ISI NKE 73
Jọn Kwadebeere Jizọs Ụzọ
Jọn nwa Zekaraya na Elizabet ghọrọ onye amụma mgbe o toro. Jehova ji Jọn na-akụziri ndị mmadụ na Mezaya na-abịa. Jọn anọghị n’ụlọ nzukọ ma ọ bụ n’obodo na-akụziri ndị mmadụ ihe, kama ọ nọ n’ala ịkpa. Ndị mmadụ si na Jeruselem na Judia niile na-abịa ka Jọn kụziere ha ihe. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ka obi dị Chineke mma, ha kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ọtụtụ ndị gechara Jọn ntị, ha chegharịrị, ya emeekwa ha baptizim n’Osimiri Jọdan.
Jọn adịghị okomoko. Ọ na-eyi uwe e ji ajị kamel mee. Ihe ọ na-eri bụ igurube na mmanụ aṅụ. Ndị mmadụ nọ na-achọ ịma onye Jọn bụ. Ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ndị mpako, gakwudịịrị ya. Jọn gwara ha, sị: ‘Unu kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ unu na-eme ma chegharịa. Unu echela na unu pụrụ iche naanị maka na unu na-asị na unu bụ ụmụ Ebreham. Ọ bụghị ya ga-eme ka unu bụrụ ụmụ Chineke.’
Ọtụtụ ndị Juu gakwuuru Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Olee ihe anyị ga-eme ka obi dị Chineke mma?’ Jọn gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu nwere uwe ime abụọ, chịnyenụ onye na-enweghị otu.’ Ị̀ ma ihe mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mara na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe dị Chineke mma, ha ga-ahụrịrị ndị mmadụ n’anya.
Jọn gwara ndị ọnaụtụ, sị: ‘Na-ekwunụ eziokwu, unu aghọgbukwala onye ọ bụla.’ Ọ gwakwara ndị amị, sị: ‘Unu anala aka azụ, unu aghakwala ụgha.’
Ndị nchụàjà na ndị Livaị gakwukwaara Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye? Mmadụ niile chọrọ ịma onye ị bụ.’ Jọn gwara ha, sị: ‘Abụ m onye na-eti mkpu n’ala ịkpa. Ana m eduru ndị mmadụ ka ha bịakwute Jehova, otú Aịzaya buru n’amụma.’
Ihe Jọn na-akụzi masịrị ndị mmadụ. Ọtụtụ ndị nọ na-eche ma Jọn ọ̀ bụ Mezaya ahụ. Ma, ọ gwara ha, sị: ‘Onye ka m na-abịa. Erughịdị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ ga-eji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’
“Nwoke a bịara ka ọ bụrụ onye àmà, ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ, ka ụdị mmadụ niile si n’aka ya kwere.”—Jọn 1:7