Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 16
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 16
Abụ nke 101 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 23 ¶16-19, igbe dị na p. 188 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 15-17 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 16:14-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Bụ Eziokwu ahụ Jizọs Kwuru Okwu Ya na Jọn 18:37? (Nkeji 5)
Nke 3: Baịbụl Gosiri na Meri Abụghị ‘Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Ruo Mgbe Ebighị Ebi’—td 14B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Jiri Ihe Ị Na-amụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Na-eme nke Ọma n’Ozi Ọma. Okwu onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-ekwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 6, paragraf nke mbụ ruo ná ngwụcha peeji nke 8. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ ka ha kwuo otú ụlọ akwụkwọ a sirila nyere ha aka ime nke ọma n’ozi ọma.
Nkeji 20: “Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha Gee Chineke Ntị.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 5, mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ otu n’ime broshọ ndị e kwuru okwu ha na paragraf ahụ. Unu tụlechaa paragraf nke 6, mee ihe ngosi ga-ewe nkeji atọ. N’ihe ngosi ahụ, onye nkwusa ga-eji ihe osise mbụ dị na peeji nke 4 na broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị na-amụrụ mmadụ ihe.
Abụ nke 120 na Ekpere