Igbe Ajụjụ
◼ Ò kwesịrị ekwesị ka ndị na-ege ntị kụọ aka maka ihe omume nke ọ bụla nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ Nzukọ Ije Ozi?
1 Ndị na-ege ntị nke ọ bụ ndị Jehova mejupụtara na-egosi ekele n’ezie. Ọ bụ ihe dị mma na ha chọrọ igosi ekele ahụ maka mgbalị ụmụnna ha na ihe omume ha mere site n’ikpo okwu. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa n’ụbọchị anyị, a pụrụ igosi ekele dị otú ahụ site n’ịkụ aka. Ma ịkụ aka kwesịrị isite ná mkpali, site n’obi. Ọzọ, ọ na-abụkarị ngosipụta nke ekele maka ihe pụrụ iche. N’ihi ya, ná mgbakọ ndị buru ibu, tinyere mgbakọ sekit, bụ́ mgbe a na-edokwa maka usoro ihe omume pụrụ iche, ụmụnna anyị etinyekwa oge na mgbalị ka ukwuu n’ihe omume ha, anyị na-ahụ ka ndị na-ege ntị na-akụ aka, ọ bụghị nanị ná ngwụsị nke okwu ahụ kama mgbe ụfọdụ n’oge a na-ekwu ya.
2 Ma nke a ò kwesịrị ịdị otú ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị? O doro anya na a pụghị inwe ụkpụrụ na-emegide ya ma ọ bụrụ na e mere ya site ná mkpali na n’ihi ekele sitere n’obi. Ma n’ụzọ dị otú o kwesịrị anyị adịghị akụ aka maka ihe omume ndị a n’ihi na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ pụrụ nnọọ ịghọ ihe a na-eme iji mezuo iwu wee si otú ahụ ghara inwekwa ezi ihe ọ pụtara.
3 Otú ọ dị, e nwere ihe anyị nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị pụrụ ime iji gosi ezi ekele maka mgbalị nke onye na-ekwu okwu, nke ahụ bụkwa ịmụrụ anya n’oge okwu ahụ na-aga n’ihu, na-elegide ya anya ma na-egosi site n’ọdịdị nnakwere dị n’ihu anyị na anyị na-eso echiche ya, na-eritekwa uru. Ọzọ, anyị na-ahụkarị na o kwere omume ịgwa ọkà okwu ahụ okwu n’onwe anyị mgbe nzukọ gasịrị, iji gwa ya na anyị nwere mmasị n’ihe omume ya.