Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January: Asụsụ nile—Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ ma ọ bụ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? n’ụtụ ₦80. Ọgbakọ ndị ka nwere akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e biri tupu 1982 pụrụ inyefe ha n’ọnụ ego dị ala bụ́ ₦40. E kwesịrị ibu ụzọ nyefee akwụkwọ ndị dị otú ahụ. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị e ji akwụkwọ ndị na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego dị ala nke a. February: Bekee, Efịk, na Igbo—Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ ma ọ bụ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Asụsụ ndị ọzọ—Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị dị mma maka ime Ememe Ncheta n’afọ a na Tuesday, April 2, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ iji mee ihe maka uhuruchi ahụ. Ememe Ncheta ahụ ekwesịghị ịmalite mgbe oge gafeworo nke na ọ gaghị adịrị ndị ka na-enwe mmasị ọhụrụ mfe ịbịa. Ọzọ, usoro ihe omume ahụ ekwesịghị ịdị mkpagide nke na e nweghị ohere tupu ma ọ bụ mgbe ememe ahụ gasịrị maka ikele ndị ọbịa, ime ndokwa maka ịnọgide na-enye ụfọdụ enyemaka ime mmụọ, ma ọ bụ iji gbarịta mmadụ nile ume. Mgbe a tụlesịworo ihe nile nke ọma, ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-enyere ndị ga-abịa Ememe Ncheta ahụ aka karịsịa irite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe omume ahụ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 1996 na Sunday, April 21. Isiokwu nke okwu ahụ ga-abụ “Ịnọgide n’Enweghị Ntụpọ n’Ime Ọgbọ Gbagọrọ Agbagọ.” A ga-enye ihe ndepụta. Ọgbakọ ndị onye nlekọta sekit na-eleta, ndị nwere mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ga-enwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị inwe okwu ahụ pụrụ iche tupu April 21.
◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 3, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ọgbakọ Na-anọgidesi Ike n’Ihe n’Okpuru Idu Ndú Kraịst.” Ndị nlekọta sekit na-egosi ugbu a ihe nkiri slide bụ́ “Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri Gburugburu Ụwa” ga-anọgide na-eme nke ahụ ruo mgbe ọgbakọ nile dị na sekit ahụ kiriworo ihe nkiri slide ahụ. Otú ọ dị, na sekit ebe a na-adịghị egosi slide ndị ahụ, onye nlekọta sekit ga-amalite okwu ọhụrụ ahụ dị ka e depụtara n’elu.
◼ A ga na-ewepụta mbipụta Ụlọ Nche kwa ọnwa kwa ọnwa nke ya na nke Bekee na-agakọ n’Isoko, na-amalite ná mbipụta nke January 1, 1996.
◼ Yearbook Maka Ndị Ọsụ Ụzọ—Onye ọsụ ụzọ ọ bụla nke oge nile na nke pụrụ iche nke e debara aha ya tupu ma ọ bụ na July 1, 1995, ruru eru inweta otu Yearbook n’efu. A pụrụ inweta nke a site n’akwụkwọ a na-ebutere ọgbakọ. Na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20, a ghaghị idepụta nke ọma ọnụ ọgụgụ Yearbook e nyere n’efu maka ndị ọsụ ụzọ ka e wee sepụ ego ha zuru ezu maka nke ọ bụla. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ inwetakwu Yearbook n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ. A ga-eji ndị a mee ihe n’ubi. A ghaghị ime ndejupụta dị iche n’okpuru ego a na-esepụrụ ndị ọsụ ụzọ na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20. Detuo “Yearbook ndị bụ n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ.” A gajeghị ịghọtahie nke a na ndị a ga-enye ndị ọsụ ụzọ n’efu. A ga-esepụ ego a na-esepụrụ ndị ọsụ ụzọ maka nke ọ bụla e nyere n’ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ.
◼ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị Maka Ndị Ọsụ Ụzọ—Onye ọsụ ụzọ ọ bụla nke oge nile na nke pụrụ iche nke e debara aha ya tupu ma ọ bụ na July 1, 1995, ruru eru inweta otu n’efu maka iji mee ihe n’onwe ya. Maka nke ọ bụla e nyere, a ga-esepụ ego ya zuru ezu n’ihe ndekọ ego akwụkwọ unu. E tinyeghị ndị ọsụ ụzọ inyeaka na nke ọ bụla n’ime ndokwa ndị a. Ọzọ, a ghaghị idepụta nke ọma ọnụ ọgụgụ es96 e nyere ndị ọsụ ụzọ n’efu na fọm ịkwụ ụgwọ bụ́ S-20 ka e wee sepụ ego ha zuru ezu maka nke ọ bụla.