Ndeba Aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
1 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke arụwo ọrụ n’ịzụ ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ. Ọtụtụ n’ime anyị na-echeta otú anyị si nwee ahụ erughị ala ma chee na anyị erughị eru mgbe mbụ anyị debara aha n’ụlọ akwụkwọ a, ugbu a kwa anyị ji obi ekele na-aghọta òkè o keere ná ntolite ime mmụọ anyị dị ka ndị ọkà okwu na ndị nkụzi nke Okwu Chineke. (Tụlee Ọrụ 4:13.) Ì debawo aha gị n’ụlọ akwụkwọ a pụrụ iche?
2 Ònye pụrụ ideba aha ya? Peji nke 73 nke Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị na-aza, sị: “Ndị nile na-esosi ọgbakọ ike pụrụ ideba aha ha, tinyere ndị malitere ịbịa nzukọ ọhụrụ, ọ bụrụhaala na ha adịghị adị ndụ nke na-ekwekọghị n’ụkpụrụ nile nke ndị Kraịst.” E setịpụrụ ụkpụrụ ndị dị otú ahụ na peji nke 98-99. Anyị na-akpọ ndị nile ruru eru òkù—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị—ịgakwuru onye nlekọta ụlọ akwụkwọ wee kwuo ka e deba aha ha.
3 Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Maka 1997: Usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke maka 1997 na-emetụtazu ọtụtụ ozizi na ndị a kọrọ akụkọ ha n’ime Bible, tinyekwara akụkọ ihe mere eme nke nzukọ a. Tụkwasị n’ịzụlite ikike ikwu okwu na izi ihe anyị, anyị na-amụta ihe site n’ọtụtụ akụ̀ ime mmụọ dị n’usoro ihe ọmụmụ ya kwa izu. (Ilu 9:9) Ọ bụrụ na anyị akwadebe maka ụlọ akwụkwọ ahụ, nke gụnyere inwe ọgụgụ Bible kwa izu, na-abịachikwa anya, anyị pụrụ inweta abamuru ime mmụọ dị ukwuu site n’usoro ihe omume ahụ.
4 Maka 1997 ihe ka ukwuu n’ọgụgụ Bible maka Ihe Omume nke 2 dị mkpirikpi karịa ka ha dị n’afọ ndị gara aga. Mgbe ọ na-akwadebe maka ihe omume a, onye mmụta ahụ kwesịrị iji nlezianya jiri oge kwadebe ihe omume ya, mgbe ahụkwa kpebie oge hà aṅaa ọ ga-eji mee ihe maka okwu mmalite na mmechi n’ime minit ise ahụ e kenyere okwu ya. Nke a ga-enye onye mmụta ahụ ohere iji oge ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu ma zụlite ma ikike ịgụ ihe ya ma nkà ikwu okwu n’ejighị ihe odide.—1 Tim. 4:13.
5 A gbakwụnyewo ịgba àmà mberede dị ka ọnọdụ okwu a pụrụ iji mee ihe maka Ihe Omume nke 3, bụ́ ndị na-adabere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’ihi ya, nwanna nwanyị pụrụ ịhọrọ nletaghachi, ọmụmụ Bible ebe obibi, ma ọ bụ ịgba àmà mberede dị ka ọnọdụ okwu maka ihe omume a. Otú ọ dị, ebe a ga-elekwasị anya kwesịrị ịnọgide bụrụ ná nkụzi dị irè ọ bụghị n’ọnọdụ okwu.
6 Ma ì nwere ihe ùgwù nke ikwu okwu izi ihe, isi ihe ndị sitere na Bible, ma ọ bụ ihe omume onye mmụta, ị pụrụ igosi ekele gị maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke site n’ịkwadebe na ịmụgharị ihe omume gị nke ọma, site n’iji ihe ido anya na ịnụ ọkụ n’obi mee ya, site n’agabigaghị oge, site n’ige ntị na itinye ndụmọdụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ n’ọrụ, na site n’ịgbalị mgbe nile iji ikwesị ntụkwasị obi na-emezu ihe omume gị. N’ụzọ dị otú a ndeba i debara aha gị n’ụlọ akwụkwọ ahụ ga-abụ ngọzi nye ma gị ma ndị nile bịaranụ.