Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha Gee Chineke Ntị
1. Olee broshọ ndị e wepụtaara anyị mgbe anyị gara Mgbakọ Distrikti ‘Ka Alaeze Chineke Bịa!’? Oleekwa ihe mere ha ga-eji baara ọtụtụ ndị uru?
1 Ná Mgbakọ Distrikti ‘Ka Alaeze Chineke Bịa!’ anyị nwere n’afọ gara aga, e wepụtaara anyị broshọ ọhụrụ abụọ. Ha bụ: Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi na nwanne ya bụ́ Gee Chineke Ntị, nke a na-edeghị ọtụtụ ihe na ya. Ebe ọ bụ na ihe e dere na broshọ abụọ a ehighị nne, ịsụgharị ha anaghị ewe ndị nsụgharị oge, ọ naghịkwa esiri ha ike. Tupu e wepụta broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ Bekee, e nyela ndị nsụgharị ikike ka ha sụgharịa ya na narị asụsụ anọ na iri atọ na otu.
2. Ole ndị ka broshọ abụọ a ga-abara uru?
2 Olee ndị broshọ abụọ a ga-akacha abara uru? Legodị ihe ndị nkwusa na-ahụ n’ebe niile n’ụwa ma ha gaa ozi ọma:
• Onye nkwusa nwere ike nọrọ ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụkwanụ nọrọ nletaghachi na nke mmadụ, ya achọpụta na onye ahụ amaghị akwụkwọ ma ọ bụkwanụ na ọ naghị agụ ihe nke ọma.
• Onye nkwusa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ya achọpụta na e bipụtala akwụkwọ anyị ole na ole n’asụsụ ha na-asụ ma ọ bụkwanụ na e nweghị akwụkwọ anyị ọ bụla dị n’asụsụ ahụ. Ma ọ bụkwanụ ya achọpụta na ọ na-esiri ọtụtụ ndị ọ na-ezi ozi ọma ike ịgụ asụsụ ha na-asụ.
• Onye nkwusa ji asụsụ ndị ogbi na-ezi ndị ogbi nọ n’ókèala ha ozi ọma.
• Onye nkwusa, nne ma ọ bụ nna na-agba mbọ ka ọ mụọrọ nwatakịrị na-amabeghị agụ ihe Baịbụl.
3. Gịnị ka ị ga-ahụ ma ị sapeta peeji nke ọ bụla na broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị?
3 Ihe Dị na Broshọ Abụọ A: E deghị ọtụtụ ihe na broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị. N’ala ala peeji ọ bụla, e dere otu ahịrịokwu na ebe ihe a na-ekwu dị na Baịbụl. Olee ihe mere na e deghị ọtụtụ ihe na broshọ a? Weregodị ya na mmadụ nyere gị broshọ e dere n’asụsụ ị na-agaghị agụli, nke e jikwa mkpụrụ akwụkwọ ndị ị na-ahụtụbeghị dee. Ị̀ ga-anara ya onye ahụ, ya sọkwa ya ya bụrụ na ihe ndị e sere na ya mara ezigbo mma? Ọtụtụ ndị agaghị achọ ịnata ya. Otú ahụ ka ọ na-adị ndị na-amaghị agụ ihe ma ha hụ akwụkwọ e dere ihe. N’ihi ya, na peeji nke ọ bụla ị sapetara, ị ga-ahụ na e sere ya ọtụtụ ihe mara mma. E nwekwara ihe dị ka “v” ga-egosi gị ihe nke ọzọ ị ga-atụle.
4. Olee ihe ndị ị ga-ahụ ma ị na-asape Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi?
4 Ihe ndị e sere na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ka e sekwara na Gee Chineke Ntị. Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị na-amaghị agụ ihe nke ọma ma ọ bụkwanụ ndị ka na-amụ otú e si agụ ihe. Onye nkwusa nwere ike inye onye ọ na-amụrụ ihe Gee Chineke Ntị ma jiri Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi na-akụziri ya ihe. A tụlere isiokwu nke ọ bụla dị na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi na peeji abụọ. Nke ọ bụla n’ime ha bụ ajụjụ. Ị ga-ahụ ya n’elu elu aka ekpe peeji isiokwu ahụ bidoro. A zara ajụjụ ahụ na peeji abụọ ahụ a tụlere isiokwu ahụ. E sekwara ọtụtụ ihe na peeji nke ọ bụla, nweekwa okwu e ji kọwaa ha na amaokwu Baịbụl ndị ga-enye aka ịghọtakwu ha. I lee anya n’ala ala ọtụtụ n’ime peeji ndị dị na broshọ a, ị ga-ahụ ebe e dere ihe ndị ọzọ gị na onye ị na-amụrụ ihe nwere ike ịtụle ma ọ bụrụ na ọ ga-aghọta ha. E dekwara amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere ya aka.
5. Olee mgbe anyị nwere ike inye mmadụ otu n’ime broshọ abụọ a? Oleekwa otú anyị nwere ike isi nye ya ndị mmadụ?
5 Otú A Ga-esi Jiri Ha Na-amụrụ Ndị Mmadụ Ihe: I nwere ike inye mmadụ otu n’ime broshọ abụọ a mgbe ị nọ ozi ọma ụlọ n’ụlọ, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ bụghị ha ka a gwara anyị nyewe ndị mmadụ n’ọnwa ahụ. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “Otú E Nwere Ike Isi Nye Ha Ndị Mmadụ.”) I nwekwara ike inye ya mmadụ mgbe ị gara nletaghachi na nke ya. I nwere ike ịgwa ya na o nwere ihe ị chọrọ igosi ya. Gị ewepụtazie broshọ ahụ nye ya.
6. Olee otú anyị ga-esi jiri broshọ abụọ a na-amụrụ ndị mmadụ ihe?
6 Gee Chineke Ntị enweghị ajụjụ otú ahụ akwụkwọ Bible Na-akụzi nwere. N’ihi ya, mgbe anyị ji ya na-amụrụ mmadụ ihe, ọ gaghị abụ anyị gụpụta ajụjụ, onye ahụ azaa ya, otú ahụ anyị na-eme ma anyị na-amụrụ mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. O nweghị onye ịnụ akụkọ na-anaghị adị mma. N’ihi ya, mgbe i ji broshọ a na-amụrụ mmadụ ihe, jiri ihe ndị e sere na ya na-akọrọ ya akụkọ ndị dị na Baịbụl. Kọwaara ya ihe ndị e sere n’ebe unu na-amụ. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akọwa ha. I kwutụ, gị ajụọ ya ajụjụ. Gị na ya gụọkwa amaokwu Baịbụl e dere n’ala ala peeji unu na-amụ. Unu gụchaa ya, kọwaara ya otú o si gbasa ihe unu na-amụ. Jụọ ya ajụjụ ga-eme ka o tinye ọnụ ka i nwee ike ịmata ma ọ̀ na-aghọtakwa ihe unu na-amụ. Ọ bụrụ na ọ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ka ị na-amụrụ mmadụ, unu gụchaa ihe e dere n’ebe e sere ihe, unu agụọ amaokwu Baịbụl na-eso ya.
7. Olee otú anyị ga-esi nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ka ọ na-eme nke ọma?
7 Nyere Onye Ị Na-amụrụ Ihe Aka Ka Ọ Na-eme nke Ọma: Gị na mmadụ nwere ike mụkata ihe, ya achọwa ka ị kụziere ya otú e si agụ ihe, ka o nwee ike ịna-amụ Okwu Jehova n’onwe ya. (Mat. 5:3; Jọn 17:3) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ bụ Gee Chineke Ntị ka ị na-amụrụ mmadụ, i nwere ike kụziere onye ahụ otú e si agụ ihe. Ọ mụtahaala ịgụ ihe, gị na ya nwere ike malitezie ịmụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Ma ọ̀ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ̀ bụ Gee Chineke Ntị ka ị na-amụrụ mmadụ, a gaghị eme onye ahụ baptizim ma unu mụchaa ya. Gị na ya mụchaa broshọ ahụ, unu amalitezie ịmụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ ga-enyere ya aka ịghọtakwu Baịbụl.
8. Olee ihe mere i ji na-ekele Jehova maka inye anyị broshọ ọhụrụ abụọ anyị ga-eji na-aga ozi ọma?
8 Ọ bụ naanị ndị na-ege Ọkaakaa eluigwe na ala ntị ga-adị ndụ ebighị ebi. (Aịz. 55:3) Uche Jehova bụ ka “ụdị mmadụ niile” mụta otú ha ga-esi na-ege ya ntị, ọ bụrụgodị na ha amaghị agụ ihe. (1 Tim. 2:3, 4) Anyị na-ekele Chineke maka inye anyị broshọ ọhụrụ abụọ a anyị ga-eji na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-ege ya ntị.
[Igbe dị na peeji nke 3]
Otú E Nwere Ike Isi Nye Ha Ndị Mmadụ
Sapeta peeji nke 2-3 na broshọ ahụ ma gosi ya onye nwe ụlọ. Jụọ ya, sị: “Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụwa mgbe ọ ga-adị otú a? [Chere ka ọ zaa.] Akwụkwọ Nsọ kwere anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-eme ka ụwa maa mma otú a. Obi ga-eru ndị ga-ebi na ya ala, o nweghịkwa onye ga-ada ogbenye ma ọ bụ na-arịa ọrịa. Baịbụl kwuru ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike iso ná ndị ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ. [Gụọ Aịzaya 55:3, bụ́ nke e dere n’elu elu peeji nke 3.] Ebe a kwuru na anyị kwesịrị ‘ịbịakwute’ Chineke ma ‘gee ya ntị.’ Ma, olee otú anyị ga-esi na-ege Chineke ntị?” Sapetazie peeji nke 4-5, jirikwa ihe ndị e sere ebe ahụ zaa ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na o nweghị ohere, nye ya broshọ ahụ. Gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi zaa ajụjụ ahụ ị jụrụ ya.