Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara na Otú E Si Awa Mmadụ Ahụ́
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

■ Ndịàmà Jehova hà na-anara mmịnye nke akụkụ ụfọdụ nke ọbara, dị ka immune globulin ma ọ bụ albumin?

Ụfọdụ ndị na-eme otú ahụ, na-ekwere na Akwụkwọ nsọ ekwughị ihe ọ bụla hoo haa iji kagbuo ịnara mmịnye nke akụkụ dị nta, ma ọ bụ otu n’ime ihe ndị e si n’ọbara nweta.

Onye Okike ahụ bu ụzọ nye ihe nile a kpọrọ mmadụ iwu nke izere iri ọbara: “Ihe nile ọ bụla nke na-akpụ akpụ, nke dị ndụ, ga-abụrụ unu ihe oriri; . . . nanị anụ ahụ nke ndụ ya, bụ́ ọbara ya, dị n’ime ya ka unu na-agaghị eri.” (Jenesis 9:3, 4) Ọbara bụ ihe dị nsọ, a pụkwara iji ya mee ihe nanị n’ịchụ àjà. Ọ bụrụ na e jighị ya mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ, a ga-awụsi ya n’ala.—Levitikọs 17:13, 14; Deuterọnọmi 12:15,16.

Nke a abụghị mmachibido iwu nkịtị na-adị nwa oge nye ndị Juu. Mkpa ọ dị izere ọbara bụ nke e kwughachiri gwa ndị Kraịst. (Ọrụ 21:25) Gburugburu ha n’ime Alaeze Rom, a na-emebi iwu Chineke aghara aghara, ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ na-eri nri ndị e ji ọbara mee. A na-emebikwa ya n’ihi ihe ndị metụtara “ọgwụ na ahụ ike”; Tertullian kọrọ na ụfọdụ ndị na-aṅụ ọbara, na-eche na ọ pụrụ ịgwọ ọrịa akwụkwụ. ‘Ha na-eji oké akpịrị na-aṅụ ọbara ndị omempụ ndị e gburu n’ama egwuregwu.’ O kwukwara, sị: “Ka ibubo nwụọ unu n’ahụ maka ụzọ ọjọọ nile unu n’ihu ndị Kraịst bụ́ ndị na-adịghị enwe ọbụna ọbara ụmụ anụmanụ n’ihe oriri ha.” Ndịàmà Jehova n’oge a kpebisiri nnọọ ike otú ahụ ịghara imebi iwu Chineke, n’agbanyeghị otú o si bụrụ na ọha mmadụ ndị ọzọ na-eri nri ndị e ji ọbara mee. N’afọ ndị 1940, a malitere iji mmịnye ọbara na-eme ihe n’ụzọ sara mbara, Ndịàmà ahụ hụkwara na irubere iwu Chineke isi ga-achọkwa ka ha zere mmịnye ọbara, ọbụna ma a sị na ndị dọkịta agbaa ha ume ịnara ya.

Ná mmalite, ihe ka ọtụtụ ná mmịnye ọbara ndị e mere bụ ọbara na ihe nile dị na ya ka a na-amịnye. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị na-eme nnyocha malitere ikewasị ọbara gaa n’ọtụtụ ihe dị iche iche ndị mejupụtara ya, n’ihi na ndị dọkịta kwubiri na ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adịcha mkpa inye ndị ọrịa ụfọdụ akụkụ nile bụ isi nke ọbara. Ọ bụrụ na e nye ya nanị otu n’ime ihe ndị mejupụtara ọbara, ọ ga-abanye n’ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ize ndụ dị ala karị, ndị dọkịta pụkwara iji ọbara ha nwere mezuo ihe dị ukwuu karị.

A pụrụ ikewasị ọbara mmadụ gaa n’ihe dị ojii nke mkpụrụ ndụ dị na ya nakwa ihe dị mmiri mmiri nke na-acha edo edo (plasma, ma ọ bụ serum). Akụkụ ahụ nwere mkpụrụ ndụ (45 pasenti nke otú ọbara ahụ hà) bụ nke ihe mejupụtara ya bụ ihe ahụ a na-akpọkarị mkpụrụ ndụ ndị na-acha uhie uhie, ndị na-acha ọcha, na platelet. Akụkụ nke ọzọ dị 55 pasenti bụ plasma ahụ. Ihe mejupụtara 90 pasenti nke ihe a bụ mmiri, ma ọ na-ebu ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ọtụtụ protein, hormone, nnú dị iche iche, na enzyme. Taa, a na-ekewasị ihe dị ukwuu n’ọbara ndị e nyere n’onyinye gaa n’ihe ndị a bụ isi mejupụtara ya. A pụrụ inye otu onye ọrịa mmịnye nke plasma (ma eleghị anya FFP, bụ́ plasma ọhụrụ e mere ka ọ jụọ oyi) iji gwọọ ahụ nkụnwụ mberede. Ma a pụrụ inye onye na-arịa ọrịa ụkọ ọbara mkpụrụ ndụ ndị e chekwara echekwa, ya bụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie ndị e chekwawororịị wee tinye ha n’ihe dị mmiri mmiri wee mịnye ha n’ahụ mmadụ. A na-amịnyekwa platelet na mkpụrụ ndụ ndị na-acha ọcha n’ahụ mmadụ, ma a naghị emecha ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ e ji na-eme ndị ọzọ.

N’oge e dere Bible, ụmụ mmadụ achọpụtabeghị nkà dị otú a nke iji akụkụ ndị a dị iche iche na-eme ihe. Ihe Chineke nyere n’iwu bụ nanị: ‘Hapụnụ ọbara.’ (Ọrụ 15:28, 29) Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka mmadụ kwesịrị iji chee na e nwere ọdịiche dị ma ọ bụrụ na ọbara ahụ jikọtara ihe dum dị n’ime ya ma ọ bụ na e kewasịrị ya gaa n’ihe dị iche iche ndị a mejupụtara ya? Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ṅụrụ ọbara, ma ndị Kraịst jụrụ ime nke ahụ ọbụna ma a si na ọ pụtaara ha ọnwụ. Ì chere na ha gaara emeghachiworị omume n’ụzọ dị iche ma a si na mmadụ wetara ọbara, chere ka e kewasia ya gaa n’ihe dị iche iche mejupụtara ya, wee nye ha nanị plasma dị na ya ma ọ bụ nanị akụkụ ahụ kpụkọtara akpụkọta, ma eleghị anya bụ nke e ji mee ngwọngwọ ọbara? Ọ dịghị ma ọlị! Ya mere, Ndịàmà Jehova adịghị anara mmịnye ọbara nke jikọtara ihe dum dị n’ime ya ma ọ bụ nke akụkụ ndị bụ isi mejupụtara ya (mkpụrụ ndụ ndị na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ ndị na-acha ọcha, platelet, ma ọ bụ plasma), bụ́ nke e ji emezu otu ihe ahụ.

Ma, di ka ajụjụ ahụ tụrụ aro ya, ndị ọkà mmụta sayensị amụwo ihe banyere akụkụ dị iche iche ndị pụrụ iche nke ọbara na ụzọ a pụrụ isi jiri ha mee ihe. Otu okwu a na-anụkarị metụtara protein dị iche iche nke plasma —globulin, albumin, na fibrinogen. O yikarịsịrị ka nke a kasị jiri na-eme ihe n’ịgwọ ọrịa n’ime ha bụ ịmịnye globulin nke na-enye ahụ ihe e ji alụso ọrịa ọgụ. Gịnị mere e ji na-eme nke ahụ?

Ahụ gị pụrụ imepụta ihe ndị na-alụso njé ọrịa ọgụ megide ụfọdụ ọrịa, wee na-eme ka i nwee ike iguzogide ọrịa. Nke a bụ ihe ndabere e nwere maka ibu ụzọ agba ọgwụ nchebe tupu ọrịa abịa, na-eji ọgwụ (toxoid) ndị na-emegide ọrịa ahụ mkpọnwụ bụ polio, achaka ntì, rubella (ákpàtà), diphtheria-tetanus-pertussis, na ahụ ọkụ typhoid. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dị ọrịa siri ike nke ka rịasịrị mmadụ, ndị dọkịta pụrụ ikwu ka a gbaa ya mmiri ọgwụ serum (antitoxin) iji mee ka o nwee ike iguzogide ọrịa ozugbo ahụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ruo n’oge na-adịghị anya gara aga, a na-emepụta ụdị ọgwụ ọgbụgba dị otú ahụ site n’isi n’ahụ onye dịrị mbụ nwee ike nguzogide ọrịa mịpụta globulin ndị na-eguzogide ọrịa, bụ́ ndị nwere ihe ndị na-alụso njé ọrịa ọgụ n’ime ya.a Ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ike ịlụso ọrịa ọgụ a na-enweta site n’ọgwụ ọgbụgba ahụ adịghị adịgide adịgide, n’ihi na mgbe oge ụfọdụ gasịrị ihe ndị ahụ na-alụso njé ọrịa ọgụ nke a gbanyere n’ahụ onye ọrịa ahụ na-apụ.

N’iburu n’uche ihe ahụ e nyere n’iwu, bụ́ ‘ịhapụ ọbara,’ ụfọdụ ndị Kraịst echewo na ha ekwesịghị ịnara mmịnye nke globulin ndị nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ (protein), ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu akụkụ nke ọbara. Ọnọdụ ha weere pụtara ìhè, dịkwa mfe—ha adịghị anara akụkụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ ụdị ọ bụla nke ọbara.

Ndị ọzọ echewo na mmiri ọgwụ serum (antitoxin), di ka globulin nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ, nke nwere nanị akụkụ dị nta nke plasma sitere n’ọbara nke onye nyere onyinye ọbara, nke e jikwa mee ihe iwulite ikike ha onwe ha nwere ịlụso ọrịa ọgụ, abụghị otu ihe ahụ ya na mmịnye ọbara nke e ji akwado ndụ. Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na akọ na uche ha agaghị egbochi ha ịnara globulin ahụ nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ ma ọ bụ akụkụ ndị ọzọ yiri nke a.b Ha pụrụ ikpebi na n’ihe banyere ha onwe ha, mkpebi ahụ ga-adabere n’ụzọ bụ isi n’eziokwu ahụ bụ ma hà dị njikere iche ihe ize ndụ ahụ ike ọ bụla ihu, bụ́ nke pụtara site n’ịnara ihe a mịpụtara site n’ọbara nke ndị ọzọ.

Ọ bu ihe dị mkpa ịmata na usoro ọbara nke nwanyị dị ime dị iche na nke nwa ahụ o bu n’afọ; ụdị ọbara ha nwere na-adịkarị iche. Nwanyị ahụ anaghị ebufere nwa ahụ o bu n’afọ ọbara nke ya. Ihe ndị e mepụtaworo emepụta (mkpụrụ ndụ) ndị sitere n’ọbara nke nwanyi ahụ anaghị agafe eriri ahụ jikọtara nwanyị na nwa ya wee banye n’ọbara nke nwa ahụ e bu n’afọ. Plasma adịghị emekebekwa otú ahu. N’eziokwu, ọ bụrụ na, site n’ihe mmerụ ahụ ụfọdụ, ọbara nke nwanyị ahụ na nke nwa o bu n’afọ agwakọta, a pụrụ inwe nsogbu ahụ ike mgbe oge ụfọdụ gasịrị (enweghị nkwekọ nke Rh ma ọ bụ ABO). Otú ọ dị, ihe ụfọdụ ndị sitere na plasma ahụ na-agafe n’usoro nrugharị ọbara nke nwa ahụ e bu n’afọ. Protein ndị dị na plasma ndị dị ka globulin nke nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ na albumin hà na-eme otú ahụ? Ee, ụfọdụ na-eme otú ahụ.

Nwanyị dị ime nwere usoro na-arụsi ọrụ ike nke na-eme ka globulin ụfọdụ ndị nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ ndị sitere n’ọbara nke nne gafeere nwa o bu n’afọ. N’ihi na nrufe nke a dị n’usoro okike nke ihe ndị na-ebuso njé ọrịa agha banye n’ime nwa ahụ e bu n’afọ na-eme n’afọ ime nile, a na-amụ ụmụ ntakịrị ha wee nwee ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ike nchebe n’ebe ọrịa ụfọdụ dị.

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere albumin, nke ndị dọkịta ụfọdụ pụrụ ikwu ka a mịnyere mmadụ dị ka ihe e ji agwọ nkụnwụ ahụ mberede ma ọ bụ ụfọdụ ọnọdụ ndị ọzọ.c Ndị na-eme nnyocha anwapụtawo na a na-ebufekwa albumin nke sitere na plasma, ọ bu ezie na ọ naghị adịcha irè, site n’eriri ahụ jikọtara nne na nwa, gafeere nwa ahụ o bu n’afọ.

Eziokwu ahụ nke bụ na akụkụ ụfọdụ nke protein sitere na plasma na-agafere onwe ya site n’usoro ọbara nke otu onye gaa na nke onye ọzọ (bụ́ nwa ahụ e bu n’afọ) pụkwara ịbụ ihe ọzọ onye Kraịst ga-atụle mgbe ọ na-ekpebi ma ya ga-anara mmịnye nke globulin ndị nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ, albumin, ma ọ bu mmịnye nke ihe ndị ọzọ sitere na plasma. Otu onye pụrụ iche na ya puru iji akọ na uche di mma mee nke ahụ; onye ọzọ pụrụ ikwubi na ya apụghị ime ya. Onye ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ya okwu ahụ n’ihu Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Site n’usoro nke ịgwakọta usoro eriri ndụ DNA, ma ọ bu nke ịhazigharị eriri ndụ, ndị ọkà mmụta sayensị na-agbalị imepụta ihe ndị yiri nke a, bụ́ ndị a na-esiteghị n’ọbara mee.

b Otu ihe atụ bụ globulin ahụ nwere ihe e ji alụso ọrịa ọgụ bụ Rh, bụ́ nke ndị dọkịta pụrụ ikwu ka a mịnyere mmadụ mgbe a na-enweghị nkwekọrịta n’etiti Rh nke nwanyị na nwa o bu n’afọ. Ọzọ bụkwa Factor VIII, nke a na-enye ndị nwere ọrịa oruru ọbara.

c Ihe àmà gosiri na a pụrụ iji ihe dị mmiri mmiri ndị a na-eji edochi ọbara gbapụrụ agbapụ, bụ ndị a na-ejighị ọbara mee (dị ka hetastarch [HES]) mee ihe n’ụzọ di irè di ka ọgwụgwọ maka ahụ nkụnwụ mberede na ọnọdụ ndị ọzọ ndị a pụwororịị iji ngwakọta albumin gwọọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya