Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
“JEHOVA, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.”—Jeremaịa 10:23‚ 24.
Jeremaịa so dee Bible dere okwu ndị ahụ ihe dị ka narị afọ 25 gara aga. Ọnọdụ jọbigara njọ ókè nke ihe a kpọrọ mmadụ mgbe ọtụtụ puku afọ nke itinye nduzi ụmụ mmadụ n’ọrụ gasịrị na-anwapụta eziokwu na-enweghị mgbagha nke okwu a. Ma ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee ebe a pụrụ ịchọta nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi?’
Akụkụ akwụkwọ nsọ e hotara n’elu na-atụ aka n’isi iyi nke nduzi na ntụzi a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke karịrị nke mmadụ nke ukwuu—Onye Okike mmadụ, bụ́ Jehova Chineke. N’eziokwu ọ dịghị onye maara otú e si mee mmadụ na mkpa ya dị iche iche karịa Onye Okike anyị. Ka o sina dị, Chineke ò nwere mmasị inye anyị nduzi na ntụzi dị otú ahụ? Olee otú o si eme ya? Ọ̀ dị irè maka oge anyị?
Ndị E Mere Ịnata Nduzi Chineke
A maara nke ọma na otu ọdịiche bụ isi na-ekewapụ mmadụ n’ebe anụmanụ dị dabeere n’ọdịdị, ikike, na ịrụ ọrụ nke ụbụrụ mmadụ. N’anụmanụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ nile ụbụrụ na-arụ ka a haziworo n’ihe a nọworo na-akpọ amamihe sitere n’okike. Nke a abụghị otú ọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ.—Ilu 30:24-28.
N’adịghị ka ụbụrụ ụmụ anụmanụ, akụkụ dị ukwuu nke ụbụrụ mmadụ enweghị usoro ihe omume a hazinyere n’ime ya. Chineke nyere ụmụ mmadụ ikike nke nnwere onwe ime nhọrọ, na-eme ka o kwe ha omume ime mkpebi ndị ọgụgụ isi dị na ha na igosipụta àgwà ndị ka elu, dị ka ịhụnanya, mmesapụ aka, achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ikpe ziri ezi, na amamihe.
Ezi uche ọ̀ dị n’iche na Chineke ga-eke mmadụ nye ya ike ụbụrụ dị otú ahụ n’enyeghị ya ụdị nduzi ụfọdụ banyere ụzọ a pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ kasị mma? Chineke nyere ndị mmadụ mbụ nduzi kpọmkwem. (Jenesis 2:15-17, 19; 3:8, 9) Ọbụna mgbe mmadụ dabasịrị ná mmehie, Jehova nọgidere na-eduzi ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, n’ụzọ kasị dị ịrịba ama site n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 119:105) Nke a emewo ka o kwe ụmụ mmadụ omume inwe ihe ịga nke ọma n’iche nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị ná ndụ ihu ka ha na-eji ike ime nhọrọ ha eme ihe n’amamihe.
Bible Isite n’Aka Chineke
Gịnị na-eme Bible isi iyi a pụrụ ịtụkwasị obi maka nduzi? Otu ihe bụ na ọ na-enye ihe ọmụma nke nanị Onye Okike ahụ pụrụ inye. Ọ na-edepụta akụkọ ihe ndị mere ogologo oge tupu mmalite nke ndụ mmadụ. Iji maa atụ, ọ na-akọ akụkọ otú e si kwadebe ụwa n’ụzọ na-aga n’usoro n’usoro ruo mgbe ọ dịrị mma ịkwado ndụ mmadụ. (Jenesis, isi nke 1‚ 2) Ọ bụ ezie na e dekọrọ nke a na Bible ihe karịrị 3‚000 afọ gara aga, o kwekọrọ n’echiche nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ.
Ogologo oge tupu ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya anakwere na ụwa dị okirikiri, Bible kwupụtara, sị: “[Chineke] na-esetị Ugwu n’elu ebe tọgbọrọ n’efu, Ọ na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) Ọzọkwa, Bible na-ekpughe na ọ dị “Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa, ndị bi n’ime ya ewee dị ka ogugu.” (Aịsaịa 40:22) Nanị Chineke, Onye Okike, pụrụ inyeworị nkọwa nke a.
Ikike ibu ụzọ hụ ihe ga-eme eme abụghị onyinye e nyeworo mmadụ. Kama nke ahụ, Onye Okike na-akọ ọdịnihu site na peji dị iche iche nke Bible. Chineke kpaliri Aịsaịa onye amụma ide banyere Ya, sị: “Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otù efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.”—Aịsaịa 46:9‚ 10.
Bible egosipụtawo na ya pụrụ ịkọ ikpeazụ site ná mbụ n’izi ezi na-atụ n’anya. Dị ka ihe atụ, o buru amụma mbili, ọdịda, na mjimara dị iche iche nke ike ụwa ndị bụ isi n’ime ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. E dere amụma ndị a dị ịrịba ama ọtụtụ narị afọ tupu mmezu ha, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọtụtụ puku afọ tupu ha emee. Otú a Bible na-ebu amụma n’izi ezi ihe ndị na-eme n’oge a, nakwa ihe ikpeazụ ha ga-abụ. Bible pụkwara iche n’ihi na ọ na-ezo aka n’ụzọ nlanarị n’oge mbibi nke gọọmenti dị iche iche nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè hiwere n’Amagedọn, “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” Alaeze Chineke n’aka Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, ga-emezu ihe omume ahụ dị ukwuu.—Mkpughe 16:14, 16; 17:9-18; Daniel‚ isi nke 2‚ 8.
Ọ Na-aba Uru Mgbe Nile—Ọ Dịghị Mgbe Ọ Na-emerụ Ahụ
Amamihe nkịtị nke mmadụ ezughị okè; n’ihi ya, ndụmọdụ mmadụ adịghị aba uru mgbe nile, ọ bụ ezie na a pụrụ inye ya n’ezi nzube. Ọ dịghị otú ahụ n’ebe ndụmọdụ Bible dị. Chineke n’onwe ya na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, . . . Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17‚ 18.
Nduzi Chineke na-enyere anyị aka idebe ihe n’usoro ịdị mkpa ma rapagidesie ike n’ụkpụrụ ndị ka elu ná ndụ. Ka ọha mmadụ nke oge a na-ekwusi okwu ike banyere ihe ndị a na-ahụ anya na ihe mgbaru ọsọ ndị a rụzuru, Bible na-emesi ike otú o si dị mkpa nye anyị ‘ịhapụ ile ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.’ (2 Ndị Kọrint 4:18) N’ụzọ dị otú a a na-agba anyị ume inwe ihe mgbaru ọsọ ndị kachasị mma ná ndụ, ya bụ, ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’ihe banyere ime uche Chineke, ihe mgbaru ọsọ ikpeazụ na-abụ nke ndụ ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume.
Ka onye Kraịst na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị a e buliri elu, ndụmọdụ Bible na-enyere ya aka ibi ụdị ndụ kasị mma a pụrụ ibi n’usoro ihe ọjọọ nke a. Amamihe mmadụ nke oge a yiri ka ọ na-agba ume nkà ihe ọmụma nke rụọ ọrụ dịkarịsịrị nta ma nweta ihe kasịnụ. N’aka nke ọzọ, Bible na-agwa anyị na “ogbenye ka onye ji ọbụ aka umengwu arụ ọrụ ga-abụ: ma aka ndị dị nkọ na-eme ọgaranya.” Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Anyị kwere na anyị nwere akọ na uche ọma, ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.”—Ilu 10:4; Ndị Hibru 13:18.
Bible na-enyekwa okwu ndụmọdụ dị irè maka ndokwa ezinụlọ. Ọ na-esetịpụ kpọmkwem òkè nke ma di ma nwunye ná ndokwa alụmdi na nwunye, nakwa ụzọ ziri ezi isi zụlite ma zie ụmụaka ihe. Ọ na-asị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. . . . Ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya. Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu . . . Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” Ịgbaso okwu ndụmọdụ ka elu nke Onye Okike ahụ na-etinye ihe dị ukwuu n’ịkwụrụ chịm na obi ụtọ nke ezinụlọ dị iche iche.—Ndị Efesọs 5:21–6:4.
Ọdịnihu Dị Nchebe Maka Ndị Na-agbaso Nduzi Chineke
Okwu Chineke e dere ede na-egosipụta ihe ngwọta Chineke nwere maka nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’isi nso nnọọ Jehova Chineke ga-ewepụsị usoro ihe dị ugbu a, ya na ihe mgbu ya nile, ikpe na-ezighị ezi na nhụsianya, ọ ga-ejikwa usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume ya dochie ya. Bible na-akọwa nke a na 2 Pita 3:7-10, na-ekwukwasị n’amaokwu nke 13, sị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” Nke a na-emejupụta ozi kachasị ndị ọzọ nile mma nke ukwuu, bụ́ nke a pụrụ izi ezinụlọ mmadụ. Ọ bụ kpọmkwem ozi nke Bible na-ezi na nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ihe karịrị 200 ala na agwaetiti dị iche iche nke oké osimiri.
Mgbe a na-eme uche Chineke n’ụwa nile, ezinụlọ mmadụ dum ga-erite uru site n’ịgbaso ọmarịcha nduzi nke Onye Okike ya, bụ́ Jehova. A gaghị enwekwa nsogbu nile nke ịda ogbenye, mpụ, na ọgwụ ọjọọ. A gaghị ejikwa ọrịa, nká, na ọnwụ tie ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. A ga-ebuli ezinụlọ mmadụ elu gaa n’izu okè nke nne na nna anyị mbụ nwere tupu ha enupụ isi megide nduzi Chineke.
Lee ka akwụkwọ ikpeazụ nke Bible si chịkọta nke ọma ọnọdụ obi ụtọ nke ndị tinyere ntụkwasị obi ha ná nduzi Chineke! Mkpughe 21:4‚ 5 na-asị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” Onye Okike anyị bịanyere aka ná nke ahụ, na-asị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” O kwukwasịrị, sị: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
Ọ bụrụ na anyị gaje ịnata ngọzi ndị a, gịnị ka Chineke na-atụ anya n’aka anyị? Pọl onyeozi na-akọwa na uche Chineke bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ndịàmà Jehova ji obi ọma na-akpọ gị òkù inweta ezi ihe ọmụma ahụ nke eziokwu site n’ọmụmụ Bible n’ụzọ chiri anya. Site n’iji ịdị uchu na-amụ banyere uche Chineke, gị onwe gị kwa pụrụ isite n’ahụmahụ chọpụta na amamihe Chineke bụ nanị ihe nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi n’oge ndị a siri ike. Ịdị ngwa nke oge ndị a na-eme ka ọ dị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịgbaso ya!