Isi 11
Jọn Edozie Ụzọ
AFỌ 17 agasịwo kemgbe Jisọs bụ nwata dị afọ 12 nke na-ajụ ndị ozizi ajụjụ n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 29 O.A., ọ dịkwa ka à ga-asị na onye ọ bụla na-ekwu okwu banyere nwa nwanne nne Jisọs, bụ́ Jọn, onye na-arụ ọrụ nkwusa n’obodo nile dị gburugburu Osimiri Jọdan.
Jọn bụ n’ezie nwoke nke na-akpali mmụọ mmadụ ma n’ụdịdị ma n’okwu ọnụ. Uwe ya bụ ihe e ji ajị́ kamel mee, ọ na-eyikwa uwe úkwù nke e ji akpụkpọ anụ mee. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ ọhịa. Gịnị bụkwa ozi ya? “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.”
Ozi nke a na-akpali uche ndị na-ege ya ntị. Ọtụtụ n’ime ha na-aghọta mkpa ọ dị ha ichegharị, ya bụ, ịgbanwe omume ha na ịjụ ụzọ ndụ ha nke oge gara aga dị ka ihe na-adịghị mma. Ya mere, site n’ókèala nile dị Jọdan gburugburu, ọbụna site na Jerusalem, ndị mmadụ na-apụkwute Jọn n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu, ọ na-emekwa ha baptism, na-emikpu ha n’ime mmiri nke Jọdan. N’ihi gịnị?
Jọn na-eme ndị mmadụ baptism dị ka ihe àmà, ma ọ bụ ná nkwupụta nke nchegharị ha nke sitere n’ala ala obi maka mmehie nile ha mere megide ọgbụgba ndụ Iwu Chineke. Ya mere, mgbe ụfọdụ ndị Farisii na ndị Sadusii na-apụta bịaruo Jọdan, Jọn katọrọ ha. “Unu ụmụ nke ajụala,” ka o kwuru. “Mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị unu; unu echekwala ikwu n’ime onwe unu, sị, Anyị nwere Abraham ná nna: n’ihi na asị m unu, na Chineke pụrụ ime ka ụmụ tolitere Abraham site na nkume ndị a. Ma ọbụna ugbu a a na-atụkwasị anyụike na mkpọrọgwụ osisi nile: ya mere a na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ.”
N’ihi otú ndị mmadụ si na-aṅa Jọn ntị, ndị Juu zipụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị ijekwuru ya. Ndị a jụrụ ya, sị: “Gị onwe gị bụ ònye?”
Jọn kwupụtara sị, “Mụ onwe m abụghị Kraịst ahụ.”
Ha jụrụ sị, “Ị̀ bụ gịnịkwa? Gị onwe gị [ị̀] bụ Elaịja?”
Ọ zara sị, “Abụghị m.”
“Gị onwe gị ị̀ bụ Onye Amụma ahụ?”
“Ee e.”
N’ihi ya, ha siri ọnwụ na-asị: “Ị̀ bụ ònye, ka anyị wee nye ndị zitere anyị ihe ọzịza? Ị̀ sị gịnị banyere onwe gị?”
Jọn kọwara, sị: “Mụ onwe m bụ olu otu onye na-eti mkpu n’ọhịa, sị, Meenụ ụzọ Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ka o guzozie, dị ka Aịsaịa onye amụma kwuru.”
“Ọ̀ bụkwa gịnị mere ị na-eme baptism,” ka ha chọrọ ịmara, “ma ọ bụrụ na gị onwe gị abụghị Kraịst ahụ, ma ị bụghị Elaịja, ma ị bụghị Onye Amụma ahụ?”
Ọ zaghachiri sị, “Mụ onwe m na-eji mmiri mee baptism: n’etiti unu ka otu onye na-eguzo nke unu onwe unu na-amataghị, bụ́ onye ahụ nke na-abịa n’azụ m.”
Jọn na-edozi ụzọ ahụ site n’ime ka ụmụ mmadụ nwee ọnọdụ obi kwesịrị ekwesị maka ịnabata Mesaịa ahụ, onye ga-aghọ Eze. Banyere Onye nke a, Jọn na-asị: “Onye ka m ike na-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.” Ọbụnakwa na Jọn kwuru n’ezie sị: “Onye ahụ nke na-abịa n’azụ m aghọwo onye buru m ụzọ.”
N’ụzọ dị otú a, ozi Jọn nke bụ “alaeze eluigwe dị nso,” bụ dị ka ihe na-adọ ọha mmadụ aka ná ntị na ozi nke Eze ahụ Jehova họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst eruwo ịmalite. Jọn 1:6-8, 15-28; Matiu 3:1-12; Luk 3:1-18; Ọrụ 19:4.
▪ Ụdị nwoke dị aṅaa ka Jọn bụ?
▪ N’ihi gịnị ka Jọn na-eme ndị mmadụ baptism?
▪ N’ihi gịnị ka Jọn pụrụ iji ịsị na Alaeze ahụ adịwo nso?