Ọpụpụ
9 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gakwuru Fero, sị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.*+ 2 Ma ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ma ka jichie ha, 3 Jehova ga-ebi anụ ụlọ gị ndị nọ n’ọhịa aka.+ Ọrịa ọjọọ ga-arịa ịnyịnya, jakị, kamel, ìgwè ehi, na ìgwè atụrụ.+ 4 Jehova ga-eme ka e nwee ihe dị iche n’anụ ụlọ ndị Izrel na anụ ụlọ ndị Ijipt. E nweghị ihe ọ bụla bụ́ nke ndị Izrel ga-anwụ.”’”+ 5 Jehova kwukwara oge ihe a ga-eme, sị: “Echi ka Jehova ga-eme ihe a n’ala a.”
6 Jehova mekwara ya n’echi ya. Ụdị anụ ụlọ ọ bụla dị n’Ijipt malitere ịnwụ,+ ma e nweghị anụ ụlọ ọ bụla bụ́ nke ndị Izrel nwụrụnụ. 7 Mgbe Fero jụrụ ajụjụ ihe merenụ, ọ nụrụ na e nweghịdị otu anụ ụlọ ndị Izrel nwụrụnụ. N’agbanyeghị ihe a, obi Fero ka kpọchiri akpọchi, ọ hapụghịkwa ndị Izrel.+
8 Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị: “Sinụ n’ekwú kporo ntụ kpojuo aka unu. Mosis ga-awụlikwa ya elu n’ihu Fero. 9 Ọ ga-aghọ uzuzu n’Ijipt niile, ọ ga-aghọkwa etuto ọjọọ n’ahụ́ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ.”
10 Ha wee si n’ekwú kporo ntụ gaa guzo n’ihu Fero. Mosis wụliri ya elu, ya aghọọ etuto ọjọọ n’ahụ́ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ. 11 Ndị dibịa anwansi ahụ enweghị ike iguzo n’ihu Mosis n’ihi etuto ahụ, n’ihi na etuto ahụ toro ndị dibịa anwansi ahụ, tookwa ndị Ijipt niile.+ 12 Ma Jehova kwere ka obi Fero kpọchie, o geghịkwa ha ntị, otú Jehova gwara Mosis.+
13 Jehova wee sị Mosis: “Bilie n’isi ụtụtụ gaa guzo n’ihu Fero ma sị ya, ‘Jehova bụ́ Chineke ndị Hibru kwuru, sị: “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.* 14 N’ihi na ugbu a, ọ bụ gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo gị ka m ga-ata ahụhụ, ka i wee mara na e nweghị onye dị ka m n’ụwa niile.+ 15 N’ihi na m gaarala eweli aka m kpatara gị na ndị obodo gị ọrịa ọjọọ, ka e wee kpochapụ gị n’ụwa. 16 Ma ihe mere m ji hapụ gị ndụ bụ ka m gosi gị ike m nakwa ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.+ 17 Ị̀ ka na-ebuli onwe gị elu ma ghara ịhapụ ndị m ka ha gawa? 18 Lee, m ga-eme ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé zoo ka mmiri n’ụdị oge a echi. Ọ ga-abụ ụdị nke na-ezotụbeghị n’Ijipt malite n’ụbọchị Ijipt bidoro ịdị ruo ugbu a. 19 N’ihi ya, zie ozi ka a chịlata anụ ụlọ gị niile na ihe gị niile ma kpọlata ndị gị niile nọ n’ọhịa. Akụ́ mmiri ígwé ga-adagbu mmadụ ọ bụla na anụmanụ ọ bụla a na-akpọbataghị n’ụlọ.”’”
20 Onye ọ bụla n’ime ndị na-ejere Fero ozi, bụ́ onye ihe Jehova kwuru tụrụ egwu, kpọbatara ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ime ụlọ ozugbo. 21 Ma onye ọ bụla na-ejighị ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe hapụrụ ndị na-ejere ya ozi na anụ ụlọ ya n’ọhịa.
22 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Welie aka gị chee n’eluigwe, ka akụ́ mmiri ígwé daa n’Ijipt niile,+ dakwasị mmadụ na anụmanụ na ahịhịa ndụ niile dị n’ubi n’ala Ijipt.”+ 23 Mosis weliri mkpara ya chee n’eluigwe, Jehova wee mee ka égbè eluigwe na-agba nakwa ka akụ́ mmiri ígwé na-ada, meekwa ka ọkụ* na-ada n’ala. Jehova nọkwa na-eme ka akụ́ mmiri ígwé na-ezo ka mmiri n’Ijipt. 24 Ka akụ́ mmiri ígwé nọ na-ezo, ọkụ nọkwa na-enwu. Ọ nọ na-ezosi ike. E nwetụbeghị nke dị ka ya n’Ijipt, malite mgbe Ijipt ghọrọ mba.+ 25 Akụ́ mmiri ígwé ahụ dagburu ihe niile dị n’ubi n’ala Ijipt niile, ma mmadụ ma anụmanụ. O bibikwara ahịhịa ndụ niile, dajisie osisi niile dị n’ọhịa.+ 26 Ọ bụ naanị na Goshen, bụ́ ebe ndị Izrel bi, ka akụ́ mmiri ígwé na-adaghị.+
27 Fero wee zigara Mosis na Erọn ozi, sị ha: “Emehiela m na nke ugbu a. Jehova bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụnwa na ndị obodo m mejọrọ. 28 Rịọnụ Jehova arịrịọ ka égbè eluigwe ya na akụ́ mmiri ígwé ya kwụsị. M ga-ahapụkwa unu ka unu gawa. Unu agaghịzi anọ ebe a.” 29 Mosis wee sị ya: “Ozugbo m si n’obodo a pụọ, m ga-agbasa aka m n’ihu Jehova rịọ ya arịrịọ. Égbè eluigwe a ga-akwụsị, akụ́ mmiri ígwé agaghịkwa ada ọzọ, ka i wee mara na ọ bụ Jehova nwe ụwa.+ 30 Ma ama m na gị na ndị na-ejere gị ozi agaghịdị atụ egwu Jehova Chineke.”
31 E bibiri osisi ogho na ọka bali n’ihi na ọka bali amịala oko, osisi ogho amaakwala ifuru. 32 Ma e bibighị ọka wit na ọka spelt, n’ihi na oge ha ji amị erubeghị. 33 Mosis hapụrụ Fero ma si n’obodo ahụ pụọ. Ọ gbasara aka ya n’ihu Jehova rịọ ya arịrịọ. Égbè eluigwe ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ wee kwụsị, mmiri kwụsịkwara izo n’ala ahụ.+ 34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ahụ na akụ́ mmiri ígwé ahụ na égbè eluigwe ahụ akwụsịla, o mehiere ọzọ ma kpọchie obi ya,+ ya na ndị na-ejere ya ozi. 35 Obi Fero ka kpọchiri akpọchi, ọ hapụghịkwa ndị Izrel ka ha gawa, otú Jehova si n’ọnụ Mosis kwuo.+