Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • pr nkebi 3 p. 10-16
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu
  • Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akwụkwọ Kasị Mee Ochie, Nke A Kasị Kesaa n’Ụzọ Sara Mbara
  • Izi Ezi Nkà Mmụta Sayensị
  • Izi Ezi nke Akụkọ Ihe Mere Eme
  • Nkwekọrịta na Ikwu Ihe Ka Ha Si Mee
  • Akụkụ Ya Kasị Pụta Ìhè
  • Amụma E Mezuru Emezu
  • Ọ Na-enye Azịza Ya
  • Ezi Ozizi nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Akwụkwọ A Ọ̀ Na-ekwekọ na Sayensị?
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Akwụkwọ nke Na-ekpughe Ihe Ọmụma Chineke
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
pr nkebi 3 p. 10-16

Nkebi nke 3

Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nyochaa Bible?

1 Bible ọ̀ bụ ndekọ nke amamihe ahụ ka elu? Ọ̀ pụrụ inye anyị azịza ndị bụ eziokwu maka ajụjụ ndị ahụ dị mkpa ndị metụtara nzube nke ndụ?

2 N’ezie Bible ruru eru ka anyị nyochaa ya. Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụ akwụkwọ kasị dị ịrịba ama a chịkọtaworo, dị nnọọ iche pụọ n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Tụlee eziokwu ndị na-esonụ.

Akwụkwọ Kasị Mee Ochie, Nke A Kasị Kesaa n’Ụzọ Sara Mbara

3, 4. Ruo ókè hà aṅaa ka Bible meworo ochie?

3 Bible bụ akwụkwọ kasị mee ochie e detụworo, e dere akụkụ ya ụfọdụ ihe dị ka 3,500 afọ gara aga. O ji ọtụtụ narị afọ mee ochie karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ a na-ele anya dị ka ihe dị nsọ. E dere nke mbụ n’ime 66 akwụkwọ ndị dị na ya ihe dị ka otu puku afọ tupu oge Buddha na Confucius na ihe dị ka puku afọ abụọ tupu oge Muḥammad.

4 Akụkọ ihe mere eme e dekọrọ na Bible na-akọ laa azụ ná mmalite nke ezinụlọ mmadụ ma na-akọwa otú anyị si bịa nọrọ n’ebe a n’ụwa. Ọbụna na ọ na-ewere anyị gaa azụ n’oge mgbe e kere ụmụ mmadụ, na-enye anyị ihe ndị bụ eziokwu banyere mmepụta nke ụwa.

5. Ihe odide oge ochie ole nke Bible dị, ma e jiri ya tụnyere ihe odide ndị ọzọ nke ụwa e dere n’oge ochie?

5 Akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ, na ndị na-abụghịkwa nke okpukpe, nwere nanị ole na ole n’ime ihe odide ochie ha ndị ka dị adị. Ihe dị ka 11,000 nke Bible ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ ndị e ji aka dee ka dị adị n’asụsụ Hibru na Grik, nke ụfọdụ n’ime ha pụtara n’oge dị nso mgbe e dere nke mbụ ha. Ndị a alanarịwo n’agbanyeghị na a nwawo oké mwakpo ndị e leziri anya mee nke a pụrụ iche n’echiche megide Bible.

6. Ruo ókè hà aṅaa ka e kesaworo Bible?

6 Ọzọ, Bible bụ n’ụzọ dị ukwuu akwụkwọ a kasị kesaa ekesa n’akụkọ ihe mere eme. E kesawo ihe dị ka ijeri atọ nke Bible ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’ihe dị ka puku asụsụ abụọ. A sịrị na Bible na-eru 98 pasent nke ezinụlọ mmadụ aka n’asụsụ nke ha. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ na-eru nkesa dị otú ahụ nso.

7. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere izi ezi nke Bible?

7 Tinyere nke ahụ, ọ dịghị akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ a pụrụ iji tụnyere Bible n’izi ezi. Ndị mmụta sayensị, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, ndị ọkà n’ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala, ndị ọkà ọdịdị ụwa, ndị ọkà n’asụsụ, na ndị ọzọ nọgidere na-egosi izi ezi nke ihe ndekọ Bible.

Izi Ezi Nkà Mmụta Sayensị

8. Ruo ókè hà aṅaa ka Bible ziri ezi n’ihe banyere mmụta sayensị?

8 Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na e deghị Bible ịbụ akwụkwọ nkà mmụta sayensị, o kwekọrọ n’ezi mmụta sayensị mgbe o kwuru ihe banyere sayensị. Ma akwụkwọ mgbe ochie ndị ọzọ a na-ele anya dị ka ndị dị nsọ nwere akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke nkà sayensị, ezighị ezi, na okwu ụgha ndị doro anya. Rịba ama anọ n’ime ọtụtụ ihe atụ nke izi ezi nke nkà mmụta sayensị nke Bible:

9, 10. Kama igosipụta echiche ndị na-ekwekọghị ná mmụta sayensị n’oge ya, gịnị ka Bible kwuru banyere ihe ụwa dabeere na ya?

9 Ụzọ e si jigide ụwa ná mbara igwe. N’oge ochie mgbe a na-ede Bible, e nwere ọtụtụ nchepụta banyere ụzọ e si jigide ụwa ná mbara igwe. Ụfọdụ kwenyere na enyí anọ guzo n’elu otu nnukwute mbe mmiri bu ụwa. Aristotle, ọkà ihe ọmụma na ọkà mmụta sayensị bụ́ onye Gris nke narị afọ nke anọ T.O.A., kụziri na ụwa apụghị ikoro ná mbara igwe ghere oghe. Kama nke ahụ, ọ kụziri na a kwụnyere ụwa mbara igwe dị iche iche n’okirikiri ndị siri ike, ndị dị ka enyo na-ahụ ụzọ, okirikiri nke ọ bụla na-adị okirikiri ọzọ nso. E chere na ụwa nọ ná nke dịkarịsịrị n’ime, okirikiri nke dịkarịsịrị ná mpụta jigidere kpakpando nile.

10 Ma, kama igosipụta echiche ndị na-egbu mara mara, nke na-ekwekọghị ná nkà mmụta sayensị ndị e nwere mgbe a na-ede ya, Bible kwuru n’ụzọ dị mfe (n’ihe dị ka n’afọ 1473 T.O.A.) sị: “[Chineke] na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) Na Hibru mbụ, okwu e nwere maka “na-abụghị ihe” nke e jiri mee ihe n’ebe a pụtara “na-abụghị ihe ọ bụla,” nke a agwụlakwa ebe ọ pụtara na Bible. Ndị ọkà mmụta ghọtara onyinyo ọ na-ese banyere ụwa nke mbara tọgbọ nkịtị gbara gburugburu dị ka ọhụụ dị ịrịba ama ma a tụnyere ya oge ahụ e dere ya. Akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament na-asị: “Job 26:7 na-ese onyinyo dị ịrịba ama nke ụwa oge ahụ ịbụ nke e kokwasịrị ná mbara igwe, si otú ahụ na-ebute nchọpụta nkà mmụta sayensị n’ọdịnihu ụzọ.”

11, 12. Olee mgbe ụmụ mmadụ ghọtara eziokwu nke Job 26:7?

11 Okwu ziri ezi nke Bible ji ihe karịrị 1,100 afọ buru Aristotle ụzọ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, a nọgidere na-ezi echiche Aristotle dị ka eziokwu ruo ihe dị ka 2,000 afọ mgbe ọ nwụsịrị! N’ikpeazụ, na 1687 O.A., Sir Isaac Newton bipụtara nchọpụta ya dị iche iche nke na e jigidere ụwa ná mbara igwe n’ụzọ jikọtara ya na ụwa mbara igwe ndị ọzọ site ná ndọrọ ha na-adọrọ ibe ha, ya bụ ike ndọda. Ma nke ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3,200 afọ mgbe Bible kwusịworo n’ụzọ dị nnọọ mfe na ụwa na-ekokwasị “n’ihe na-abụghị ihe.”

12 Ee, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3,500 afọ gara aga, Bible ziri ezi n’ikwu na ụwa enweghị ihe nkwado ọ bụla a na-ahụ anya, eziokwu nke kwekọrọ n’iwu ndị a ka ghọtara ọhụrụ nke ike ndọda na mmegharị. “Otú Job si mara eziokwu ahụ,” ka otu onye mmụta kwuru, “bụ ajụjụ nke na-adịghịrị ndị na-agọnarị isite n’ike mmụọ nsọ nke Akwụkwọ Nsọ mfe inweta azịza ya.”

13. Olee otú ndị mmadụ siri lee ọdịdị ụwa anya ọtụtụ narị afọ gara aga, ma gịnị gbanwere uche ha?

13 Otú ụwa dị. The Encyclopedia Americana kwuru, sị: “Onyinyo mbụ a maara nke ụmụ mmadụ nwere banyere ụwa bụ na ọ bụ mbadamba ihe, nke siri ike, n’etiti eluigwe na ala. . . . Echiche nke ụwa dị okirikiri abụghị nke a nakweere n’ụzọ sara mbara ruo oge Renaissance.” Ọbụna ndị mbụ mere njem ụgbọ mmiri tụrụ egwu na ha pụrụ ịkpara ụgbọ dapụ ná nsọtụ ụwa dị mbadamba. Ma mgbe ahụ mwebata nke ígwè ọrụ compass na ọganihu ndị ọzọ mere ka e nwee ike ime njem ụgbọ mmiri ndị dị ogologo karị. “Njem nchọpụta” ndị a, ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ọzọ na-akọwa, “gosiri na ụwa dị okirikiri, ọ bụghị mbadamba dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ kwereworo.”

14. Olee otú Bible si kọwaa ọdịdị ụwa, olè mgbe kwa?

14 Ma, ogologo oge tupu njem ndị dị otú ahụ, ihe dị ka 2,700 afọ gara aga, Bible sịrị: “Ọ bụ Onye ahụ nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa.” (Aịsaịa 40:22) Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a ịbụ “gburugburu” pụkwara ịpụta “okirikiri,” dị ka ọtụtụ akwụkwọ ntụaka na-arịba ama. N’ihi ya, nsụgharị ndị ọzọ nke Bible na-asị, “okirikiri nke ụwa” (Douay Version) na, “okirikiri ụwa.”​—⁠Moffatt.

15. N’ihi gịnị ka echiche ndị na-ekwekọghị ná mmụta sayensị banyere ụwa ji ghara imetụta Bible?

15 Otú a, echiche ndị na-ekwekọghị ná mmụta sayensị bụ́ ndị juru ebe nile n’oge ahụ banyere ihe ụwa dabeere na ya na otú ọ dị emetụtaghị Bible. Ihe kpatara ya dị mfe: Onye Nchepụta nke Bible bụ Onye Nchepụta nke eluigwe na ala. O kere ụwa, ya mere o kwesịrị ịma ihe o kokwasịrị n’elu ya na otú ọ dị. N’ihi ya, mgbe o nyere mmụọ nsọ maka odide nke Bible, ọ hụrụ na e webataghị echiche ọ bụla na-ekwekọghị ná mmụta sayensị, n’agbanyeghị ókè dị ukwuu ọ pụrụ ịbụwo na ndị ọzọ n’oge ahụ kwenyere na ha.

16. Olee otú ihe ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ si kwekọọ n’okwu Bible?

16 Ihe mejupụtara ihe ndị dị ndụ. “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá dị n’ala kpụọ mmadụ,” ka Jenesis 2:7 na-ekwu. Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-asị: “Ihe mmiri ọgwụ nile mejupụtara ihe ndị dị ndụ dịkwa n’ihe ndị na-enweghị ndụ.” Ya mere, a na-achọta mmiri ọgwụ nile bụ isi ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ, gụnyere mmadụ, n’ala n’onwe ya. Nke a kwekọrọ n’okwu Bible nke na-akọ ihe Chineke jiri kee mmadụ na ihe ndị ọzọ nile dị ndụ.

17. Gịnị bụ eziokwu banyere otú ihe ndị dị ndụ si malite ịdị adị?

17 “Dị ka ụdị ha si dị.” Bible na-asị na Chineke kere nwoke na nwanyị mbụ nakwa na site na ha ụmụ mmadụ ndị ọzọ nile pụtara. (Jenesis 1:26-⁠28; 3:20) Ọ na-asị na ihe ndị ọzọ dị ndụ, dị ka azụ, nnụnụ, na anụ ndị na-enye ụmụ ha ara, mere otu ihe ahụ, na-apụta “dị ka ụdị ha si dị.” (Jenesis 1:​11, 12, 21, 24, 25, NW) Nke a bụ kpọmkwem ihe ndị mmụta sayensị chọpụtaworo n’ihe ndị Chineke kere eke, na ihe ọ bụla dị ndụ si ná nne na nna bụ ụdị ya pụta. E nweghị nke a ga-agụpụ. Ná nke a, onye mmụta physics bụ́ Raymo kwuru, sị: “Ndụ na-eme ndụ; ọ na-eme mgbe nile n’ime mkpụrụ ndụ ọ bụla. Ma olee otú ihe na-abụghị ndụ si mepụta ndụ? Ọ bụ otu n’ime ajụjụ ndị bukarịsịrị ibu a na-azabeghị ná nkà mmụta ihe ndị dị ndụ, ka ọ dịkwa ugbu a, ndị ọkà mmụta banyere ihe ndị dị ndụ pụrụ nanị ịkọ nkọ ndị na-eyitụdịghị eziokwu. N’ụzọ a na-amaghị ama ihe na-enweghị ndụ nwere ihe ịga nke ọma n’ịhazi onwe ya n’ụzọ ihe nwere ndụ. . . . Ọ pụrụ ịbụwo nnọọ na onye chepụtara Jenesis kwuru ihe ziri ezi.”

Izi Ezi nke Akụkọ Ihe Mere Eme

18. Gịnị ka ọkà iwu kwuru banyere izi ezi n’akụkọ ihe mere eme nke Bible?

18 Bible nwere akụkọ ihe mere eme n’oge ochie nke kasị zie ezi nke akwụkwọ ọ bụla dịworonụ. Akwụkwọ bụ́ A Lawyer Examines the Bible gosipụtara izi ezi nke akụkọ ihe mere eme ya n’ụzọ dị otú a: “Ebe akwụkwọ akụkọ ụtọ dị iche iche, akụkọ ifo, na akaebe ụgha na-elezi anya ikwu ihe ndị merenụ n’ebe dị nnọọ anya na n’oge a na-ejighị n’aka, si otú ahụ na-emebi ụkpụrụ iwu ndị mbụ ndị anyị bụ́ ndị ọkà iwu mụtara isi na-ekwuchite ọnụ ndị mmadụ nke ọma, na ‘nkwupụta aghaghị ikwu oge na ebe,’ akụkọ Bible na-enye anyị ụbọchị na ebe ihe ndị ahụ a kọrọ n’akụkọ mere n’ụzọ ziri ezi karịsịa.”

19. Olee otú otu akwụkwọ si kwuo okwu banyere ịkọru ihe ala nke Bible?

19 Akwụkwọ The New Bible Dictionary na-asị: “[Onye dere Ọrụ Ndị Ozi] setịpụrụ akụkọ ya n’usoro nke akụkọ ihe ndị mere n’oge ahụ; peji ya nile jupụtara ná ntụaka gaa ná ndị ọkà ikpe obodo ukwu, ndị gọvanọ ógbè obodo, ndị eze akụkụ mba, na ndị dị otú ahụ, ntụaka ndị a kwa ọtụtụ mgbe na-aghọ nnọọ eziokwu maka ebe na oge a na-ekwu maka ha.”

20, 21. Gịnị ka otu onye mmụta nke Bible kwuru banyere akụkọ ihe mere eme nke Bible?

20 Ka ọ na-ede ihe n’akwụkwọ The Union Bible Companion, S. Austin Allibone kwuru, sị: “Sir Isaac Newton . . . bụkwa onye a ma ama dị ka onye nkatọ nke ihe ndị e dere n’oge ochie, o jikwa oké nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Gịnị bụ mkpebi ikpe ya n’isi ihe a? ‘Achọpụtara m,’ ka ọ na-ekwu, ‘ọtụtụ akara ndị ọzọ nke ịbụ eziokwu na Testament Ọhụrụ karịa n’akụkọ ọ bụla ọzọ nke ụwa [na-emetụtaghị okpukpe] e nwere.’ Dr. Johnson sịrị na anyị nwere ọtụtụ ihe àmà na Jisọs Kraịst nwụrụ na Kalvarị, dị ka e dere n’Oziọma ndị ahụ, karịa ka anyị nwere na Julius Caesar nwụrụ na Capitol. N’ezie, anyị nwere nnọọ ọtụtụ karị.”

21 Akwụkwọ nke a na-ekwukwa, sị: “Jụọ onye ọ bụla na-asị na ya na-arụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme nke Oziọma ahụ ụka ihe mere o ji kwere na Caesar nwụrụ na Capitol, ma ọ bụ na e mere Emperor Charlemagne Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu nke Ebe Ọdịda Anyanwụ n’aka Pope Leo nke Atọ. na 800? . . . Olee otú i si mara na nwoke dị otú ahụ dị ka Charles nke Mbụ. [nke England] dịrị adị, na e bere ya isi, nakwa na Oliver Cromwell ghọrọ onye na-achị isi n’ọnọdụ ya? . . . A na-asị na ọ bụ Sir Isaac Newton chọpụtara iwu nke ike ndọda . . . Anyị kwenyere ihe nile a na-ekwu banyere ndị ikom ndị a; ọ bụkwa otú ahụ n’ihi na anyị nwere ihe àmà ihe mere eme nke ịbụ eziokwu ha. . . . Ọ bụrụ na, mgbe e wepụtara ihe nnwapụta dị ka nke a, ndị ọ bụla ka na-ajụ ikwere, anyị na-ahapụ ha dị ka ndị rụrụ arụ n’ụzọ nzuzu ma ọ bụ ndị na-amaghị ihe bụ́ ndị na-enweghị olileanya.”

22. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ajụ ịnakwere ịbụ eziokwu nke Bible?

22 Mgbe ahụ akwụkwọ nke a kwubiri, sị: “Mgbe ahụ gịnị ka anyị ga-ekwu banyere ndị, n’agbanyeghị ihe àmà bara ụba e wepụtaworo ugbu a banyere ịbụ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ, na-asị na e mebeghị ka ha kwere? . . . N’ezie anyị nwere ihe mere anyị ga-eji kwubie na ọ bụ obi kama ịbụ isi ha, nwere nsogbu;​—⁠na ha achọghị ikwere ihe nke ga-eweda mpako ha ala, wee manye ha ibi ndụ dị iche.”

Nkwekọrịta na Ikwu Ihe Ka Ha Si Mee

23, 24. N’ihi gịnị ka nkwekọ e nwere n’ime Bible ji bụrụ nnọọ ihe pụrụ iche?

23 Cheedị ihe ọ dị ka ya na a malitere ide otu akwụkwọ n’oge Alaeze Ukwu Rom, degide ya gabiga Mgbe Ụwa Na-emepebeghị Anya, wee desịa ya na narị afọ nke 20 nke a, na-enwe ọtụtụ ndị dị iche iche so dee ya. Olee ihe ị ga-atụ anya a ga-arụpụta ma ọ bụrụ na ndị dere ya dịgasị iche n’ọrụ ha, dị ka ndị soja, ndị eze, ndị nchụàjà, ndị na-akụ azụ, ndị na-azụ anụ, na ndị dọkịta? Ị̀ ga-atụ anya akwụkwọ ahụ inwe nkwekọrịta ma na-enwe njikọ? ‘O siri ike!’ ka ị pụrụ ikwu. Ma, e dere Bible n’ọnọdụ ndị a. Ma, o nwere nkwekọrịta n’akụkụ nile, ọ bụghị nanị n’isi ihe a na-akọ kamakwa n’akụkụ ndị dịkarịsịrị nta.

24 Bible bụ nchịkọta nke 66 akwụkwọ e dere n’ime oge gafere 1,600 afọ site n’aka ihe dị ka 40 mmadụ dị iche iche so dee ya, na-amalite na 1513 T.O.A. ma gwụsịa na 98 O.A. Ndị so dee ya sitere n’ọnọdụ ndụ dị iche iche, ọtụtụ enweghịkwa ihe jikọrọ ha na ndị nke ọzọ. Ma, akwụkwọ nke sitere na ya tụlere otu isiokwu bụ isi, nke nwere njikọ, n’akụkụ nile, dị ka à ga-asị na o sitere n’otu uche. N’adịghịkwa ka ihe ụfọdụ kwere, Bible abụghị ihe sitere ná mmepeanya ndị Ọdịda Anyanwụ, kama ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ dere ya.

25. Ikwu eziokwu na ikwu ihe ka ha si mee nke Bible na-akwado nzọrọ dị aṅaa nke ndị so dee Bible?

25 Ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị oge ochie na-ede akwụkwọ kọrọ nanị ihe ịga nke ọma na àgwà ọma ha dị iche iche, ndị dere Bible kwetara hoo haa ihie ụzọ ha dị iche iche, nakwa mmehie ndị eze na ndị ndú ha. Ọnụ Ọgụgụ 20:​1-⁠13 na Deuterọnọmi 32:​50-⁠52 dekọrọ mmehie nke Mosis, ọ bụkwa ya dere akwụkwọ ndị ahụ. Jona 1:​1-⁠3 na 4:1 depụtara mmehie nile nke Jona, bụ́ onye dere ihe ndekọ ndị ahụ. Matiu 17:18-⁠20; 18:1-⁠6; 20:20-⁠28; na 26:56 dekọrọ àgwà ndị na-adịghị mma nke ndị na-eso ụzọ Jisọs gosipụtara. Otú a, ikwu eziokwu na ikwu ihe ka ha si mee nke ndị dere Bible na-enye nkwado maka nzọrọ ha nke ịnata ike mmụọ nsọ Chineke.

Akụkụ Ya Kasị Pụta Ìhè

26, 27. N’ihi gịnị ka Bible ji zie ezi otú a n’ihe ndị metụtara mmụta sayensị na n’ihe ndị ọzọ?

26 Bible n’onwe ya na-ekpughe ihe mere o ji zie ezi otú a ná mmụta sayensị, akụkọ ihe mere eme, na n’ihe ndị ọzọ, na ihe mere o ji nwee nkwekọrịta ma bụrụ eziokwu. Ọ na-egosi na Onye Kasị Elu, Chineke pụrụ ime ihe nile, Onye Okike nke chepụtara eluigwe na ala, bụ Onye Nchepụta nke Bible. Nanị ihe o mere bụ iji ụmụ mmadụ dere Bible mee ihe dị ka ndị odeakwụkwọ ya, na-eji ike ọrụ ya dị ike na-akwali ha idetu ihe o nyere ha mmụọ nsọ ya ide.

27 N’ime Bible Pọl onyeozi na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” Pọl onyeozi ahụ kwukwara, sị: “Mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.”​—⁠2 Timoti 3:16, 17; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.

28. Mgbe ahụ, ebee ka Bible sitere?

28 Otú a, Bible sitere n’uche otu Onye Nchepụta​—⁠Chineke. Sitekwa n’ike ya dị egwu, ọ bụ ihe dịịrị ya mfe ijide n’aka na e chekwara ihe e detụrụ ruo ụbọchị anyị ịdị otú ọ dị site ná mmalite. Banyere nke a, otu onye a na-akwanyere ùgwù n’ihe banyere ihe odide Bible, bụ́ Sir Frederic Kenyon, na 1940, sịrị: “E wepụwo ntọala ikpeazụ e nwere maka obi abụọ ọ bụla na Akwụkwọ Nsọ rutere anyị aka otú ahụ e si nnọọ dee ya.”

29. Olee otú a pụrụ isi nye ihe atụ nke ikike Chineke nwere inwe nkwurịta okwu?

29 Ụmụ mmadụ nwere ikike izite ụzarị ozi redio na telivishọn n’ụwa site n’ọtụtụ puku mile ná mbara ìgwè, ọbụna site n’ọnwa. Ìgwè ọrụ na-eme nnyocha ná mbara igwe ezighachitewo n’ụwa ihe ọmụma na foto ndị a na-ahụ anya site n’ala mbara igwe ndị dị ọtụtụ narị nde mile n’ebe dị anya. N’ezie Onye Okike mmadụ, Onye Okike nke ụzarị redio pụrụ ime ma ọ dịghị ihe ọzọ ihe ruru otú ahụ. N’eziokwu, ọ bụ ihe dịịrị ya mfe iji ike ya pụrụ ime ihe nile zite okwu na foto n’uche nke ndị ọ họọrọ idekọ Bible.

30. Chineke ọ̀ chọrọ ka ụmụ mmadụ chọpụta ihe bụ nzube ya maka ha?

30 Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ ihe banyere ụwa na ndụ dị n’elu ya ndị na-enye ihe àmà banyere mmasị Chineke nwere n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ya mere, o kwere nghọta na ọ ga-achọ inyere ụmụ mmadụ aka ịchọpụta onye ọ bụ na ihe bụ nzube ya maka ha site n’ikwupụta ihe ndị a n’ụzọ doro anya n’otu akwụkwọ​—⁠ihe ndepụta na-adịgide adịgide.

31. N’ihi gịnị ka ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke e dekọrọ edekọ ji bụrụ nke dị mma nke ukwuu karịa ihe ọmụma nke a na-eji okwu ọnụ na-enyefe?

31 Tụleekwa, ịbụ ọkaaka nke akwụkwọ Chineke chepụtara, ma e jiri ya tụnyere ihe ọmụma okwu ọnụ nke ụmụ mmadụ nyefere site n’aka fere n’aka. A gaghị atụkwasị okwu ọnụ obi, ebe ọ bụ na ndị mmadụ ga-akọ ozi ahụ otú ha si ghọta, mgbe oge na-agakwa, a ga-agwagbu ihe ọ pụtara. Ha ga-akọ ihe ọmụma ahụ site n’okwu ọnụ dị ka ụzọ ile ihe anya nke ha si dị. Ma ihe ndekọ Chineke nyere mmụọ ya, nke e deturu edetu n’ụzọ na-adịgide adịgide eyichaghị ka ọ ga-enwe ihe ndị na-ezighị ezi. Ọzọ, a pụrụ idepụtaghachi akwụkwọ ma sụgharịa ya ka ndị na-agụ asụsụ dị iche iche nwee ike irite uru site na ya. Ya mere ọ̀ bụ na ezi uche adịghị ya na Onye Okike anyị jiri ụzọ dị otú ahụ nye ihe ọmụma? N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya nke ukwuu, ebe Onye Okike ahụ kwuru na nke a bụ ihe o mere.

Amụma E Mezuru Emezu

32-34. Gịnị ka Bible nwere nke ọ na-adịghị akwụkwọ ọzọ nwere ya?

32 Ọzọkwa, Bible nwere akara nke isite n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè: Ọ bụ akwụkwọ nke amụma ndị nweworo ma nọgide na-enwe mmezu na-adịghị ehie ụzọ.

33 Dị ka ihe atụ, mbibi nke Taịa oge ochie, ọdịda Babilọn, mwughachi Jerusalem, na mbilite na ọdịda nke ndị eze Midia na Peasia na Gris bụ ihe ndị e buru amụma ha n’ụzọ dị ukwuu n’ime Bible. Amụma ndị ahụ ziri ezi nke ukwuu nke na ụfọdụ ndị nkatọ nwara, n’efu, ikwu na e dere ha mgbe ihe ndị ahụ weresịịrị ọnọdụ.​—⁠Aịsaịa 13:17-⁠19; 44:27–⁠45:1; Ezikiel 26:​3-⁠6; Daniel 8:​1-7, 20-⁠22.

34 E mezuru amụma ndị Jisọs buru banyere mbibi Jerusalem na 70 O.A. n’akụkụ nile. (Luk 19:41-⁠44; 21:20, 21) A na-emezukwa amụma dị iche iche banyere “mgbe ikpeazụ” ndị a nke Jisọs na Pọl onyeozi buru n’akụkụ nile n’oge anyị kpọmkwem.​—⁠2 Timoti 3:​1-5, 13; Matiu 24; Mak 13; Luk 21.

35. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ n’aka Onye Okike ahụ nanị ka amụma Bible ga-esite?

35 Ọ dịghị uche mmadụ, n’agbanyeghị otú ọgụgụ isi ya ha, pụrụ ịkọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ ziri nnọọ ezi. Nanị uche nke Onye Okike eluigwe na ala nke kasị n’ike ma kasị n’amamihe pụrụ, dị ka anyị na-agụ na 2 Pita 1:​20, 21: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.”

Ọ Na-enye Azịza Ya

36. Gịnị ka Bible na-agwa anyị?

36 Ya mere, n’ọtụtụ ụzọ, Bible na-ebu ihe àmà nke ịbụ Okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Onye Kasị Elu. N’ihi ịbụ ihe dị otú ahụ, ọ na-agwa anyị ihe mere ụmụ mmadụ ji nọrọ n’ụwa, ihe mere e ji nwee oké nhụjuanya otú a, ebe anyị na-aga, na otú ọnọdụ ga-esi gbanwee ịka mma. Ọ na-ekpughere anyị na e nwere Chineke kasị elu nke kere ụmụ mmadụ na ụwa nke a n’ihi otu nzube nakwa na a ga-emezu nzube ya. (Aịsaịa 14:24) Bible na-ekpughekwara anyị ihe bụ ezi okpukpe ahụ na ụzọ anyị pụrụ isi chọta ya. Otú a, nanị ya bụ isi iyi nke amamihe kasị elu nke pụrụ ịgwa anyị eziokwu banyere ajụjụ nile dị oké mkpa banyere ndụ.​—⁠Abụ Ọma 146:3; Ilu 3:5; Aịsaịa 2:​2-⁠4.

37. Gịnị ka a na-aghaghị ịjụ banyere Krisendọm?

37 Ọ bụ ezie na e nwere ụba nke ihe nnwapụta banyere ịbụ eziokwu na izi ezi nke Bible, ndị nile na-asị na ha na-anakwere ya hà na-agbaso nkụzi ya nile? Tụlee, dị ka ihe atụ, mba ndị na-azọrọ na ha ji Iso Ụzọ Kraịst kpọrọ ihe, ya bụ Krisendọm. Aka ha eruwo Bible ruo ọtụtụ narị afọ. Ma echiche na omume ha nile hà na-egosipụta n’eziokwu amamihe kasị elu nke Chineke?

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Sir Isaac Newton kwenyere na e jigidere ụwa ná mbara igwe n’akụkụ ụwa mbara igwe ndị ọzọ site n’ike ndọda

Onyinyo Bible na-ese banyere ụwa nke mbara tọgbọ nkịtị gbara gburugburu bụ nke ndị mmụta nakweere dị ka ọhụụ dị ịrịba ama maka oge ya

[Foto dị na peeji nke 12]

Ụfọdụ ndị mbụ mere njem ụgbọ mmiri ọbụna tụrụ egwu ịkpara ụgbọ dapụ ná nsọtụ ụwa dị mbadamba

[Foto dị na peeji nke 13]

E nwere ọtụtụ ihe àmà na Jisọs Kraịst dịrị adị karịa ka e nwere nke na na Julius Caesar, Emperor Charlemagne, Oliver Cromwell ma ọ bụ Pope Leo nke Atọ dịrị

[Foto dị na peeji nke 15]

Mmezu amụma dị iche iche Jisọs buru banyere mbibi Jerusalem na 70 O.A. bụ nke Mgbidi nke Titus na Rom na-agba akaebe ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya