Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 29
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 29
Abụ nke 33 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 8 ¶17-24, igbe dị na peeji nke 67 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 110-118 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị na peeji nke 8, bụ́ ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Septemba. Gbaa mmadụ niile ume ka ha pụta ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Tụleekwa ihe e kwuru n’ebe ahụ e dere “Nye Ha Magazin Ọ Bụla Merela Ochie Ma Ọ Bụkwanụ Broshuọ Ọ Bụla Ga-amasị Ha.” Ị ga-ekwu ya ka okwu ihu ọha.
Nkeji 15: Ndị Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Ọma, n’Agbanyeghị na Ha Akatala Ahụ́. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche August 1, 1998, peeji nke 32; January 15, 2007, peeji nke 32; June 1, 2007, peeji nke 22, paragraf nke 5 ruo peeji nke 23, paragraf nke 11; na Disemba 15, 2010, peeji nke 25. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Jikere Inye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Septemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ndị ahụ nye ha magazin ndị ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 122 na Ekpere