Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 7
IZU NA-AMALITE N’EPREL 7
Abụ nke 15 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 5 ¶9-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 7-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọpụpụ 9:20-35 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Ndị Kraịst Si Ele Ememme Anya—td 43A (Nkeji 5)
Nke 3: Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs—lr isi nke 13 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ. Okwu odeakwụkwọ ga-ekwu gbasara mgbakọ distrikti. Ọ ga-esi n’akwụkwọ ozi e detaara ndị okenye nke Ọktoba 28, 2013.
Nkeji 10: Nabata Ndị Bịaranụ. (Hib. 13:1, 2) Okwu okenye ga-ekwu. Kwuo ndokwa e mere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwuokwa ihe anyị niile nwere ike ime iji nabata ndị nwere mmasị na ndị na-anaghị ejekwa ozi bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mee ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Nke mbụ ga-abụ ebe onye nkwusa na-ekele onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs tupu ihe omume amalite. Ọ ga-abụ onye e nyere akwụkwọ ịkpọ òkù, ya abịa. Nke abụọ bụ mgbe a gbasara. Onye nkwusa ahụ agakwurukwa onye ahụ ka ha abụọ yie oge na ebe ọ ga-achọta ya ka ha kwurịtakwuo ihe gbasara Baịbụl.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo otú ha si mee ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-agwa Ndị Na-achọghị Ịnụ Ozi Ọma.” Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 20 na Ekpere