Traktị Ọhụrụ Ndị Pụrụ Iche
1. Olee ihe ndị e wepụtaara anyị ọhụrụ e mere otú pụrụ iche?
1 E wepụtara traktị ise ná mgbakọ distrikti anyị gara n’afọ 2013. E wepụtakwara Akụkọ Alaeze nke 38 n’oge na-adịbeghị anya. Isiokwu ya bụ “Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?” Otú traktị ndị a dị pụrụ iche. Olee ihe e ji mee ha otú ahụ? Anyị were ha gawa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, olee otú otú a ha dị ga-esi mee ka ọ dịrị anyị mfe izi ndị mmadụ ozi ọma?
2. Gịnị mere e ji mee traktị ndị a otú ha dị?
2 Ihe Mere E ji Mee Ha Otú Pụrụ Iche: Anyị na-emekarị ụzọ ihe anọ ma anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ha bụ: (1) Ịjụ onye anyị gara na nke ya ajụjụ ga-eme ka o kwuo uche ya. (2) Ịgụrụ onye ahụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl. (3) Inye onye ahụ akwụkwọ anyị. (4) Ịjụ onye ahụ ajụjụ anyị ga-aza ma anyị gaghachi na nke ya nakwa anyị na ya iyi mgbe ọzọ anyị ga-abịa. Traktị isii a ga-enyere anyị aka ime ihe ndị a.
3. Olee otú anyị nwere ike isi nye ndị mmadụ otu n’ime traktị ndị ọhụrụ a?
3 Otú Anyị Ga-esi Na-enye Ha Ndị Mmadụ: (1) I kelechaa onye ị bịara na nke ya, jụọ ya ajụjụ ndị ahụ dị n’ihu traktị ị chọrọ inye ya. Chere ka ọ zaa ihe dị ya mma. (2) Mepee traktị ahụ ka unu tụlee ebe e dere, “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru.” I nwere ike mepee Baịbụl gị gụọrọ ya amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ nwere ohere, unu nwere ike ịtụle ihe dị n’ebe e dere “Olee Uru Ọ Ga-abara Gị?” (3) Nyezie ya traktị ahụ, gwakwa ya ka ọ gụọ ya ma e mechaa. (4) Tupu gị alawa, gosi ya ajụjụ ahụ dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-echebara Echiche.” Gị na yiekwa mgbe ị ga-abịa ka unu kwurịta otú Baịbụl si zaa ajụjụ ahụ.
4. Ọ bụrụ na anyị gara nletaghachi na nke onye anyị nyere traktị, olee ihe anyị ga-eme?
4 Ọ ga-emekwa ka ịga nletaghachi na nke ndị mmadụ dịrị anyị mfe. I ruo na nke onye ahụ i nyere traktị, jiri amaokwu Baịbụl ndị dị ebe e dere “Ihe Ị Ga-echebara Echiche” zaa ajụjụ ahụ. Tupu gị alawa, gosi ya ebe ahụ e sere broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Wepụtakwa broshọ ahụ gosi ya. Sapetazie ebe a kọwakwuru ihe unu na-ekwu na ya. I mechaa nye ya broshọ ahụ. Ya nara gị ya, gị na ya yie mgbe ị ga-abịa ka unu kwurịta ihe dị na ya. Ị malitekwalanụ ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụkwanụ na ị chọghị inye onye ahụ broshọ ahụ, i nwere ike nye ya traktị ọzọ ma yie mgbe ị ga-abịa ka unu kwurịta ihe dị na ya.
5. Olee uru traktị na-abara anyị n’ozi ọma?
5 Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri atọ, Ndịàmà Jehova na-eji traktị ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’agbanyeghị na traktị anyị dị n’ụdị n’ụdị, ha niile na-enyere anyị aka izi ozi ọma. Ka anyị jiri traktị ndị a pụrụ iche na-ezi ozi ọma n’ụwa niile.—Ilu 15:7a.