Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/96 p. 1
  • Oge Agbanwewo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Agbanwewo
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Kwusaa Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 4/96 p. 1

Oge Agbanwewo

1 Bible na-agwa anyị na “ọnọdụ ụwa nke a na-agbanwe.” (1 Kọr. 7:31, NW) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu taa! Ọbụna n’oge ndụ anyị, anyị ahụwo oké mgbanwe dị iche iche n’echiche na àgwà ụmụ mmadụ n’ọkwá ọ bụla nke ọha mmadụ. Ọ bụrụ na anyị gaje inwe ihe ịga nke ọma n’iwegara ha ozi Alaeze ahụ, ụzọ anyị si ejekwu mmadụ aghaghị ikwekọ n’oge ndị na-agbanwenụ. Anyị chọrọ izi ozi ọma ahụ n’ụzọ ọ ga-esi dọrọ mmasị ndị mmadụ ma ruo n’obi ha.

2 Ọtụtụ afọ gara aga, ọrụ ịgba àmà ahụ dị iche n’ọtụtụ ala n’ihi na, n’akụkụ ka ukwuu, ndị mmadụ biri ndụ dị jụụ karị, ha nwekwaa echiche nke ịnọ ná ntụkwasị obi. Okpukpe nwere ọnọdụ dị nsọ ná ndụ ha. E ji Bible kpọrọ oké ihe. N’ụbọchị ndị ahụ ịgba àmà na-agụnye ịgbagha arụmụka n’okwu ozizi n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge nile. Taa, ndụ ndị mmadụ nọ n’ọgba aghara. A na-akwa okpukpe emo ná mba ụfọdụ. Ole na ole nwere okwukwe na Bible. N’ebe ndị a, nchepụta evolushọn ebibiwo okwukwe na Chineke.

3 Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Ugbu a, dị ka o yiri, e nwere nnọọ ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike ná ndụ ndị mmadụ nke na anyị aghaghị ịkụziri ha ụzọ isi bie ndụ.” Ihe ndị kasị echegbu ụmụ mmadụ ugbu a bụ ihe ndị na-emetụta ha onwe ha, ezinụlọ ha, na nchekasị ha. Ndị a bụ ihe ndị ha na-ekwukarị banyere ha mgbe ha nọkọrọ. Ọ dị anyị mkpa iburu nke ahụ n’uche n’ọrụ ịgba àmà anyị.

4 Alaeze Chineke Bụ Nanị Olileanya E Ji n’Aka Maka Ọdịnihu: Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere nchekwube dị nta na gọọmenti mmadụ. Ha na-eche na e nweghị olileanya ọ bụla maka ịhụ ụwa ka mma n’oge ndụ ha. Okpukpe ụgha adawo ada n’inye ha ihe ndabere ọ bụla maka olileanya. Ọ bụ ya mere mkpa kasị ukwu nke ihe a kpọrọ mmadụ ji bụrụ ịnụ ozi ọma banyere Alaeze Chineke. Gosi ụzọ ọ ga-esi mesịa nye ihe ngwọta maka nsogbu nile na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu.

5 Bible Bụ Nanị Isi Iyi Kwesịrị Ndabere Maka Nduzi: Ndị ndú na-adabere n’amamihe mmadụ na nkà ihe ọmụma ụwa eduhiewo ìgwè mmadụ nke taa. Ndị mmadụ ka gaje ịghọta na “ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jer. 10:23) Ihe mmụta kasị baa uru ha pụrụ ịmụta bụ na ha aghaghị ‘ịtụkwasị Jehova obi ha nile, gharakwa ịdabere ná nghọta ha.’ (Ilu 3:5) Ọ bụ ezie na oge agbanwewo, Bible agbanwebeghị. N’ihi ya, n’ozi anyị, anyị kwesịrị mgbe nile iji Okwu Chineke mee ihe, na-akụziri ndị ọzọ inwe ekele maka nduzi ya sitere na mmụọ nsọ, n’aka Chineke. (2 Tim. 3:16, 17) Iji mezuo nzube ahụ, anyị aghaghị isetịpụ ịdị mkpa nke Bible n’ihu ndị mmadụ site n’izo aka na ya n’okwu anyị, na-eji ya aza ajụjụ ha, ma na-akwalite mkpa ọ dị ịmụ ya na itinye amamihe ya dị irè n’ọrụ.

6 Ọbụna n’oge ndị a na-agbanwe, ebumnobi anyị n’ozi ahụ nọgidere na-abụ otu ihe ahụ. Anyị gaje ikwusa ozi ọma nke Alaeze, wulite obi ike n’Okwu Chineke, ma nyere ndị ọzọ aka ịhụ mkpa nke iso anyị mụọ Bible. Ihe anyị na-ekwu aghaghị imetụta mkpa ndị anyị na-agbara àmà nwere n’oge ọ bụla. Site n’ime nke a, anyị pụrụ ịghọ ndị so ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ wee si otú ahụ rite ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’uru.—1 Kọr. 9:19, 23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya