Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/99 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jikere Ugbu A Maka Nsogbu Nwere Ike Ime Ka E Buga Gị Ụlọ Ọgwụ na Mberede
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Otú Chineke Si Ele Ọbara Anya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 9/99 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Ị̀ dị njikere maka ọnọdụ mberede?

N’ụwa nke oge a, “mgbe na ihe ndapụta” na-ejikọkarị aka iji kpata ọnọdụ mberede ahụ ike, gụnyere nrụgide ịnara mmịnye ọbara. (Ekli. 9:11) Ka anyị wee nwee ike ijikere maka ihe dị otú ahụ ime, Jehova enyeworo anyị aka n’ụzọ dị iche iche site ná nzukọ ya, ma ọ na-atụ anya ka anyị mee akụkụ nke anyị. Ihe ndepụta dị n’okpuru bụ iji nyere gị aka.

• Na-eji kaadị Advance Medical Directive/Release gị nke kasị ọhụrụ mgbe nile.

• Jide n’aka na ụmụ gị na-eji Identity Card kasị ọhụrụ.

• Tụleghachi ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 1997, na-amụgharị ụzọ isi soro ndị dọkịta na ndị ọkaikpe tụgharịa uche banyere ọgwụgwọ a ga-enye nwa gị.

• Tụleghachi isiokwu ndị kwuru okwu banyere ihe ndị si n’ọbara na ihe ndị a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ọbara. (Ndị a tụrụ aro ha: Ụlọ Nche, October 1, 1994, peji nke 31; June 1, 1990, peji nke 30-31; March 1, 1989, peji nke 30-31; Teta! (Bekee), December 8, 1994, peji nke 23-27; August 8, 1993 (Bekee), peji nke 22-25; November 22, 1991 (Bekee), peji nke 10; na ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1992 na August 1994. Tinye ha n’ime otu faịlụ maka ịchọta ha ngwa ngwa.)

• Jiri akọ na uche gị kpebie ma ị̀ pụrụ ikwe ka e jiri ígwè ọrụ na-ebugharị ọbara si n’ahụ pụọ mee ihe ma ọ bụ ma ị̀ pụrụ ịnakwere ihe ndị e tinyere ihe ndị si n’ọbara na ha.

• Tupu ị gawa ụlọ ọgwụ, ma ọ dị otú o si kwe omume, mee ka ndị okenye mara ka ha wee nwee ike ịkwado gị na ịkpọtụrụ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. N’ihe banyere obere nwa, gwa ndị okenye ka ha mee ka HLC mara n’oge.

Mee Ka Ọjụjụ Ị Jụrụ Ọbara Doo Anya: Akụkọ na-egosi na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ụfọdụ na-echere ruo n’ikpeazụ tupu ha agwa ndị dọkịta na-agwọ ha na ha achọghị ọbara. Nke a abụghị ụzọ dị mma isi mesoo ndị ọrụ ahụ ike, ọ na-etinyekwa gị n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a mịnyere ọbara. Ọ bụrụ na ndị dọkịta amara na ọ dị akwụkwọ a bịanyere aka na ya nke na-akwado ihe ndị i kwenyere na ihe ndị ị chọrọ, nke na-akọwapụta ntụziaka gị kpọmkwem, ọ na-enyere ha aka ịga n’ihu n’egbughị oge, ọtụtụ mgbekwa, na-eme ka ha nwekwuo ihe ndị ha pụrụ ime n’ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara.

Ebe ọnọdụ mberede ahụ ike pụrụ ịdapụta mgbe ọ bụla, dị ka ọ na-adịkarị, mgbe ị na-atụghị anya ya, mee ihe ugbu a iji chebe onwe gị na ụmụ gị pụọ ná mmịnye ọbara.—Ilu 16:20; 22:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya