Kwusaara “Ụdị Mmadụ Niile” Ozi Ọma
1. Olee otú onye ma ekwusa ozi ọma si yie ọkwá nkà ọrụ doro anya?
1 Ọkwá nkà ọrụ doro anya na-eji ọtụtụ ngwá ọrụ arụ ọrụ. Ọ ma mgbe ọ ga-eji nke ọ bụla n’ime ha rụọ ọrụ, marakwa ihe ọ ga-eji ya mee. Otú ahụkwa ka anyị nwere ngwá ọrụ dị iche iche ndị na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma nke ọma. Dị ka ihe atụ, e bipụtala ọtụtụ broshọ ndị ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ikwusara “ụdị mmadụ niile” ozi ọma. (1 Kọr. 9:22) E nwere broshọ ndị e depụtara n’ihe ntinye dị n’Ozi Alaeze a. E kwukwara ndị e bu n’obi bipụta nke ọ bụla n’ime ha nakwa otú e nwere ike isi nye ya ndị mmadụ.
2. Olee mgbe anyị kwesịrị inye mmadụ broshọ n’ozi ọma?
2 Mgbe E Kwesịrị Inye Mmadụ Broshọ: Ezigbo ọkwá nkà na-eji ngwá ọrụ ya nke ọ bụla arụ ọrụ mgbe ọ ma na ọ ga-abara ya uru. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị inye mmadụ broshọ mgbe anyị ma na ọ ga-abara onye ahụ uru, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ọ bụghị ya ka a na-enye n’ọnwa ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ka a na-enye n’ọnwa, ma ya abụrụ na anyị na-ezi onye na-anaghị aga chọọchị ozi ọma, ọ ga-aka mma ka e nye onye ahụ broshọ e bu ha n’obi bipụta. E mechazie, anyị enye ya akwụkwọ Bible Na-akụzi mgbe anyị chọpụtara na o nwewela mmasị n’ihe Baịbụl na-ekwu.
3. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ngwá ọrụ anyị arụ ọrụ nke ọma?
3 Baịbụl jara ndị nwere nkà n’ọrụ ha na-arụ mma. (Ilu 22:29) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ọrụ dị mkpa karịa “ọrụ dị nsọ nke ozi ọma.” (Rom 15:16) Ka anyị nwee ike ịbụ ‘ndị ọrụ ndị na-enweghị ihe ha ga-emere ihere,’ anyị kwesịrị ịna-eji ngwá ọrụ anyị arụ ọrụ nke ọma.—2 Tim. 2:15.