Inyefe Akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
1 Akwụkwọ ahụ, bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, na-atọ anyị ụtọ mgbe nile. Ndị nwere obi eziokwu na-enwe mmasị n’akwụkwọ ahụ, o nyewokwara ọtụtụ aka iwere nguzo ha maka Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism. Ọ na-ewepụta eziokwu ahụ n’ụzọ dị mma. A haziri akwụkwọ ahụ inyere ndị mmadụ aka ịbịa n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu ngwa ngwa. Na December anyị ga-enwekwa ohere ọzọ inyefe akwụkwọ a n’ókèala anyị. Ọzọ, anyị aghaghị ime nletaghachi na nke ndị gosiri mmasị. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu iji kpalie mmasị ma tọọ ntọala maka nletaghachi?
2 Nke a bụ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke pụrụ ịmasị onye okwukwe ya na Chineke na-esikwaghị ike:
◼ “Ọtụtụ ndị tolitere na-ekwere na Chineke, ma ugbu a ha achọpụtawo na okwukwe ha abụkwaghị ihe ọ bụbu. Gịnị ka i chere pụrụ ịkpatawo nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] A na-ewusi okwukwe anyị nwere na Chineke ike site n’ịtụle ihe ndị dị ebube dị n’eluigwe na ala. [Gụọ Abụ Ọma 19:1.] Onye iwu ya na-achịkwa ihe ndị a dị n’igwe enyewokwa anyị ntụzi bara uru. [Gụọ Abụ Ọma 19:7-9.] Amaokwu ndị a na-emesi ike otú o si dị mkpa ịmụta ihe nile anyị nwere ike ịmụta banyere Chineke na nzube ya. [Dọrọ uche gaa n’ihe osise dị na peji nke 4-5, gụpụtakwa okwu nkọwa ya.] Ọ bụrụ na ị ga-achọ irite uru n’ihe ọmụma a pụrụ iche, ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị akwụkwọ a n’ụtụ ₦55.”
3 Ọ bụrụ na ị gwaburu onye na-enweghị okwukwe na Chineke okwu ma o gositụrụ mmasị, ị pụrụ ịmalite site n’imepe akwụkwọ ahụ gaa n’ihe osise dị na peji nke 4-5, na-asị:
◼ “Mgbe m bịaburu ebe a, anyị kiriri ọmarịcha ihe osise a nke gburugburu ebe mara mma. Okwu nkọwa ya na-ajụ sị, ‘Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji nweta ha?’ Olee otú ị ga-esi zaa nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’ụzọ doro anya, Bible na-eme ka a mata otu n’ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ a chọrọ. [Gụọ Jọn 17:3.] Ihe ọmụma dị mkpa maka okwukwe anyị n’ebe Chineke nọ. Ụzọ magburu onwe ya anyị pụrụ isi mụta ihe dị anyị mkpa ịma bụ iji nwayọọ nwayọọ na-amụ Bible.” Sapeta isi nke 1 ma rụtụ aka n’echiche ụfọdụ na-agba ume na paragraf nke 1-5. Kọwaa ụzọ e si eduzi ọmụmụ Bible, kwuokwa na ị ga-alaghachi maka inwekwu nkwurịta okwu.
4 N’iburu akụkọ nke ihe mere ọhụrụ na-akpata obi erughị ala n’uche, ị pụrụ ịsị:
◼ “Ikekwe ị nụrụ banyere [kwuo ihe mere]. Ọ̀ dịwo mgbe i chere ma Chineke ọ̀ na-eche n’ezie banyere ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ anyị na-ahụ gburugburu anyị ma ọ bụ ọbụna ndị anyị na-enweta n’onwe anyị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-enyere anyị aka gabiga oge ahụhụ.” Gụọ akụkụ ụfọdụ nke Abụ Ọma 72:12-17. Sapeta akwụkwọ Ihe Ọmụma na peji nke 70, gosikwa na ọ na-aza otu ajụjụ nke ọtụtụ nde mmadụ jụworo, N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Mgbe ahụ gaa n’ihu site n’ịsị, “Ị ga-ahụ na azịza Bible nye ajụjụ ahụ na-akasi nnọọ obi. M ga-achọ ịhapụrụ gị akwụkwọ a n’ụtụ ₦55 ka i wee gụọ ya n’onwe gị.”
5 Ọ bụrụ na ị laghachi ịga n’ihu ná nkwurịta okwu maka ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị, ị pụrụ ịsị:
◼ “Mgbe ikpeazụ m bịara ebe a, anyị kwurịtara banyere [ihe ọ bụla meburunụ]. Ajụjụ banyere ihe mere Chineke ji kwere ka oké nhụjuanya dịrị n’ụwa bilitere. Olee ihe i kwubiri? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ na-agba ume ịma na ọ bụghị Chineke na-akpata ọnọdụ dịgasị otú ahụ na-akpata ahụ erughị ala.” Sapeta peji nke 71-72 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, tụleekwa ụfọdụ n’echiche Akwụkwọ Nsọ a tụlere na paragraf nke 3-5. Kwuo na ị ga-alaghachi ọzọ iji kọwaa ihe mere anyị pụrụ iji jide n’aka na nkwere Chineke kwere ka nhụjuanya dịrị ga-abịa ná njedebe n’isi nso.
6 Ọ bụrụ na i zute nne ma ọ bụ nna, ị pụrụ ilekwasị anya n’ezinụlọ:
◼ “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nne na nna na-ekwenye na e nwere ọtụtụ nsogbu n’ịgbalị ịnọgide na-ebi ndụ ezinụlọ nke obi ụtọ. Gịnị ka ị na-ahụ bụ́ oké ihe mgbochi? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-eme ike anyị nile, ma anyị na-enwekarị mmasị n’enyemaka ga-enyere anyị aka inweta ihe ka mma. Bible na-enye ndụmọdụ magburu onwe ya. [Gụọ akụkụ ụfọdụ nke Ndị Kọlọsi 3:12, 18-21.] Bible nwere ihe ka ukwuu ikwu n’isiokwu a, dị ka e depụtara n’isi nke 15 n’akwụkwọ a, isiokwu ya bụ ‘Iwulite Ezinụlọ nke Na-asọpụrụ Chineke.’ Ọ na-atụleghachi ndụmọdụ e nyere na Bible ndị na-egosi ụzọ isi belata nrụgide alụmdi na nwunye na ụzọ isi nagide nsogbu na-eche ụmụ anyị ihu. O doro m anya na ị ga-enwe mmasị ịgụ ya.”
7 Ọ bụrụ na ị na-alaghachi ileta nne ma ọ bụ nna na-eche banyere nsogbu ezinụlọ, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “Amaara m na, dị ka onye mụrụ ụmụ, ị chọrọ ihe kasị mma maka ụmụ gị. Ebe ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ichebe ha pụọ n’ihe nile dị njọ, ị ghaghị izi ha ụzọ isi nagide nsogbu ndị dị ná ndụ. Olee otú i chere a pụrụ isi mee nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Otu n’ime ihe kasị mkpa onye mụrụ ụmụ pụrụ inye bụ ọzụzụ.” Sapeta peji nke 145-146 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, dọrọkwa uche gaa na ndụmọdụ Bible dị irè, na-emesi ịdị mkpa ya ike na ụzọ ịgbaso ya pụrụ isi weta ngọzi. Kwuo na ị ga-alaghachi ọzọ igosi ụzọ e si eji akwụkwọ a eme ihe iji mụtakwuo ihe banyere inweta ndụ ezinụlọ nke obi ụtọ.
8 N’ezie akwụkwọ a bụ ihe dị ebube sitere n’aka Jehova maka ime ka ọrụ nchịkọbata ahụ ‘gaa ọsọ ọsọ’ na mgbe ikpeazụ a. (Aịsa. 60:22) Ọ bụrụ na anyị ejiri ya mee ihe n’ụzọ dị irè, anyị pụrụ inyefe ihe ọmụma nke pụrụ inyere mmadụ aka gaa n’inweta ndụ ebighị ebi.