Jiri Traktị Malite Mkparịta Ụka
1 Ọ̀ bụ na ị gaghị ekwenye na ịgba àmà dị irè dabeere nke ukwuu na gị ibu ụzọ malite mkparịta ụka? Ihe ịma aka dị na ya bụ ikwu ihe ga-adọta mmasị onye ahụ ma mee ka o tinye ọnụ. Ma olee otú a pụrụ isi mee nke a n’ụzọ dị irè?
2 Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtawo na site n’iji okwu ole na ole e ji nlezianya họrọ mee ihe, a pụrụ isi n’inyefe otu n’ime traktị anyị ndị dabeere na Bible malite mkparịta ụka. Isiokwu ha na-adọrọ adọrọ, ihe osise ha nwekwara àgwà mara mma ma na-adọrọ anya. Traktị adịghị ebubiga mmadụ ibu ókè n’anya, na-eme ka o chee na e nwere ọtụtụ ihe a ga-agụ na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ozi dị nkenke ndị dị na traktị ndị ahụ na-adọrọ mmasị, a pụkwara iji ha mee ihe iji banye n’ọmụmụ Bible.
3 Nke a bụ mmetụta otu Onyeàmà nwere n’onwe ya: “N’ụwa nke a ebe ọ dị onye ọ bụla ngwa ngwa, ndị mmadụ adịghị achọkarị itinye oge dị ukwuu n’ịgụ ihe, ma traktị ndị ahụ toro nnọọ ogologo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị inwe ozi dị mkpa ma ọ dịghị ogologo ruo n’ókè nke ịchụ ndị mmadụ ọsọ ọbụna tupu ha eleedị ya anya. Agụrụ m ọtụtụ n’ime traktị ndị ahụ, ma mesịa mụta eziokwu ahụ.” Elelịla ikike nke Okwu Chineke ndị a kọwara n’ime ozi ndị a dị nkenke e biri ebi anya mgbe ọ bụla.—Hib. 4:12.
4 Nzọụkwụ Anọ Ndị Dị Mfe: Ọtụtụ enwewo ihe ịga nke ọma site n’iji ụzọ njekwu dị mfe eme ihe. (1) Gosi mmadụ ụfọdụ n’ime traktị ndị ahụ ma jụọ ya nke ga-amasị ya. (2) Mgbe onye ahụ họrọsịịrị otu, jụọ ajụjụ a kwadebere nke ọma nke ga-eme ka otu isi ihe dị na traktị ahụ pụta ìhè. (3) Iji zaa ajụjụ ahụ, gụọ paragraf ma ọ bụ akụkụ akwụkwọ nsọ kwesịrị ekwesị site na traktị ahụ. (4) Ọ bụrụ na ọ ṅara ntị, gaa n’ihu n’ịtụle ihe ndị dị n’ime traktị ahụ ma ọ bụ dọrọ uche gaa n’otu ihe ọmụmụ dị na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ otu isiokwu dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke ga-enyekwu nkọwa. N’ụzọ dị otú a ị pụrụ ịbanye kpọmkwem n’ọmụmụ Bible. Aro ndị na-esonụ ga-enyere gị aka ịkwadebe ihe ị ga-ekwu mgbe i ji anọ n’ime traktị ndị ahụ na-eme ihe.
5 A pụrụ iji isiokwu traktị ahụ bụ́ “Onye n’Ezie Na-achị Ụwa?” mee ihe dị ka ajụjụ.
◼ Ọ bụrụ na onye gị na ya na-ekwurịta okwu asị “Chineke” ma ọ bụ “amaghị m,” gụpụta ahịrịokwu abụọ dị ná mmalite na peji nke 2 nakwa paragraf nke mbụ na peji nke 3. Kọwapụta 1 Jọn 5:19 na Mkpughe 12:9. Ma onye ahụ ò nwere obi abụọ banyere ịdị adị nke Setan bụ́ Ekwensu ma ọ bụ na o nweghị ma ọ bụ kweta mmetụta o nwere n’ụwa, ị pụrụ iji ụzọ ntụgharị uche ahụ dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ịghọta Ihe Site n’Ọnọdụ Dị Iche Iche nke Ụwa” mee ihe iji gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ. Ọ bụrụ na e gosiri mmasị, kwuo ka ị kọwaa ebe Ekwensu si bịa, na-eji isi ihe ndị dị na peji nke 3 na nke 4 nke traktị ahụ eme ihe.
6 Traktị ahụ bụ́ “Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?” pụrụ ịkpali mmasị ozugbo. Ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’ịjụ, sị:
◼ “Ì chere na ọ dị mgbe anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?” Mgbe onye ahụ zaghachisịrị, zoo aka na paragraf nke abụọ na peji nke 4 nke traktị ahụ ma gụọ Jọn 5:28, 29. Mgbe ahụ kọwaa na ọ na-enye aka ịghọta ihe ọmụma dị n’okpuru isiokwu nta mbụ dị na traktị ahụ. Tụọ aro ka unu tulekọọ ya ọnụ.
7 Traktị bụ́ “Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ” na-amasị ezinụlọ nile. N’iji ya eme ihe, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ma eleghi anya ị ga-ekweta na a na-awakpo ezinụlọ taa. Gịnị ka i chere a pụrụ ime iji wusie nkekọ ezinụlọ ike?” Mgbe onye ahụ zaghachisịrị, dọrọ uche ya gaa n’isi ihe ndị dị na paragraf nke mbụ na peji nke 6. Họrọ otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara na peji nke 4 na nke 5 nke traktị ahụ, ma kọwaa ihe ọ pụtara. Mgbe ahụ tụọ aro ka i duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
8 A pụrụ isi otú a chee ihe n’ihu mmadụ, na-eji traktị ahụ bụ́ “Ihe Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi”:
◼ “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ anụwo akụkọ banyere Ken na Ebel, bụ́ nke dị n’akwụkwọ mbụ nke Bible. Ihe ndekọ ahụ dị na Jenesis zoro aka n’ebe nwunye Ken nọ. Ọ̀ dịwo mgbe i chere banyere ebe nwunye Ken si?” Jiri paragraf ikpeazụ dị na peji nke 2 nke traktị ahụ zaa ya. Kọwaa na traktị ahụ tụlekwara okwu ndị dị mkpa ndị Bible kwuru banyere ihe ga-abụ ọdịnihu anyị. N’ịmalite na paragraf nke atọ dị na peji nke 5, gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ, na-eji akụkụ akwụkwọ nsọ ndị kwadoro ya na-eme ihe.
9 Ikesa traktị ndị dabeere na Bible abụwo ụzọ nọworo na-adị irè eri oge n’iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ. N’ihi na ha dị mfe iji ha mgbe ị na-apụ, ị pụrụ iji ha mee ihe n’ụzọ dị irè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ gị na mgbe ị na-agba àmà mberede. Traktị na-ekere òkè dị mkpa n’ijezu ozi anyị. Jide n’aka na i ji ụdị dị iche iche mgbe ị na-apụ, ma jiri ha mee ihe n’ụzọ sara mbara iji na-amalite mkparịta ụka.—Kọl. 4:17.