Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 23
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 23
Abụ nke 89 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 15 ¶13-20 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 38-42 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 39:1–40:5 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Isonyere Okpukpe Ndị Ọzọ Abụghị Ụzọ Chineke—td 31A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ihe Jehova Na-akụziri Anyị Ji Ka Ihe Ụwa Na-akụzi Mma—Fil. 3:8 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Kwuo akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Febụwarị. Meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ga-egosi otú e nwere ike isi nye ya ndị mmadụ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Mak 10:17-30. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 15: “Kwusaara ‘Ụdị Mmadụ Niile’ Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Kwuo ihe e bu n’obi bipụta broshọ ndị ahụ dị n’akwụkwọ ahụ e dere “Ị̀ Na-enye Ndị Mmadụ Broshọ Ndị A?” Họrọzie broshọ abụọ ma kwuo uru ndị bi n’ókèala unu ga-erite ma e nye ha ha. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị mara mma dị na broshọ ndị ahụ, meekwa ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime ndị ahụ ị họọrọ.
Abụ nke 112 na Ekpere