Nzukọ Ije Ozi Maka August
Izu Na-amalite August 5
Abụ 56 (33)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
20 min: “A Dịghị Ahapụ Izisa Ozi Ọma Ahapụ.” Okwu na iso ndị na-ege ntị kparịta ụka. Gụnye okwu ndị sitere n’Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 673, paragraf 1.
15 min: “Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ.” (Paragraf 1-5) Jiri paragraf mbụ mee ihe n’okwu mmeghe. Kwuo okwu ndị dị mma banyere abamuru nke iji broshuọ Ndụ n’Elu Ala na “Lee!” eme ihe n’ozi. Mee ndokwa ihe ngosi anọ a mụgharịrị nke ọma, na-egosi ụzọ a pụrụ isi jiri broshuọ ndị a mee nleta mbụ na nletaghachi. Mee ka onye nkwusa na-eto eto, nke nne ma ọ bụ nna ya na-enyere aka, mee ihe ngosi iche broshuọ Ndụ n’Elu Ala n’ihu mmadụ. Ndị nkwusa pụrụ ịchọ ime ka ụzọ iche broshuọ ndị ọzọ n’ihu mmadụ ha yie ndị a tụrụ aro ha n’ebe a.
Abụ 136 (23) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 12
Abụ 192 (162)
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.
15 min: “Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ.” (Paragraf nke 6-8) Nye nchịkọta dị mkpirikpi nke ihe dị na broshuọ Ọchịchị. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ya maka nleta mbụ na nletaghachi. Gbaa mmadụ nile ume isochi akwụkwọ ndị ha tinyere.
15 min: “Onyinye Maka Ọrụ Society Gburugburu Ụwa Na-akwado Mgbasawanye.” Okwu na-ekpo ọkụ okenye ga-ekwu. Tinye ngụkọ ọnụ ọgụgụ ụfọdụ banyere ọganihu nke ọrụ Alaeze ná mba ụfọdụ e depụtara, dị ka a kọrọ na Yearbook.
Abụ 9 (12) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 19
Abụ 174 (215)
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Gụnye okwu ndị dị mma banyere “Ụzọ Isi Kere Òkè,” n’Ụlọ Nche, December 1, 1993, peji nke 29-31.
15 min: “Ònye Ruru Eru Ime Nkwusa?” Onye okenye na ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ atụlee isiokwu. Mesie ya ike na anyị na-enweta ọzụzụ kasị mma e nwere, na-akwadebezu anyị dị ka ndị ozi Chineke. Anyị enweghị ihe mere ọ ga-eji dị anyị ka anyị erughị eru ime nkwusa.
18 min: “Otú E Si Eji Akwụkwọ Ihe Ọmụma Eme Ndị Na-eso Ụzọ.” Ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke paragraf nke 17-26 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996. Buru ụzọ mee ndokwa iwebata ahụmahụ ndị e nwere n’ọgbakọ nke ndị ji akwụkwọ Ihe Ọmụma na-eduzi ọmụmụ ihe. Ha pụrụ ikwu ihe ndị dị mma banyere ụzọ ha siworo tinye aro ndị a na-ahụ n’ihe ntinye ahụ n’ọrụ na ụzọ e siworo nyere ha aka iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi na-aga n’ihu karị. Gbaa mmadụ nile ume ichekwa ihe ntinye ahụ ma na-atụleghachi ya n’onwe ha mgbe ọ bụla ha malitere ọmụmụ ihe ọhụrụ.
Abụ 189 (208) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 26
Abụ 104 (164)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Maa ọkwa ndokwa ije ozi ubi maka ngwụsị izu.
15 min: Okwu okenye nke bụ ọkà okwu nweworo ahụmahụ ga-ekwu n’ihe ọmụma dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke August 1994. Tụlezuo paragraf nke 18-22 bido n’isiokwu nta bụ́ “Iji Ihe Ndị Ruuru Gị Mee Ihe.” Kọwaa na ụlọ ọgwụ ụfọdụ ugbu a na-amịnye ọbụna Ndịàmà ọbara n’ihi na ha bịanyere aka na fọm nkweta ụlọ ọgwụ tupu ha ejiri nlezianya gụọ ya. Fọm ntọhapụ ụlọ ọgwụ pụrụ ikwu na ị ‘na-enye ha ohere iji usoro nzọpụta ndụ ọ bụla’ eme ihe, bụ́ nke ha na-ewere dị ka ikike site n’aka onye ọrịa iji ọbara eme ihe. E kwesịrị ịkagbu okwu dị otú ahụ ma deba okwu nke a: ‘A gaghị enye ohere maka mmịnye ọbara n’okpuru ọnọdụ ọ bụla.’ Mesie ntụziaka ndị dị na paragraf nke 18 ike. Gbaa ezinụlọ nile ume idebe ihe ntinye ahụ nso mgbe nile. Ndị nke ha na-efu efu pụrụ ịgwa odeakwụkwọ ọgbakọ ka o nye ha otu. Ọ bụrụ na ọgbakọ chọkwuru, a pụrụ ịtụ ọda ha n’aka Society. Kwusiekwa okwu ike banyere mkpa ọ dị ka mmadụ nile na-eji kaadị Advance Medical Directive/Release mgbe nile ma soro dọkịta ha kparịta nguzo anyị banyere ọbara ná nleta mbụ, ọ bụghị ichere ruo mgbe e nwere ọnọdụ siri ike. Biko rịba ama na a gajeghị iyiri kaadị Advance Medical Directive/Release ka a na-ahụ ya anya dị ka kaadị baajị dị ka ndị anyị na-eji eme ihe ná mgbakọ. Anyị kwesịrị iji ya mgbe nile, n’akpa uwe, pọọsụ, ma ọ bụ n’akpa nta, ma e kwesịghị idebe ya ka a na-ahụ ya.
15 min: “Ị̀ Na-enyere Nwa Gị Aka Ịhọrọ Jehova?” Okwu okenye ga-ekwu site n’Ụlọ Nche nke October 1, 1994, peji nke 26-30. Mesie ike ihe mere ọzụzụ mgbe a bụ nwata ji dị mkpa na otú nne na nna pụrụ isi tinye oge ha na nke a. Kọwapụta abamuru ndị dị ná mkpakọrịta na ihe nlereanya ọma. Jiri ọṅụ nke ịhụ ụmụ ka ha na-ahọrọ Jehova mechie.
10 min: Tụlee Akwụkwọ A Ga-enyefe na September. Anyị ga-eji akwụkwọ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe ná mkpọsa pụrụ iche. Akwụkwọ Ndụ Ebighị Ebi dị mfe nghọta, ọ na-akpalikwa olileanya. O nwere ihe karịrị ihe osise 100. E ji ajụjụ mee isiokwu nke isiakwụkwọ 11 iji kpalite mmasị. Isi 1 na-enye ihe ezi uche dị na ha ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs na-ejighị bụrụ nrọ. Isi nke 7, “Ihe Mere Anyị Ji Nọdụ n’Ebe a,” ga-amasị ndị jụworo banyere nzube nke ndụ. N’ihi ọgba aghara na ajọ omume juru ebe nile taa, isi nke 11, “Gịnị Mere Chineke Ji Kwere Ka Ajọ Omume Dịrị?” ga-akpali nnọọ mmasị ọtụtụ ndị nwe ụlọ. Isi nke 29, “Ime Ka Ndụ Ezinụlọ Na-aga Nke Ọma,” ga-adọrọ mmasị ma ndị bụ di ma ndị bụ nwunye. A pụrụ iji ihe osise ndị dị na peji nke 156-158 banyere ihe ga-eme n’ụwa ọhụrụ Chineke malite nkwurịta okwu n’ụzọ dị mfe. Mee ka onye nkwusa ruru eru jiri otu n’ime ụzọ ndị a isi jekwu mmadụ mee ihe ngosi nke ụzọ dị mkpirikpi isi nyefee akwụkwọ Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na i mere atụmatụ iji Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, na Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma mee ihe, ị pụrụ ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke gị na-adabere n’ihe kwesịrị ekwesị site na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ atọ ahụ.
Abụ 113 (143) na ekpere mmechi.