Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 31
IZU NA-AMALITE NA MACH 31
Abụ nke 105 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 5 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 1-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọpụpụ 2:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Akụkọ Ọgaranya na Lazarọs Adịghị Egosi na A Na-emekpa Mmadụ Ahụ́ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—td 13CH (Nkeji 5)
Nke 3: Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere—lr isi nke 12 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: “Nye Ndị Mmadụ Magazin Ochie.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna magazin ochie unu nwere ka ha gaa were ndị ha ga-eji aga ozi ọma. Gwa ha ka ha kwuo ahụmahụ ha nwere mgbe ha nyere mmadụ magazin ochie. Ị chọọ imechi okwu gị, gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo otú ọgbakọ unu si na-eke akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Eprel. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ya, tụlezienụ ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha na-agụ magazin anyị, na-enyekwa ha ndị mmadụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 28:20 na 2 Timoti 4:17. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Abụ nke 135 na Ekpere