Ọ Bụ Onye Mbuụzọ nke Mesaịa Ahụ
OTU belt akpụkpọ anụ dị asabata kekwasịrị n’elu anụ ahụ ya anwụ gbachuru. Na-eyi uwe ajị ịnyịnya ibu, ọ dị nnọọ ka onye amụma. A dọọrọ ọtụtụ ndị gaa n’ebe ọ nọ n’osimiri Jọdan. N’ebe ahụ nwoke a na-adọrọ mmasị kpọsara n’atụghị egwu na ya dị njikere ime ndị mmehie chegharịrịnụ baptism.
O juru ndị mmadụ anya! Ònye bụ nwoke a? Gịnị bụ nzube ya?
Jisọs Kraịst kwuru banyere onye a, sị: “Gịnị mere unu ji pụọ? Ịhụ onye amụma? Ee, asị m unu, onye [karịkwara] onye amụma nke ukwuu. . . . N’etiti ndị ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Baptist ukwu.” (Matiu 11:9-11) N’ihi gịnị ka Jọn ji bụrụ nwoke pụrụ nnọọ iche otú a? N’ihi na ọ bụ onye mbuụzọ nke Mesaịa ahụ.
E Buru Amụma Ọrụ Ya
Ihe karịrị 700 afọ tupu ọmụmụ Jọn, Jehova mara ọkwa na onye nke a ga na-akpọ òkù site n’ọzara, sị: “Dozienụ ụzọ Jehova, meenụ ka ụzọ a tụliri atụli guzoziere Chineke anyị n’ala ihe na-adịghị.” (Aịsaịa 40:3; Matiu 3:3) Ihe karịrị 400 afọ tupu ọmụmụ Jọn, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile kpọsara, sị: “Lee, Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.” (Malakaị 4:5) Na a mụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism ihe dị ka ọnwa isii tupu Jisọs abụghị ihe ndabata efu, nke a emeghịkwa site n’usoro okike nkịtị. Dị ka ọmụmụ nke nwa ahụ e kwere ná nkwa bụ́ Aịsak, ọmụmụ Jọn bụ ọrụ ebube, n’ihi na ndị mụrụ ya, Zekaraịa na Elizabet, agafewo afọ ịmụ nwa.—Luk 1:18.
Ọbụna tupu ntụrụ ime Jọn, mmụọ ozi Gebriel kpughere ọrụ na ụzọ ndụ ya. N’ume na mmụọ nke Elaịja, Jọn ga-echigharị ndị na-enupụ isi ihu pụọ n’ụzọ nke ọnwụ, ọ ga-akwadebekwa ha ịnabata Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Site na mgbe a mụrụ ya, Jọn gaje ịbụ onye Naziraịt, nke raara onwe ya kpam kpam nye Chineke, ọ gaghịkwa emetụ mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ dị ike aka. N’ezie, nri ya n’ọzara gụnyere “igurube na mmanụ aṅụ nke ọhịa.” (Mak 1:6; Ọnụ Ọgụgụ 6:2, 3; Luk 1:13-17) Dị ka Samuel, site na nwata e doro Jọn iche maka ije ozi dị ebube nke Chineke Kachasị Elu.—1 Samuel 1:11, 24-28.
Ọbụna aha ahụ bụ́ Jọn bụ nke Chineke họọrọ. Aha Hibru a sụgharịrị “Jọn” pụtara “Jehova Egosiwo Ihu Ọma; Jehova Adịwo Amara.”
Mgbe e biri nwa ahụ úgwù n’ụbọchị nke asatọ, Chineke nyere nna ya, bụ́ Zekaraịa, ike mmụọ nsọ ịkpọsa, sị: “Gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe nile elu: n’ihi na ị ga-aga n’ihu Onyenwe anyị idozi ụzọ Ya nile; ime ndị nke Ya ka ha mara nzọpụta n’ime mgbaghara mmehie nile ha, n’ihi obi ebere nke Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ nke sitere n’elu ga-eleta anyị n’ime ya.” (Luk 1:76-78) Ozi ihu ọha Jọn gaje ịbụ ihe kasị mkpa ná ndụ ya. E jiri ihe ndị ọzọ nile tụnyere ya, ha adịghị mkpa. N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ tụlezuru 30 afọ mbụ nke ndụ Jọn n’otu mkpụrụ amaokwu: “Nwatakịrị ahụ wee na-eto, na-esikwa ike ná mmụọ ya, o wee nọọ n’ọhịa ruo ụbọchị e weere ya gosi Israel.”—Luk 1:80.
Olu n’Ọzara
N’afọ nke 15 nke ọchịchị Taịberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet na-achị Judia, Jọn Onye Na-eme Baptism pụtara ìhè n’ọzara na-enwe ozi nke a na-akpali akpali: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 3:2; Mak 1:4; Luk 3:1, 2) A tụtere ndị bi n’ógbè ahụ dum. Mkpọsa atụghị egwu ahụ metụrụ obi ndị mmadụ nọ n’agụụ maka olileanya e ji n’aka. Ọkwa Jọn makwara ịdị umeala n’obi nke ndị mmadụ aka n’ihi na ọ kpọrọ òkù maka nchegharị sitere n’obi. Obi eziokwu ya na obi ike ya kwaliri ọtụtụ ìgwè mmadụ nwere obi eziokwu na ndị obi ha ziri ezi ile ya anya dị ka nwoke nke Chineke zitere.
Iwu ewu Jọn gbasara dị ka chi ọbụbọ nke ụbọchị ọhụrụ. Dị ka onye amụma Jehova, ọ dị mfe ịmata ya site n’uwe na nraranye ya. (Mak 1:6) Ọbụna ndị nchụàjà na ndị Livaị si Jerusalem gaa ịchọpụta ihe na-akpali mmasị a nile. Chegharịanụ? N’ihi gịnị, sitekwa na gịnị? Ònye bụ nwoke a? Ha chọrọ ịma. Jọn kọwara: “Mụ onwe m abụghị Kraịst ahụ. Ha wee jụọ ya, sị, Ị̀ bụ gịnịkwa? Gị onwe gị bụ Elaịja? Ọ sị, Abụghị m. Gị onwe gị bụ onye amụma ahụ? O wee zaa, sị, Ee e. Ya mere ha sịrị ya, Ị̀ bụ onye? ka anyị wee nye ndị zitere anyị ihe ọzịza. Ị̀ sị gịnị banyere onwe gị? Ọ sịrị, Mụ onwe m bụ olu otu onye na-eti mkpu n’ọhịa, sị, Meenụ ụzọ Onyenwe anyị ka o guzozie, dị ka Aịsaịa onye amụma kwuru. Ma ụfọdụ n’ime ha ka e zitererịị site n’etiti ndị Farisii. Ha wee jụọ ya, sị ya, Ọ̀ bụkwa gịnị mere ị na-eme baptism, ma ọ bụrụ na gị onwe gị abụghị Kraịst ahụ, ma ị bụghị Elaịja, ma ị bụghị onye amụma ahụ?”—Jọn 1:20-25.
Nchegharị na baptism bụ nzọụkwụ ndị dị mkpa maka onye ọ bụla ga-aba n’Alaeze ahụ. Ya mere, Jọn zaghachiri: ‘Mụ onwe m na-eji mmiri eme ndị mmehie chegharịrịnụ baptism, ma onye ka m na-abịa nke ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ eme unu baptism. Erughịdị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya. Kpacharanụ anya! Ọ na-ebu ihe ịfụcha ọka n’aka ya, ọ ga-ekpokọtakwa ọka ya n’ọba ya ma rechapụ ma bibie igbogbo ya n’ọkụ.’ (Luk 3:15-17; Ọrụ 1:5) N’ezie, a ga-awụkwasị ụmụazụ Mesaịa ahụ mmụọ nsọ, ma ndị iro ya ga-enwe ahụmahụ nke ọkụ nke mbibi.
A Dọọ “Mmadụ Nile” Aka ná Ntị
A kpaliri ọtụtụ ndị Juu nwere obi eziokwu n’ụzọ dị omimi site n’okwu Jọn, ha kwupụtakwara mmehie ha nke ekwesịghị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ezoghị ọnụ. Ha gosipụtara n’ihu ọha nchegharị ha site n’ikwere ka Jọn mee ha baptism n’Osimiri Jọdan. (Matiu 3:5, 6) Dị ka ihe si na ya pụta, obi ha nọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị ịnabata Mesaịa ahụ. Iji mejuo akpịrị ịkpọ nkụ ha maka ihe ọmụma nke ihe ezi omume dị iche iche Chineke chọrọ, Jọn ji ọṅụ zie ha ihe dị ka ndị na-eso ụzọ ya, ọbụna na-akụziri ha ụzọ isi kpee ekpere.—Luk 11:1.
Banyere onye mbuụzọ nke a nke Mesaịa ahụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ahụ bịara ịgba àmà, ka o wee gbaara Ìhè ahụ àmà, ka mmadụ nile wee site n’aka ya kwere.” (Jọn 1:7) Ọ bụ ya mere ụdị mmadụ nile ji bịa ịnụrụ olu Jọn Onye Na-eme Baptism ka ọ ‘na-ekwusa baptism nke nchegharị nye ndị Israel nile.’ (Ọrụ 13:24) Ọ dọrọ ndị ọna ụtụ aka ná ntị megide iji aghụghọ pụnara ndị ọzọ ego. Ọ dọrọ ndị agha aka ná ntị megide imenye onye ọ bụla ụjọ ma ọ bụ ibo ebubo ụgha. Ọ gwakwara ndị Farisii na ndị Sadusii na-eme nsọ nsọ, bụ́ ndị ihu abụọ, sị: “Unu ụmụ nke ajụala, ònye gosiri unu ka unu gbanarị iwe gaje ịbịa? Ya mere, mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị unu; unu echekwala ikwu n’ime onwe unu, sị, Anyị nwere Abraham ná nna: n’ihi na asị m unu, na Chineke pụrụ ime ka ụmụ tolitere Abraham site ná nkume ndị a.”—Matiu 3:7-9; Luk 3:7-14.
Dị ka otu ìgwè, ndị ndú okpukpe n’ụbọchị Jọn jụrụ ikwere ya ma boo ya ebubo ụgha nke inwe mmụọ ọjọọ. Ha jụrụ ụzọ nke ezi omume nke na-eduje ná ndụ agwụghị agwụ. N’aka nke ọzọ, ndị ọna ụtụ na ndị na-akwa iko bụ́ ndị mmehie kwenyere àmà Jọn, e wee mee ha baptism. Mgbe oge ya ruru, ha nakweere Jisọs Kraịst dị ka Mesaịa ahụ.—Matiu 21:25-32; Luk 7:31-33.
A Kọwaa Mesaịa Ahụ
Ruo ọnwa isii—site n’oge opupu ihe ubi ruo oge mgbụsị akwụkwọ nke 29 O.A.—onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke bụ́ Jọn dọọrọ uche ndị Juu gaa na Mesaịa ahụ na-abịanụ. Oge eruwo mgbe Eze Mesaịa ahụ ga-apụta. Ma mgbe ọ pụtara, ọ bịara n’otu mmiri Jọdan ahụ ma kwuo ka e mee ya baptism. Na mbụ Jọn jụrụ, ma e mesịa o kwere. Cheedị ọṅụ ya mgbe mmụọ nsọ dakwasịrị n’isi Jisọs, e wee nụkwa olu Jehova ka ọ na-ekwupụta nnwapụta nke Ọkpara Ya.—Matiu 3:13-17; Mak 1:9-11.
Jọn bụ onye mbụ matara Jisọs dị ka Mesaịa, ọ kọwakwaara ndị na-eso ụzọ nke ya Onye E Tere Mmanụ nke a. “Lee,” ka Jọn kwuru, “Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!” Ọ kpọsakwara, sị: “Onye a bụ Onye mụ onwe m kwuru okwu banyere Ya, sị, Otu Nwoke na-abịa n’azụ m Onye ghọworo Onye buru m ụzọ: n’ihi na Ọ bụrịị Onye mbụ n’ebe m nọ. Mụ onwe m amaghịkwa Ya, ma ka e mee Ya ka Ọ pụta ìhè nye Israel, n’ihi nke a ka mụ onwe m bịara na-eji mmiri eme baptism.”—Jọn 1:29-37.
Ọrụ Jọn sooro ozi Jisọs na-agakọ ruo ihe dị ka ọnwa isii. Nke ọ bụla n’ime ha ghọtara ọrụ nke ibe ya na-arụ. Jọn lere onwe ya anya dị ka enyi nke Onye Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ ma ṅụrịa ka Kraịst na-aba ụba ebe ya onwe ya na ọrụ ya na-ala ala.—Jọn 3:22-30.
Jisọs kọwara Jọn dị ka onye mbuụzọ ya, nke Elaịja sere onyinyo ya. (Matiu 11:12-15; 17:12) N’otu oge, Jisọs sịrị: “Iwu na Ndị Amụma dị ruo Jọn. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu a na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka ozi ọma, ụdị mmadụ ọ bụla na-agbalịsikwa ike ịbanye n’ime ya.”—Luk 16:16, NW.
Ikwesị Ntụkwasị Obi Ruo Ọgwụgwụ
E jidere Jọn ma tụọ ya mkpọrọ n’ihi na o ji nkwuwa okwu kpọsaa eziokwu. Ọ hapụghị ibu ọrụ ya nke ikpughe ọbụna mmehie Eze Herọd. N’imebi iwu Chineke, eze ahụ na-ebi ndụ ịkwa iko ya na Herodias bụ́ nwunye nwanne ya nwoke nọ. Jọn kwupụtara uche ya hoo haa ka nwoke ahụ wee chegharịa ma nata ebere Chineke.
Lee aha ihe nlereanya Jọn bụ n’okwukwe na ịhụnanya! N’iji nnwere onwe nke ya chụọ àjà, ọ nwapụtara ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova Chineke na ịhụnanya ya maka ụmụ mmadụ ibe ya. Mgbe otu afọ nke ịnọ mkpọrọ gasịrị, e bere Jọn isi dị ka ihe si n’atụmatụ Ekwensu kpalitere pụta bụ́ nke Herodias dị obi ọjọọ haziri, bụ́ onye ‘debere ihe n’obi’ megide ya. (Mak 6:16-19; Matiu 14:3-12) Ma onye mbuụzọ nke Mesaịa ahụ jigidere nguzosi ike ya n’ezi ihe nye Jehova, n’isi nso kwa a ga-akpọlite ya site ná ndị nwụrụ anwụ ịnụ ụtọ ndụ n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.—Jọn 5:28, 29; 2 Pita 3:13.