Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/96 p. 8
  • Okwu Chineke Na-enye Nduzi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Chineke Na-enye Nduzi
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inyefe Akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Nyefee Akwụkwọ n’Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Jiri Nghọta Kwusaa
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 12/96 p. 8

Okwu Chineke Na-enye Nduzi

1 Anyị na-ebi n’ime ụwa nke nwere ọtụtụ nsogbu na ihe ngwọta dị nnọọ ole na ole. Ọtụtụ nde mmadụ na-akwụ agụụ. Ọgwụ ọjọọ na-eri ọnụ ọgụgụ na-arị elu ahụ. Ọtụtụ ezinụlọ na-ekewasị. A na-anụ banyere idina onye ikwu na ime ihe ike ezinụlọ mgbe nile n’akụkọ. E ji nke nta nke nta na-emetọ ikuku anyị na-ekuru na mmiri anyị na-aṅụ. Ka ọ dị ugbu a, mpụ na-emetụta ọtụtụ n’ime anyị.

2 Okwu ndị ahụ bu ụzọ dị mkpa taa karịa ka ha dị ọbụna afọ ole na ole gara aga. Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmata na Okwu Chineke na-enye nduzi, na-enyekwa ihe ngwọta maka nsogbu nile na-adakwasị ha. Anyị ga-agbalị inyere ndị mmadụ aka na December site n’inyefe akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. N’ezie, nanị ịhapụrụ mmadụ akwụkwọ apụtaghị na ọ ga-anakwere nduzi Chineke. Anyị aghaghị ime nletaghachi na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible. Enyemaka bụ ihe e ji n’aka ma ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị dị otú ahụ. (Mat. 28:19, 20) Nke a bụ ụzọ iche ihe n’ihu ụfọdụ a tụrụ aro ha:

3 Ọ bụrụ na i zute onye meworo agadi, ị pụrụ ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu nke a:

◼ “Biko ka m jụọdị: Mgbe ị bụ nwata, olee otú ndị nọ n’ógbè a si emeso ibe ha? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ihe dị nnọọ iche ugbu a, ọ́ bụghị eziokwu? Gịnị ka i chere kpatara mgbanwe ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Anyị na-ahụ n’ezie mmezu nke otu amụma dị na Bible. [Gụọ 2 Timoti 3:1-5.] E wezụga ịkọwa ụwa n’ụzọ ziri ezi dị ka ọ dị taa, Bible na-ekwe nkwa ụwa ka mma n’ọdịnihu dị nso. N’ihi nke ahụ anyị na-agba mmadụ nile ume ịmụ Bible.” Gosi akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu ma rụtụ aka n’isi nke 111, nke na-akọwa amụma ọzọ anyị hụworo ka o mezuru. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.

4 Mgbe ị laghachiri na nke onye meworo agadi i nyefere akwụkwọ “Nwoke Kasị Ukwuu,” ị pụrụ ikwu, sị:

◼ “Na mgbe ikpeazụ anyị kwurịtara okwu, anyị kwekọrịtara na n’ọtụtụ ụzọ, ọha mmadụ nke oge a agbanwewo n’ụzọ ka njọ ma e jiri ya tụnyere ihe ndụ dị ka ya nanị n’ime afọ ole na ole gara aga. Otú ọ dị, m ga-achọ igosi gị na Bible na-esetịpụ atụmanya maka ụwa nke ka nnọọ mma n’ọdịnihu. [Gụọ Mkpughe 21:3, 4.] Ịmara na nke a bụ Okwu Chineke kwesịrị ịgba anyị ume ileba anya n’ihe ọzọ Bible nwere ikwu.” Sapeta akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu n’isi nke 133 ma gụọ paragraf nke 5-6. Kwuo ka unu nwee ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

5 Ọ bụrụ na gị na onye ka na-eto eto na-ekwurịta okwu, ị pụrụ ikwu, sị:

◼ “M ga-achọ ịjụ gị otu ajụjụ: Dị ka onye na-eto eto, ì chere na i nwere ihe mere ị ga-eji nwee nchekwube banyere ọdịnihu? Olee otú ọdịnihu dị nye gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’ụzọ dabara nke ọma, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee nchekwube banyere ọdịnihu. [Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.] Anyị ebipụtawo akwụkwọ a, bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, iji nyere ndị mmadụ aka irite uru site n’ịmụ banyere Jisọs na ige ya ntị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ akwụkwọ a, m ga-enwe mmasị ịhapụrụ gị otu n’ụtụ ₦240.”

6 Mgbe ị laghachiri ileta onye ka na-eto eto nke natara akwụkwọ “Nwoke Kasị Ukwuu,” ị pụrụ ịmalite site n’ikwu sị:

◼ “Enwere m mmasị ịnụ ka i kwuru otú i si nwee nchegbu banyere ọdịnihu. Cheta na m gosiri gị otu akụkụ Bible nke na-ekwe anyị nkwa ọdịnihu obi ụtọ, nke dịkwa nchebe. Nke a bụ ọzọ. [Gụọ Mkpughe 21:3, 4.] Akwụkwọ ahụ m hapụụrụ gị na-enye ihe àmà doro anya na ịchịisi Jisọs ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi. Rịba ama ihe ọ na-ekwu na paragraf nke 5 n’isi nke 133. [Gụọ.] Ọ bụrụ na ị ga-achọ, m ga-enwe mmasị ịmụrụ gị Bible n’efu.” Ọ bụrụ na e kweere ka a na-amụ ihe, mee ndokwa doro anya ịlọghachi.

7 Onye na-amaghị ebe ọ ga-echigharịkwuru maka nduzi iji nagide nsogbu nke ndụ pụrụ ịzaghachi n’ụzọ iche ihe n’ihu a:

◼ “Anyị na-ebi n’oge mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-eche nsogbu ndị siri ike ihu. Ọtụtụ ndị na-agakwuru ụdị ndị ndụmọdụ dị iche iche maka nduzi. Olee ebe i chere anyị pụrụ ịchọta ezi ndụmọdụ nke ga-abara anyị uru n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-ekwu otu ihe dị mkpa nke anyị nile kwesịrị ịghọta.” Gụọ Jeremaịa 10:23. Sapeta okwu mmalite nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu ma gụpụta paragraf nke mbụ n’okpuru isiokwu nta ikpeazụ. “Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmata otú a ga-esi wepụsịa nsogbu nile n’okpuru Alaeze Chineke. Ị̀ ga-achọ ịgụ ya?” Mgbe ahụ nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.

8 Ọ bụrụ na n’ọbịbịa nke mbụ unu kwurịtara banyere mkpa mmadụ nwere maka nduzi, ị pụrụ ịga n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ ná nletaghachi site n’ikwu, sị:

◼ “Mgbe mbụ anyị zutere, anyị kwekọrịtara na nduzi sitere n’aka Chineke dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide nsogbu dị iche iche nke ndụ. Banyere nke ahụ, echere m na ị ga-enwe mmasị n’okwu ndị e kwuru n’akwụkwọ ahụ m hapụụrụ gị. [Gụpụta isi nke 35, paragraf nke 8 na nke 11, nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu.] Enwere m obi ụtọ ịgwa gị ka anyị nwee usoro ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, adịkwa m njikere igosi gị otú e si eme ya ugbu a.”

9 Ọ bụrụ na i ji Akwukwọm nke Akukọ Bible na-eme ihe, ị pụrụ ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu nke gị, ndị e mere ka ha kwekọọ ná ndị a tụrụ aro ha n’elu. Jehova ga-agọzi mgbalị anyị ka anyị na-enyere ma ndị agadi ma ndị na-eto eto aka ịghọta abamuru nke Okwu Chineke na nduzi ya ná ndụ anyị.—Abụ Ọma 119:105.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya