Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na December: Bekee—New World Translation n’ụtụ ₦320, ya na akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? n’ụtụ ₦80. Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures n’ụtụ ₦120. Ọ bụrụ na ọ dịghị, nyefee Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’ụtụ ₦240, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible n’ụtụ ₦240. Ọ bụrụ na ọ dịghị, nyefee akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji. January na February: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ma ọ bụ True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, ma ọ bụ Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? (A ga-enyefe akwụkwọ nile dị 192 peji e depụtara n’elu n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦40]; akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, na Yoruba bụ ₦80 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦50]. E zigaara òtù ndị okenye nile akwụkwọ ozi banyere nke a na May.) RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ịmalite ịtụ ọda mpịakọta Ụlọ Nche na Teta! (Bekee) nke 1996 n’ọda akwụkwọ ha nke December.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere mee mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ Ememe Ncheta nke 1998 ga-abụ na Saturday, April 11, mgbe anyanwụ dasịrị. A na-ama ọkwa nke a n’oge banyere ụbọchị Ememe Ncheta 1998 ka ụmụnna wee nwee ike ime nchekwa ndị dị mkpa ma ọ bụ nweta ụlọ nzukọ ndị e nwere mgbe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, nke na ha aghaghịkwa ịchọta ebe ndị ọzọ.
◼ N’ihi ịdị mkpa nke ememe ahụ, n’ikenye onye ga-ekwu okwu Ememe Ncheta, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eru kama nanị ịdị na-eme onye mee ibe ya emee ma ọ bụ ịdị na-eji otu nwanna eme ihe kwa afọ.
◼ Kaseti Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi (Kaseti ise n’otu ọbọ́)—Bekee
◼ Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere:
To the Ends of the Earth—Bekee