Jiri Obi Ike Kwuo Okwu
1 N’ime afọ ndị a, ọ na-esiwanyere ndị nkwusa n’ebe ụfọdụ ike ịgwa ndị mmadụ okwu n’ụlọ ha. Ọtụtụ na-ekpesa na n’ókèala ha ihe karịrị 50 pasent ná ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ mgbe a na-akpọtụrụ ha site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ihi ya, ihe ka ukwuu n’oge a na-etinye adịghị amị mkpụrụ.
2 Ọtụtụ afọ gara aga a na-achọta ndị mmadụ n’ụlọ na Sunday, nke ọha na-ele anya dị ka ụbọchị izu ike. Omenala agbanwewo. Ọ bụ ihe a na-ahụkarị taa ka ndị mmadụ na-arụ ọrụ ego, na-elekọta mkpa ezinụlọ dị ka ịga ahịa, ma ọ bụ na-ekere òkè n’egwuregwu, nke na-akpọpụkarịkwa ha n’ụlọ. Ya mere ọbụna na Sunday, inweta ndị mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ abụwo nsogbu ọtụtụ mgbe.
3 Mgbe ndị mmadụ na-anọghị n’ụlọ, o doro anya na ọ pụtara na ha nọ n’ebe ọzọ. Ebe ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịgwa ndị mmadụ okwu, gịnị ma anyị gwa ndị anyị na-ezute okwu—n’okporo ámá, n’ọma ahịa, ma ọ bụ n’ebe ọrụ. Ọ bụ omenala Pọl ịgakwu “ndị ọ na-ezute,” iji gbaara ha àmà. (Ọrụ 17:17) Nke a ghọrọ ụdị ịgba àmà na-amị mkpụrụ n’oge ahụ, ọ bụkwa ụdị ịgba àmà nke na-amị mkpụrụ n’oge anyị.
4 Mgbe anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-ahụkarị ndị mmadụ ka ha na-akpagharị ma ọ bụ ma eleghị anya na-eche mmadụ. N’ụbọchị dị mma, ha pụrụ ịdị na-asa ákwà ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ala ha. Mmụmụ ọnụ ọchị dị ka onye agbata obi na ekele enyi pụrụ ịbụ nanị ihe dị anyị mkpa iji malite mkparịta ụka. Ọ bụrụ na ha bi nso, anyị pụrụ ọbụna ikwu na ma eleghị anya anyị gara n’ụlọ ha ka ha ka pụsịrị nnọọ, ugbu a kwa obi dị anyị ụtọ na anyị nwee ohere isoro ha kwurịta okwu. Site n’ibute ụzọ gosikwuo obi ike, ọtụtụ enwewo ahụmahụ ndị na-enye ụgwọ ọrụ.
5 Obi Ike Na-arụpụta Ihe: Otu nwanna kọrọ na ya na-agakwu ndị guzo ọtọ, ndị na-eche bọs, na-eme mkpagharị, ma ọ bụ nọdụ n’ụgbọ ala ha. Site n’ịmụmụ nnọọ ọnụ ọchị na olu obi ụtọ, ọ na-eme dị ka onye agbata obi bụ́ enyi nke chọrọ nanị ileta ha. N’ụzọ dị otú a ọ bụghị nanị na o tinyewo ọtụtụ akwụkwọ kamakwa ọ malitewo ọtụtụ ọmụmụ Bible.
6 Nwanna ọzọ na nwunye ya na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ mgbe ha zutere otu nwanyị bu nnukwute akpa ịzụ ahịa na-agafe. Ha malitere mkparịta ụka, na-aja ya mma maka ịdị uchu n’ilekọta mkpa ezinụlọ ya. “Ma ònye,” ka ha jụrụ, “pụrụ igbo mkpa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ?” Nke ahụ kpakere mmasị nwanyị ahụ. Nkwurịta okwu dị mkpirikpi dubara n’ọkpụkpọ òkù ịga n’ụlọ ya, bụ́ ebe a malitere ọmụmụ Bible.
7 Ya mere mgbe ọzọ ị na-agba àmà site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, ma ọ bụ na Sunday ma ọ bụ n’ụbọchị ọ bụla ọzọ nke izu, i wee hụ na ndị mmadụ anọghị n’ụlọ, gịnị ma i nwetatụkwuo obi ike ma gwa ndị ị na-ezute okwu—n’okporo ámá ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ? (1 Tesa. 2:2) Ị pụrụ ije ozi ka na-amị mkpụrụ, ị ga-enwekwa ahụmahụ nke ọṅụ ka ukwuu n’ije ozi gị.