Ilu
4 Jehova na-eme ka ihe niile mezuo nzube ya,
Ka e wee bibie ndị ajọ omume n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.+
5 Jehova kpọrọ onye ọ bụla dị mpako asị.+
Ka obi sie gị ike na a ga-atarịrị ya ahụhụ.
6 Ịhụnanya na eziokwu na-eme ka a gbaghara mmehie,+
Ịtụ egwu Jehova na-emekwa ka mmadụ kwụsị ime ihe ọjọọ.+
8 Ọ ka mma mmadụ inwe obere ihe ma bụrụ onye ezi omume+
Kama mmadụ ịkpataju akụ̀ ma ya abụrụ na ọ naghị akwụwa aka ọtọ.+
10 Eze kwesịrị ịna-ekwu ihe Chineke kpebiri.+
O kwesịghị ikpe ikpe na-ezighị ezi.+
11 Ọ bụ Jehova nwe ihe dị iche iche zuru ezu e ji atụ̀ ihe.
Ọ bụ ya mere ka e nwee ihe niile e ji atụ̀ otú ihe dịruru arọ.+
13 Obi na-atọ ndị eze ụtọ ma mmadụ kwuo ihe dị mma.
Ha hụrụ onye na-ekwu eziokwu n’anya.+
15 Onye eze lere anya ọma ga-adị ndụ.
Amara ya dị ka mmiri na-ezo n’ụla mmiri.+
16 Ọ kacha mma ka mmadụ nweta amamihe kama inweta ọlaedo.+
Ọ ka mma ka mmadụ họrọ ịghọta ihe kama ịhọrọ ọlaọcha.+
17 Ndị ezi omume anaghị etinye aka n’ihe ọjọọ.
Onye ọ bụla nke na-echebara otú o si ebi ndụ echiche na-echebe ndụ* ya.+
19 Ọ ka mma na mmadụ wedara onwe ya ala soro ndị dị umeala n’obi nọrọ+
Kama mmadụ iso ndị mpako kee ihe ha kwatara.
20 Ihe ga-agaziri mmadụ ma ọ bụrụ na e nwee okwu pụtaranụ, ya akpaa àgwà gosiri na ọ na-aghọta ihe,
Onye tụkwasịrị Jehova obi na-enwekwa obi ụtọ.
21 A ga-ewere onye ma ihe ka onye na-aghọta ihe.+
Onye na-ekwu okwu ọma na-ekwu ihe* na-eru mmadụ n’obi.+
22 Ịghọta ihe na-eme ka mmadụ dị ndụ,
Ma ahụhụ ndị nzuzu na-ata bụ na ha ga na-ezuzu nzuzu.
24 Okwu ọma dị ka ezigbo mmanụ aṅụ.
Ọ na-atọ ụtọ, na-agwọkwa mmadụ.*+
26 Agụụ nke na-agụ* onye ọrụ na-eme ka ọ rụrụ ọrụ na-aga,
N’ihi na ọ na-arụsi ọrụ ike ka o nweta ihe ọ ga-eri.+
27 Onye nzuzu na-akpa nkata ọjọọ.+
Okwu ya na-erekwa ka ọkụ nke na-enwusi ike.+
29 Onye tigbuo zọgbuo na-arata onye agbata obi ya
Ma duba ya n’ụzọ ọjọọ.
30 Ọ na-atabi anya ya mgbe ọ na-akpa nkata ọjọọ.
Ọ na-atagide egbugbere ọnụ ya ezé ma ọ rụwa arụrụala o chepụtara.