Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/95 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 12/95 p. 7

Ịma Ọkwa

◼Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na December: Asụsụ nile—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, n’ụtụ ₦240. Ọ bụrụ na ọ dịghị, jiri Akwụkwọm nke Akukọ Bible (₦240) ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe (nke nnukwu, ₦120; nke obere, ₦120). January: Asụsụ nile—A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1982 n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị e ji akwụkwọ ndị na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego nke a dị ala. February na March: Bekee, Efịk, na Igbo—Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Asụsụ ndị ọzọ—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.

◼ Ememe Ncheta nke 1997 ga-abụ na Sunday, March 23, mgbe anyanwụ dasịrị. A na-ama ọkwa nke a n’oge banyere ụbọchị Ememe Ncheta 1997 ka ụmụnna wee nwee ike ime nchekwa ndị dị mkpa ma ọ bụ nweta ụlọ nzukọ ndị e nwere mgbe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, nke na ha aghaghịkwa ịchọta ebe ndị ọzọ.

◼ Ihe ntinye dị ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị bụ “Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996,” e kwesịkwara idebe ya maka ntụaka n’ime 1996 dum.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya