Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 3 p. 21-29
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ KA Ị GA-ACHỌTA?
  • BIBLE​—⁠Ò SITERE N’EBEE?
  • [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Akwụkwọ nke Na-ekpughe Ihe Ọmụma Chineke
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ezi Ozizi nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 3 p. 21-29

Isi 3

Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?

1-5. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya na Chineke enyewo akwụkwọ nduzi?

GỊNỊ na-egbochi gị inwe obi ụtọ? Ọ̀ bụ nsogbu ndị ị na-eche ihu? Ndị a pụrụ ịbụ ihe ndị metụtara nanị onwe onye​—⁠na-agụnye ahụ ike, ego, mmekọahụ, ezinụlọ gị. Ha pụrụ ịgụnye ihe ize ndụ nke mpụ, ụkọ nke ihe ndị dị mkpa ná ndụ, enweghị afọ ojuju n’ọrụ, mbunobi, iyi egwu nke agha. Ee, ọtụtụ ndị nwere nsogbu ndị na-egbochi obi ụtọ.

2 N’agbanyeghị mgbalị nile nke mmadụ ndị kasị gụọ akwụkwọ na ndị kasị nwee ahụmahụ, nsogbu ndị ahụ na-anọgide ma na-aka njọ. Ihe e deworo ogologo oge gara aga aghọwo eziokwu: ‘Ụzọ mmadụ adịghị n’aka ya onwe ya, ọ dịghị n’aka mmadụ onye na-eje ije iduzi nzọụkwụ ya.’a Ọ́ bụghị ihe pụtara ìhè na anyị chọrọ nduzi site n’isi iyi nke nwere amamihe karịa mmadụ ma ọ bụrụ na anyị na-ele anya inweta obi ụtọ na-adịgide adịgide? Ma olee ebe e nwere nduzi dị otú ahụ?

3 Ọtụtụ ndị kwere na n’ụzọ ụfọdụ, mbara igwe na ala bụ ‘akwụkwọ nke okike’ nke na-agba àmà na e nwere Onye Okike. Otu eze oge ochie bụ onye Hibru kwenyere, na-ede, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.” O kwukwara na Onye Okike ahụ enyewo ihe ọmụma n’akwụkwọ e dere ede n’ezie nke pụrụ ‘ime ka onye na-enweghị uche mara ihe’ ma nwee ọṅụ.b

4 Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nwere ikike nzirịta ozi​—⁠ọbụna isi na mbara igwe na-ezite ozi n’ụwa​—⁠ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Onye Okike mmadụ pụrụ imekwa otú ahụ? Ọzọkwa, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe banyere ụwa, bụ́ ndị na-enye ihe àmà nke mmasị O nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, ọ bụ ihe kwere nghọta na ọ ga-achọ inyere ụmụ mmadụ aka. Ya ime otú ahụ ga-ekwekọ n’ihe anyị na-ahụ n’ezinụlọ ndị na-ahụ n’anya: ndị mụrụ ụmụ na-enyefe ụmụ ha ihe ọmụma na nduzi. Ma olee otú Onye Okike mmadụ ga-esi mee otú ahụ maka ọdịmma anyị?

5 Eri ogologo oge, ide ihe abụrụwo ụzọ magburu onwe ya isi nyefee ihe ọmụma n’ụzọ ziri ezi ma na-adịgide adịgide karị. Ihe e dere ede yiri ka ọ ga-enwe ndehie dị ala karịa ozi nke a na-ekesa nanị site n’okwu ọnụ. Ọzọkwa, a pụrụ ibipụta otu akwụkwọ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu ma sụgharịa ya ka ndị na-asụ asụsụ ọ bụla nwee ike ịgụ ozi dị na ya. Ọ̀ bụ na o yighị ihe ezi uche dị na ya na Onye Okike anyị ejiriwo ụzọ dị otú a mee ihe iji nye ihe ọmụma?

6-9. Olee ihe ndị mere a ga-eji tụlee Bible?

6 Karịa ihe odide ọ bụla ọzọ nke okpukpe, e lewo Bible anya dị ka ụzọ Onye Okike anyị siworo gwa anyị okwu, n’ihi nke a kwa, e kesawo ya n’ụzọ dị nnọọ ukwuu. Nke a kwesịrị ịrịba ama. Ọ bụrụ na Onye Okike mmadụ ga-ewepụta akwụkwọ nke nwere ozi ya nye mmadụ nile, anyị ga-atụ anya na a ga-eme ka o rute mmadụ nile. A na-eme Bible otú ahụ. A pụrụ ịgụ ya n’asụsụ nke 97 pasent nke ndị bi n’ụwa. Ọ dịghị akwụkwọ okpukpe ọ bụla ọzọ e bipụtaworo ma kesaa n’ọtụtụ narị nde ọnụ ọgụgụ otú ahụ.

7 N’ezie, Bible bụ akwụkwọ okpukpe nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. N’ihi gịnị? A malitere ide ya n’oge dị nso ná mmalite nke mmepeanya. Ọ bụ ya bụ nanị akwụkwọ dị nsọ nke na-akọ akụkọ ihe mere eme nke ihe nile a kpọrọ mmadụ laa azụ ná mmalite ya. Ọ na-ekwukwa banyere nzube Chineke inye ndị sitere ná “mba nile nke ụwa” ohere inweta ngọzi ndị na-adịgide adịgide.​—⁠Jenesis 22:⁠18.

8 Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-akpọ Bible “nchịkọta nke akwụkwọ ndị kachasị nwee mmetụta n’akụkọ ihe mere eme mmadụ.” O nwewo mmetụta kachasị gbasazuo ebe nile n’akụkọ ihe mere eme nke ihe odide ọ bụla dị nsọ. N’ihi nke a, o ziri ezi ikwu na ọ dịghị onye a pụrụ ile anya dị ka onye gụrụ akwụkwọ nke ọma ma ọ bụrụ na ọ gụbeghị Bible.

9 Ma ụfọdụ ndị ezerewo Bible. N’ihi gịnị? Mgbe mgbe ọ na-abụ n’ihi omume nke ụmụ mmadụ na mba ndị na-asị na ha na-agbaso Bible. N’ala ụfọdụ a na-ekwu na Bible bụ akwụkwọ nke na-eduje n’agha, na ọ bụ akwụkwọ nke na-akwado ọchịchị ndị ọcha, ma ọ bụ na ọ bụ ‘akwụkwọ ndị ọcha.’ Ma ndị a bụ echiche na-ezighị ezi. E dere Bible n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ọ dịghị akwado agha ndị ahụ a lụrụ iji nweta mba ndị a ga-achị na iji anyaukwu na-erigbu ndị ọzọ, bụ́ ndị e meworo n’aha nke Iso Ụzọ Kraịst. N’ụzọ megidere nke ahụ, site n’ịgụ Bible ị ga-ahụ na ọ kagburu kpam kpam ọchịchọ onwe onye nke ịlụ agha, omume rụrụ arụ na irigbu ndị ọzọ. Nsogbu ahụ dị n’aka ndị anyaukwu, ọ bụghị na Bible. (Jemes 4:1-⁠3; 5:1-⁠6) Ya mere ekwela ka omume ọjọọ nke ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, bụ́ ndị na-adị ndụ n’ụzọ megidere ndụmọdụ Bible, gbochie gị irite uru site n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị na ya.

GỊNỊ KA Ị GA-ACHỌTA?

10-13. Ụdị ihe ọmụma dị aṅaa ka a na-achọta na Bible?

10 Ọtụtụ ndị na-enwe ihe ịtụnanya mgbe ha gụrụ Bible nke mbụ ya. Ha na-achọpụta na n’ụzọ bụ isi, ọ bụghị akwụkwọ na-akọ banyere ememe okpukpe ma ọ bụ ụkpụrụ okwukwe. Ọ bụghịkwa nchịkọta nke okwu ndị na-enweghị isi ma ọ bụ nkà ihe ọmụma nke na-abaghị oké uru nye onye nkịtị. Ọ na-ekwu banyere ndị dịrị adị n’ezie bụ́ ndị nwere nchegbu na nsogbu dị ka anyị. Ọzọ, site n’igosipụta ụzọ Chineke si mesoo ihe a kpọrọ mmadụ n’oge gara aga, ọ na-enye nghọta banyere nzube ya maka anyị taa. Anyị na-agba gị ume ịgụ Jenesis, bụ́ akwụkwọ mbụ nke Bible. Site n’ihe ndekọ ya na-akpali mmasị, ị ga-enwe ike ịmụta ihe dị ukwuu banyere nzube Chineke maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ị ga-achọta ihe ọmụma banyere ihe pụrụ ibibi obi ụtọ mmadụ. Ọzọ, ị ga-amụta banyere àgwà na omume ndị na-eweta ihe ịga nke ọma ma na-eme ka obi tọọ Chineke ụtọ.

11 Ụfọdụ n’ime 66 akwụkwọ ndị dị na Bible na-akọ banyere akụkọ ihe mere eme na ihe omume okpukpe nke Israel oge ochie. (Ọpụpụ, Joshua na Samuel nke Mbụ bụ ihe atụ ole na ole ndị na-aghaghị ịmasị gị.) E deturu akụkọ ihe mere eme ahụ ka anyị nwee ike irite uru site na ya. (1 Ndị Kọrint 10:11) N’ihi nke a, ọ bụ ezie na Chineke adịghị eduzikwa nanị otu mba, ma ọ bụ na-ele onye ọ bụla anya n’aka idebe iwu ndị ahụ o nyere nanị Israel oge ochie, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’akwụkwọ ndị dị otú ahụ nke Bible. Dịkwa ka anyị ga-ahụ ma e mesịa, ihe Chineke meere ndị Israel (tinyekwara àjà anụmanụ ha chụụrụ ya) nwere ihe ha pụtara maka ndụ anyị.

12 Iji ghọta Bible nke ọma, i kwesịrị ịgụ ma ọ dịkarịsịa ala otu ihe ndekọ nke ndụ Jisọs. Oziọma dị mkpirikpi nke Mak bụ ezi ihe atụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, nweta ọṅụ n’ihe ndekọ na-akpali akpali nke nguzobe nke Iso Ụzọ Kraịst bụ́ nke e dekọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi. Mgbe ahụ leba anya na ndụmọdụ bara uru e nwere maka ndị Kraịst, dị ka a na-ahụ ya n’Akwụkwọ Ozi nke Jemes. Inweta ihe ọmụma bụ isi ndị dị n’akụkụ nile dịgasị iche iche nke Bible ga-enyere gị aka ịhụ ihe mere e jiworo lee ya anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa eri ọtụtụ narị afọ.

13 Ọ bụrụ na ihe ole na ole ị gụrụ na Bible juru gị anya, nwee ndidi. O nwere ọtụtụ ihe dị omimi, dị ka e kwesịrị ịtụ anya ya banyere akwụkwọ nke Onye Okike nyere ka ihe a kpọrọ mmadụ mụọ eri ọtụtụ narị afọ. (2 Pita 3:​15, 16) Ka oge na-aga ị ga-enweta azịza nye ọtụtụ ajụjụ, n’ihi na ihe ndekọ Bible nwere njikọ. Ajụjụ ndị bilitere banyere otu akụkụ ga-abụ ndị a zara n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ. Ka ị na-agụkwu ya, ọ bụ otú ahụ ka ị ga-ahụ Bible dị ka ihe na-enye aka ma na-eweta afọ ojuju karị. Ọzọ, n’oge na-adịghị anya ị ga-ahụ na ihe Bible na-ekwu dị nnọọ iche pụọ n’ozizi na omume nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na chọọchị dị iche iche. Nke a ga-akpali gị ịchọ ịgụ Akwụkwọ Nsọ nile, ị pụkwara ịhụ onwe gị ka ị na-agụghachi ya mgbe mgbe.

BIBLE​—⁠Ò SITERE N’EBEE?

14-19. Ihe àmà dị aṅaa na-egosi ma Bible ò sitere nanị n’aka mmadụ?

14 Ma eleghị anya ị maara ndị na-asọpụrụ Bible dị ka akwụkwọ ọgụgụ ma ọ bụ dị ka amamihe mgbe ochie, ma na-eche na ọ bụ ihe mmadụ mepụtara, ọ bụghị Okwu Chineke. Gịnị bụ eziokwu ndị dị na ya?

15 Ka ị na-agụ Bible, ị ga-ahụ na ndị ikom dị iche iche deturu ihe dị na ya. Mosis bụ onye nke mbụ, na-amalite na 1513 T.O.A. Onye ikpeazụ bụ onyeozi Jisọs bụ́ Jọn, na-ede n’oge dị nso ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A. N’ozuzu ya, e ji ihe dị ka 40 ndị ikom dee akwụkwọ dị iche iche nke Bible. Ụdị ndị dị aṅaa ka ha bụ? Ha bụ ndị ikom weturu onwe ha ala, ndị dị njikere ikpughe ma adịghị ike nke onwe ha ma nke mba ha. Obi eziokwu ha nwere kwesịrị ịrịba ama, n’ihi na ha kwukwara na ha na-ede ihe Chineke gwara ha ka ha dee. Ị pụrụ ịrịba ihe atụ banyere nke a ama na 2 Samuel 23:​1, 2; Jeremaịa 1:​1, 2 na Ezikiel 13:​1, 2. Nke a ó kwesịghị ịkwali anyị ịtụle nke ọma okwu mmesi obi ike ahụ nke Bible na-ekwu na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru”?​—⁠2 Timoti 3:16; 2 Pita 1:​20, 21.

16 Ihe ndị ahụ dere Bible deturu dị iche n’ọtụtụ ụzọ pụọ n’ihe ka ukwuu n’ihe ndekọ mgbe ochie. Dị ka nwata akwụkwọ ọ bụla nke akụkọ ihe mere eme nke mgbe ochie maara, ihe ndekọ ndị sitere Ijipt, Peasia, Babilọn na mba ndị ọzọ nke mgbe ochie gụnyere akụkọ ifo na ikwubiga okwu ókè banyere ndị ọchịchị na ihe ha mere. N’ụzọ megidere nke ahụ, e ji eziokwu na izi ezi mara Bible. O jupụtara n’aha na nkọwa ndị doro anya bụ́ ndị a pụrụ igosi izi ezi ha, ọbụna akara ụbọchị ha. Dị ka ihe atụ, Daniel isi nke ise kwuru banyere onye ọchịchị Babilọn aha ya bụ Belshaza. Eri ogologo oge, ndị nkatọ sịrị na ọ dịghị mgbe ọ bụla Belshaza dịrị adị, kama na ọ bụ ihe Daniel chepụtara. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e gwupụtawo ma sụgharịa ihe ndekọ ndị e dere n’elu mbadamba ụrọ, bụ́ ndị kwekọrọ n’ihe ndị e nwere n’ihe ndekọ Daniel. N’ihi nke a, Prọfesọ R. P. Dougherty (Mahadum Yale) dere na Bible nwere izi ezi karịa ihe odide ndị ọzọ ma na-egosipụta na e dere akwụkwọ Daniel mgbe ahụ Bible na-egosi na e dere ya.​—⁠Nabonidus and Belshazzar.

17 Ọ bụrụ na ị gaa Jerusalem, ị pụrụ isi n’ọwa mmiri oge ochie nke a wara site na nkume siri ike gafere. A chọpụtara ọwa mmiri nke a toro ogologo, ma mee ya ka ọ dị ọcha nanị n’ime narị afọ gara aga. N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe na-akpali mmasị? N’ihi na ọ na-anwapụta ihe e dere na Bible ihe karịrị 2,000 afọ gara aga banyere Eze Hezekaịa iwebata mmiri na Jerusalem.​—⁠2 Ndị Eze 20:20; 2 Ihe Emere 32:30.

18 Ihe ndị dị n’elu bụ nanị abụọ n’ime ọtụtụ ihe atụ na-egosipụta na a pụrụ ịtụkwasị Bible obi n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme na ókèala ebe ihe nọ mee. Ma ọ na-agụnye ihe karịrị nanị izi ezi, n’ihi na ụfọdụ akwụkwọ akụkọ ihe mere eme nke oge a na-ezi ezi. Bible nwere ihe ndị a na-apụghị ịkọwa a sị na ọ bụ akwụkwọ si n’aka mmadụ efu. Nke a emesiwo ọtụtụ ndị ji nlezianya na-eme nnyocha obi ike na Bible sitere n’aka Onye Kachasị Elu.

19 Ọ bụ eziokwu na e deghị Bible dị ka akwụkwọ sayensị, mgbe ọ banyere n’ihe ndị metụtara sayensị, ọ na-ezi ezi ma na-egosipụta amamihe nke ụmụ mmadụ na-enweghị n’oge e dere ya. Dị ka ihe atụ, Dr. Arno Penzias (onye nwetara Onyinye Nobel na 1978) kwuru banyere mmalite nke mbara elu na ala, sị:

“Ihe m na-ekwu bụ na ihe ndekọ ndị kasị mma anyị nwere bụ kpọmkwem ihe m gaara ebu ụzọ kwupụta, a sị na ọ dịghị ihe ọ bụla m nwere iji mee ihe ma ọ bụghị akwụkwọ ise nke Mosis, Abụ Ọma, Bible n’ozuzu ya.”

N’ịga n’ihu, Jenesis na-edepụta usoro mpụta nke ụdị ndụ dị iche iche, bụ́ usoro ndị ọkà mmuta sayensị n’ozuzu ha nabatara ugbu a. (Jenesis 1:​1-⁠27) Ọzọ, ebe mba ndị ọzọ na-akụzi akụkọ ifo dị ka na ụwa guzo n’elu enyi ma ọ bụ onye dike, Bible na-egosi n’ụzọ ziri ezi na ọ dịghị ihe ọ bụla ji ya nakwa na ụwa dị gburugburu. (Job 26:7; Aịsaịa 40:22) Olee otú ndị dere Bible si mara ihe ndị ọkà mmụta sayensị ka “chọpụtara” nanị n’oge ndị na-adịbeghị anya? Ihe ọmụma ahụ aghaghị isiteworị n’isi iyi nke karịrị ha onwe ha.

20-22. Olee ihe dị ịrịba ama n’ihe Bible na-ekwu banyere ihe ndị gaje ime n’ọdịnihu?

20 Ọ dị ihe dị mkpa ọbụna karị nke na-eme ka a ghọta onye Bible si n’aka ya. Ọ bụ amụma. Ụmụ mmadụ pụrụ ịkọ nkọ banyere ihe omume ndị ka dị n’ihu, ma ha apụghị iji ókè ọ bụla nke izi ezi nọgide na-ebu amụma banyere ọdịnihu. (Jemes 4:​13, 14) Ma Bible mere otú ahụ. Ogologo oge tupu Babilọn aghọọ alaeze ukwu ụwa ma bibie Jerusalem, Chineke mere ka onye amụma bụ́ Aịsaịa buo amụma na a ga-emeri Babilọn. Ihe dị ka narị afọ abụọ tupu o mee, Chineke kpọrọ Saịrọs aha dị ka onye ga-emeri Babilọn ma kwuo otú a ga-esi merie obodo ahụ. Aịsaịa dekọkwara kpọmkwem ihe ndị ga-eme banyere mbibi ikpeazụ nke Babilọn, mgbe mbibi dị otú ahụ ka dị ihe karịrị 1,000 afọ n’ọdịnihu. (Aịsaịa 13:17-⁠22; 44:24–45:3) Ha nile mezuru. Otú ahụkwa ka ọ dị n’amụma Bible banyere Taịa na Nineve. (Ezikiel 26:​1-⁠5; Zefanaịa 2:​13-⁠15) Ị pụrụ ịga lee mkpọmkpọ ebe ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma hụ ihe àmà ahụ n’onwe gị.

21 N’ogologo oge tupu oge ya eruo, akwụkwọ Bible bụ́ Daniel buru amụma doro anya banyere ihe ndị ọzọ ga na-eme n’ụwa nile. Medo-Peasia, bụ́ nke Gris ga-emerikwa, ga-emeri Babilọn. Mgbe onye ndú a ma ama nke Gris (Aleksanda Onye Ukwu) ga-anwụ, mmadụ anọ n’ime ndị nọ ya n’okpuru ga-eweghara ọchịchị nke alaeze ukwu mbụ ahụ. (Daniel 8:​3-8, 20-⁠22) Nke ahụ bụ akụkọ e dere nke ihe ka ga-eme n’ogologo oge dị n’ihu, o mezukwara n’ezie dị ka e si kwuo ya. Olee otú Daniel si mara? Nanị azịza na-eju afọ bụ nke e kwuru na Bible n’onwe ya, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” Nke a metụtara anyị n’ihi na dị ka a ga-atụle n’isiokwu ka dị n’ihu, Bible nwere amụma banyere ihe ndị meworo n’oge anyị. Ọzọ, ọ na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe ndị ka dị n’ọdịnihu.c

22 Tụkwasị n’ikwu banyere ọdịnihu, Bible na-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnọdụ ndị dị ugbu a. Ọ na-akọwa ihe mere e ji nwee ịta ahụhụ dị ukwuu, ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe bụ nzube nke ndụ. Ọ na-enye nduzi sitere n’aka Onye Okike banyere ụzọ anyị onwe anyị pụrụ isi merie nsogbu dị iche iche ma nweta obi ụtọ kasịnụ ná ndụ, ugbu a na n’ọdịnihu. Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ụfọdụ nsogbu ndị e nwere ná ndụ, tinyekwara ndụmọdụ Bible ndị a pụrụ iji mee ihe. Otú ọ dị, iji malite, anyị kwesịrị ịmata nke ọma karị Onye ahụ nyere okwu ndụmọdụ nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Jeremaịa 10:​23, Revised Standard Version.

b  Abụ Ọma 19:​1, 7, 8.

c  Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmụkwu banyere Bible dị ka akwụkwọ nke sitere n’aka Chineke, biko nweta akwụkwọ ahụ a kpọrọ The Bible​—⁠God’s Word or Man’s? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ígwè ozi bụ́ satellite ndị mmadụ mere pụrụ izite ozi n’ụwa. Ọ̀ bụ na Onye Okike ahụ apụghị ime karị?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Chineke ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ akwụkwọ?

[Foto dị na peeji nke 27]

ỌWA MMIRI HEZEKAỊA

Ị pụrụ isi n’ọwa mmiri oge ochie nke a dị na Jerusalem gafere. Ọ na-anwapụta izi ezi nke Bible.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya