Ịma Ọkwa
Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Mee na Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma ọ bụ traktị ọ bụla unu nwere ma traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? na ndị ahụ e wepụtara ọhụrụ, ya bụ, Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?, Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?, Gịnị Ga-eme Ka Unu Na-enwe Obi Ụtọ n’Ụlọ Unu?, Ònyedị Na-achị Ụwa A?, Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị?
A ga-echeta ọnwụ Jizọs na Mọnde, Eprel 14, 2014. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-amụ ihe n’ụbọchị Mọnde, unu kwesịrị iyigharị ọmụmụ ihe nke izu ahụ. Ọ bụrụkwa na unu agaghị eyigharịli ọmụmụ ihe unu n’izu ahụ, unu nwere ike ịhapụ ya. Onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ nweziri ike gbubilata ihe omume Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ n’ọnwa Eprel ma webata nke izu ahụ e chetara ọnwụ Jizọs ma ọ bụrụ na ọ gbasara ọgbakọ unu.
Malite n’ọnwa Febụwarị 2014, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ: “A Ga-eme Ka Anyị Kwụsị Ịta Ahụhụ n’Oge Na-adịghị Anya.”