Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọktoba 15
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 15
Abụ nke 101 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 28 ¶1-7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Daniel 10-12 (Nkeji 10)
Nke 1: Daniel 11:15-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Ndị Kraịst Anaghị Abọ Ọbọ—Rom 12:18-21 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Jizọs Ji Kwụlie Ụgwọ Ihe Mgbapụta Ahụ—td 16B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị, ‘Enweghị M Mmasị.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ nta bụ́ Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 8 na nke 9. Unu tụlechaa ihe ụfọdụ e dere ebe ahụ, jụọ ụmụnna ihe ndị ọzọ ha merela mgbe onye nwe ụlọ gwara ha na ya enweghị mmasị. Jiri ihe dị na peeji ndị ahụ mee ihe ngosi abụọ.
Nkeji 20: “Jiri Traktị Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 5, jiri nkeji ole na ole kwuo ihe ụfọdụ gbasara traktị a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Nọvemba ma jiri otu ihe e kwuru na paragraf ahụ mee ihe ngosi. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 7, mee ihe ngosi otú onye nkwusa nwere ike isi jiri traktị gbaa àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi ọma.
Abụ nke 97 na Ekpere