Jiri Nghọta Kwusaa
1 Inwe nghọta chọrọ ka anyị ghọta ihe banyere ndị anyị na-ekwusara. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ịga nke ọma anyị n’iru n’obi ndị mmadụ dabeere n’ikike anyị izi ozi Alaeze ahụ n’ụzọ na-adọrọ mmasị ha. N’ime ọnwa January, anyị ga na-enyefe ụdị akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Bible bụ́ ndị ọgbakọ ka pụrụ inwe. Ma ọ bụghị ya, ndị nkwusa ga-eji akwụkwọ “Ka Alaeze Gị Bịa” mee ihe. Aro ndị na-esonụ pụrụ inye aka.
2 Ọ bụrụ na ị họrọ inyefe akwụkwọ “Ka Alaeze Gị Bịa,” ị pụrụ izo aka n’ihe osise dị na peji nke 4 na 5 wee sị:
◼ “Ihe osise a bụ echiche onye na-ese ihe nke ihe Bible na-akụzi banyere nzube Chineke maka ụwa. Gịnị ka i chere na ọ ga-ewe ka gị na ezinụlọ gị wee biri n’ụwa paradaịs? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-egosi na ọnọdụ paradaịs a ga-adị adị n’ezie n’isi nso n’okpuru Alaeze Chineke. [Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.] Akwụkwọ a pụrụ igosi gị ihe dị gị mkpa ime iji rite uru site n’ihe Chineke ga-eme. M ga-achọ ịhapụrụ gị nke a.” Nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya ma mee ndokwa maka ịlaghachi iji kwurịtakwuo okwu.
3 A pụrụ iji ụzọ dị iche nyefee akwụkwọ “Ka Alaeze Gị Bịa” site n’iji okwu mmeghe dị na peji nke 12, paragraf nke 5, nke akwụkwọ “Reasoning,” mee ihe:
◼ “N’iso ndị agbata obi m kwurịta okwu, ahụtawo m na ọ na-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike ibi n’okpuru gọọmenti nke pụrụ n’ezie idozi nnukwu nsogbu ndị na-eche anyị ihu taa—mpụ na oké ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ (ma ọ bụ ihe ọ bụla dị n’uche ọtụtụ ndị ugbu a). Nke ahụ ga-amagbu onwe ya, ì kwenyeghị? [Nye ohere maka nzaghachi.] È nwere gọọmenti dị otú ahụ taa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị ekpewo ekpere n’ezie maka gọọmenti dị otú ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i kpewo ekpere maka ya, ma ọ bụghị ọtụtụ ndị na-eche banyere ya dị ka gọọmenti.” Gụọ Daniel 2:44 ma nwapụta ịdị adị n’ezie nke Alaeze ahụ. Sapeta igbe dị na peji nke 25 nke akwụkwọ ‘Alaeze Bịa,’ ma gosikwa ihe Alaeze Chineke ga-arụzu. Mee ndokwa maka ịlaghachi iji kwuritakwuo okwu ma nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya.
4 Ọ bụrụ na i ji akwụkwọ “Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma” eme ihe, ị pụrụ ịmalite site n’ịsị:
◼ “E nwere mgbagwoju anya na ejighị ihe n’aka banyere ihe bụ n’ezie ụzọ kachasị mma isi bie ndụ anyị. Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu ga-achọ ịchọta ụzọ ndụ nke na-eweta udo na afọ ojuju ugbu a ma na-eme ka e jide inwe ọdịnihu dị ntụkwasị obi n’aka. Ma è nwere ụzọ isi bie ndụ nke na-enweghị ihe ịkwa ụta? [Nye ohere maka nzaghachi.] Olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu ka mma ga-eme ka ndụ anyị nwee nzube.” Gụọ 1 Pita 3:13 ma nye nkọwa ya. Kọwaa na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ugbu a ga-eweta afọ ojuju na obi ụtọ. Tụlee isi ihe ndị sitere na paragraf nke 34 na 35 nke isiakwụkwọ nke 11 nke akwụkwọ Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, wee nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya.
5 Ị pụrụ ịdọrọ mmasị onye ntorobịa site n’ụzọ dị mkpirikpi isi chee akwụkwọ “Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya” n’ihu ya site n’ịsị:
◼ “Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru sị: ‘Ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ na-eji afọ ndị mbụ ha eme ihe iji mee ka ndị ikpeazụ ha bụrụ ndị nke nhụsianya.’ Ị chọghị ka nke ahụ mee gị, ka ị̀ chọrọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Chineke achọghịkwa ka nke ahụ mee. Akwụkwọ a, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, ga-enyere gị aka izere ihe mkpọbi ụkwụ na-adabarakarị ndị ntorobịa.” Nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya ma mee ndokwa maka ịlaghachi.
6 Nghọta dị mma ga-eme ka anyị nwee ike ịmata mkpa na mmasị ndị anyị na-ezute. Ilu 16:23 na-emesi anyị obi ike banyere nke a, na-asị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.”