ bụ na-edewe ha n’ụlọ anyị, o nweghị onye ha ga-abara uru. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-enye ha ndị mmadụ. Ihe mmadụ gụtara na magazin anyị nwere ike ime ka ọ chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-ekwu. O nwekwara ike ime ka o fewe Jehova. (Rom 10:13, 14) Ka anyị kwuo mgbe anyị nwere ike ịna-enye ndị mmadụ magazin ndị a.
Anyị gaa ozi ọma n’ebe a na-anaghị agakarị ozi ọma, anyị nwere ike ịfanyere ndị na-anọghị n’ụlọ magazin n’ọnụ ụzọ otú onye na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya.
Anyị gaa ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị dị ka n’ọdụ ụgbọala ma ọ bụ n’ebe a na-agba mmanụ ụgbọala, anyị nwere ike ịjụ ndị anyị hụrụ ma ha ga-achọ ka anyị nye ha ihe ha ga-agụ. Chịnye ha magazin ochie i ji ka ha jiri aka ha họrọ ndị ha chọrọ ịgụ.
Anyị gaa ebe a na-akpọ fon ma ọ bụ gaa ụlọ ọgwụ ma ọ bụkwanụ ebe ndị ọzọ n’ókèala anyị, anyị nwere ike inye ndị ọzọ bịakwara ebe ahụ magazin ochie ndị anyị ji.
Mgbe ị na-akwado ịga nletaghachi, chee banyere ihe na-amasị onye ị chọrọ ịga na nke ya. Ò nwere ezinụlọ? Ịga ebe dị iche iche ọ̀ na-atọ ya ụtọ? Ọ̀ na-adị na-arụ ọrụ ugbo? Chọta isiokwu ndị ga-amasị ya na magazin ndị ochie i nwere, ị gaa nletaghachi, chịnye ya ha.
Ọ bụrụ na e nwere onye anyị garala nletaghachi na nke ya ugboro ugboro, ma anyị anaghị ahụ ya n’ụlọ, mgbe ọ bụla anyị hụrụ ya, anyị kwesịrị ịchịnye ya magazin niile ọ na-agụbeghị, ka ọ họrọ ndị dị ya mma.