Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/12 p. 2-3
  • Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Traktị Malite Mkparịta Ụka
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Traktị Ọhụrụ Ndị Pụrụ Iche
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Okwu Chineke Dị Ndụ, Jiri Ya Na-akụzi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otú E Si Eji Traktị Amalite Mkparịta Ụka
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 10/12 p. 2-3

Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

1. Olee otú ndị ohu Chineke sirila jiri traktị zie ndị mmadụ ozi ọma?

1 Ọ dịla anya ndị ohu Jehova jiwere traktị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1880, C. T. Russell na ndị òtù ya malitere ibipụta traktị ndị ha na-enye ndị na-agụ Ụlọ Nche. Ndị ahụ na-ewerekwa ha nye ndị nwere mmasị ịgụ ha. N’afọ 1884, Russell na ndị òtù ya debara aha ụlọ ọrụ ga na-ebipụtara ọgbakọ Jehova akwụkwọ n’akwụkwọ ndị ọchịchị. Ha denyere traktị n’aha ụlọ ọrụ ahụ n’ihi otú traktị si dị mkpa n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Aha ụlọ ọrụ ahụ bụ Zion’s Watch Tower Tract Society. A na-akpọzi ya Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Ka ọ na-erule n’afọ 1918, ndị ohu Jehova n’oge ahụ nyere ndị nwere mmasị na Baịbụl ihe karịrị narị nde traktị atọ. Kemgbe ahụ, traktị so n’otu n’ime akwụkwọ ndị na-enyere anyị ezigbo aka izi ndị mmadụ ozi ọma.

2. Olee ihe mere ndị mmadụ ji enwe mmasị ịgụ traktị?

2 Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Enwe Mmasị Ịgụ Traktị: Otú e si ebi traktị na-eme ka onye ọ bụla hụrụ ya chọọ ịgụ ya. Ọ na-ama mma, ọ naghịkwa akọ ogologo akụkọ. Ọ na-atọkwa ụtọ ọgụgụ ma na-akụzi ọtụtụ ihe. Ndị ụfọdụ anaghị achọ ịkpa akwụkwọ buru ibu ma ọ bụkwanụ magazin aka. Ma, ha na-agụ traktị ọ bụla ha hụrụ. Ọ na-adịrị ma ndị ọ na-adịbeghị anya ha kwusawara ozi ọma ma ụmụaka mfe inye ya ndị mmadụ. Ihe ọzọ bụ na traktị anaghị ebu ibu. Anyị nwekwara ike itinye ya n’akpa uwe.

3. Kọọ gbasara otu onye ị ma traktị nyeere aka ịmara eziokwu dị na Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị akọọ nke ị gụtara n’akwụkwọ anyị.

3 Ọtụtụ ndị amabughị eziokwu dị na Baịbụl, ma, ọ bụ traktị bụ ihe mbụ ha gụrụ mara eziokwu. Dị ka ihe atụ, o nwere ụbọchị otu nwaanyị onye Heiti hụrụ otu traktị n’okporo ámá, ya atụtụrụ ya gụọ. Mgbe ọ gụchara ya, ọ sịrị na ihe traktị ahụ kwuru bụ eziokwu. Ka oge na-aga, ọ gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A malitekwara ịmụrụ ya Baịbụl, mechaakwa mee ya baptizim. Ihe a niile bụ n’ihi Okwu Chineke dị na traktị ọ tụtụtara n’okporo ámá.

4. Gịnị ga-abụ mkpa anyị n’ọnwa ọ bụla anyị ga-enye ndị mmadụ traktị?

4 Mgbe Anyị Nọ Ozi Ọma Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ: Ebe ọ bụ na traktị na-enyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma, ọ ga-abụ anyị gụrụ, anyị ejiri ha mere akwụkwọ anyị ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa. Anyị ga-amalite ime nke a n’ọnwa Nọvemba. Ihe ga-abụ mkpa anyị abụghị naanị inye mmadụ traktị anyị. Kama, anyị ga-eji ihe dị na ya zie onye ahụ ozi ọma. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịmatakwu ihe dị na Baịbụl mgbe anyị zichara ya ozi ọma ma ọ bụkwanụ ụbọchị anyị gara nletaghachi na nke ya, anyị nwere ike jiri nkeji ole na ole malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Akwụkwọ anyị ga-eji amụrụ ya Baịbụl bụ Bible Na-akụzi ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ anyị na ndị mmadụ na-amụ. Olee ihe ga-enyere anyị aka inye ndị mmadụ traktị mgbe anyị na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? Traktị nke ọ bụla nwere ihe ọ na-ekwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgụ ha nke ọma tupu anyị enye ha ndị mmadụ.

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-enye ndị mmadụ traktị ma anyị gaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

5 Ihe ga-enyere anyị aka ịma traktị anyị ga-enye ndị mmadụ n’ozi ọma bụ ihe traktị ahụ na-ekwu na ụdị ndị anyị chọrọ izi ozi ọma. Anyị nwere ike buru ụzọ nye onye anyị bịara na nke ya traktị tupu anyị agwawa ya ihe dị na ya. Otú traktị ahụ si maa mma nwere ike ime ka o nwee mmasị ige anyị ntị. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịchịnye onye ahụ ọtụtụ traktị ka o jiri aka ya họrọ nke dị ya mma. Ọ bụrụ na anyị agaa ozi ọma ebe ndị mmadụ na-anaghị achọ ka anyị bata n’ụlọ ha, anyị nwere ike ijide traktị otú onye anyị bịara na nke ya ga-ahụ ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya na anyị chọrọ ịtụbatara ya traktị anyị ga-achọ ka o kwuo uche ya gbasara ihe o kwuru. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na isiokwu traktị ahụ bụ ajụjụ, anyị nwere ike ịjụ ya ihe o chere. Anyị nwedịrị ike ịjụ ya ajụjụ ga-eme ka o chee echiche ma kwuo uche ya. Anyị nweziri ike ịgụpụtara ya ihe dị na traktị ahụ. Anyị gụruo ebe ajụjụ dị, anyị akwụsịtụ jụọ ya ihe o chere banyere ajụjụ ahụ. Ọ ga-adịkwa mma ka anyị si na Baịbụl gụpụta amaokwu Baịbụl ndị kwadoro ihe a na-ekwu. Anyị na onye ahụ tụlechaa paragraf ole na ole na traktị ahụ, anyị na ya nwere ike iyi mgbe ọzọ anyị ga-abịa. Ọ bụrụ na onye ị gara ozi ọma na nke ya anọghị ya, i nwere ike ịfanye traktị n’ebe onye na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya, ma ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-ahapụ akwụkwọ n’ụlọ onye na-anọghị ya.

6. Olee otú anyị ga-esi na-enye ndị mmadụ traktị anyị ma anyị na-agba àmà okporo ámá?

6 Mgbe Anyị Na-agba Àmà Okporo Ámá: Ò nwetụla ụbọchị i nyere ndị mmadụ traktị mgbe ị na-agba àmà okporo ámá? Ọ na-adịkarị ụfọdụ ndị na-agafe anyị mgbe anyị na-agba àmà okporo ámá ọsọ ọsọ, ha anaghị achọ ịkwụsị ka anyị na ha kwuo okwu. Anyị anaghị ama ma hà nwere mmasị n’ozi anyị ma ọ̀ bụ na ha enweghị. Kama inye ha magazin, ọ ga-aka mma ka anyị nye ha traktị n’ihi na anyị amaghị ma hà ga-agụ magazin anyị ga-enye ha. Ụdị ndị ahụ nwetatụ efe, ha nwere ike ịchọ ịma ihe dị na traktị ahụ n’ihi otú o si maa mma, nakwa n’ihi na ọ kọghị ogologo akụkọ. Ma, ọ bụrụ na ọ dịghị ha ngwa ngwa, anyị nwere ike ịkọtụrụ ha ihe dị na traktị ahụ anyị chọrọ inye ha.

7. Kọọ ahụmahụ ndị ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi enye ndị mmadụ traktị mgbe anyị na-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi.

7 Mgbe Anyị Na-agba Àmà n’Oge Anyị Na-anọghị n’Ozi: Traktị na-eme ka ịgba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi dịrị anyị mfe. Ihe otu nwanna na-eme bụ, ya chọọ isi n’ụlọ ya pụọ, ya achịnye traktị n’akpa uwe ya. Ya hụ mmadụ, ya agwa ya na ya chọrọ inye ya ihe ọ ga-agụ ma e mechaa. Ya ewerezie traktị ahụ nye ya. Ọ na-enye ya ma ndị na-ere ihe ma ndị ọzọ ọ hụrụ. O nwere di na nwunye chọrọ ịga lepụ anya. Tupu ha agawa, ha chetara na ha ga-ahụ ndị si mba dị iche iche. N’ihi ya, ha weere akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations, chịrịkwa traktị ndị e biri n’asụsụ dị iche iche. Ha hụ onye na-ere ihe nke na-asụ asụsụ na-abụghị Bekee, ha enye ya traktị e biri n’asụsụ ọ na-asụ. Ha na-enyekwa ndị ha hụrụ n’ebe a na-atụrụ ndụ ma ọ bụkwanụ ndị ha hụrụ n’ụlọ nri.

8. Olee otú traktị si dị ka mkpụrụ a na-agha agha?

8 “Ghaa Mkpụrụ Gị”: E nwere ike iji traktị tụnyere mkpụrụ a na-agha agha. Onye ọrụ ugbo gaa ịgha mkpụrụ, ọ naghị aghasa ya naanị otu ebe n’ihi na ọ maghị nke ga-epu ome. Ekliziastis 11:6 kwuru, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.” N’ihi ya, ka anyị kawa ahụ́ jiri ihe a na-enyere anyị ezigbo aka n’ozi ọma “na-ekesa ihe ọmụma.”—Ilu15:7.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Ebe ọ bụ na traktị na-enyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma, ọ ga-abụ anyị gụrụ, anyị ejiri ha mere akwụkwọ anyị ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa. Anyị ga-amalite ime nke a n’ọnwa Nọvemba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya