Nzukọ Ije Ozi Maka May
Izu Na-amalite May 5
Abụ 130
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
12 min: “Nọgide Na-eso Jisọs.” Ajụjụ na azịza. Gụnye ahụmahụ ndị sitere n’Ụlọ Nche nke June 1, 1993, peji nke 12.
23 min: “Gosi Ezi Nchegbu Maka Mmasị Nile A Chọtara.” Nkwurịta okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Mesie ike mkpa ọ dị isochi mmasị nile a chọtara. Tụọ aro ụzọ akọ ụfọdụ isi jụta adres ebe obibi nke ndị e zutere n’ebe ọha na eze na-anọ ka anyị wee nwee ike ịgbakwuru ha àmà. Mee ka ndị nkwusa ruru eru mee ihe ngosi abụọ n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha na paragraf nke 6-9. Tụlee igbe bụ́, “Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi,” na peji nke 3 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1997. Gbaa mmadụ nile ume idokwa oge ụfọdụ kwa izu iji mee nletaghachi.
Abụ 151 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 12
Abụ 133
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ, gụnyere ndokwa ije ozi ubi maka ngwụsị izu.
15 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu.
20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ nke 1997.” (Paragraf nke 1-8) Ntụle ajụjụ na azịza nke odeakwụkwọ ga-eme. Gụpụta paragraf nke 3, 5, na 8. Mesie ike mkpa ọ dị dị ka Akwụkwọ Nsọ gosiri inye nkwado nrubeisi maka ndokwa ebe obibi.
Abụ 162 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 19
Abụ 139
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Ebe Obibi Ndị Na-aga n’Ihu.” Nwanna ruru eru esoro otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ na-eme nke ọma n’iduzi ọmụmụ ihe tụlee isiokwu a. N’iji akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe dị ka ihe nlereanya, ha akọọ ụzọ izi ihe ndị na-enyere ha aka ime ka ọmụmụ ihe ahụ nọgide na-aga n’ihu, nke na-enyekwa ha ohere ịchọpụta ihe onye ahụ a na-amụrụ ihe na-amụta n’ezie.—Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, paragraf nke 5, 8, 12, na 21.
15 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ nke 1997.” (Paragraf nke 9-14) Ntụle ajụjụ na azịza nke onye okenye ruru eru ga-eme. Gụpụta paragraf nke 10.
Abụ 165 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 26
Abụ 148
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi akwụkwọ a ga-enyefe na June. N’iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe, kọwaa otú a pụrụ isi jiri echiche ndị dị na paragraf nke 17-19 na peji nke 10-11 kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu dị mkpirikpi. Gbaa mmadụ nile ume itinye uche n’ịgbalị ịmalite ọmụmụ ihe. Mesie ike mkpa ọ dị inyere ndị nwere mmasị aka inwe ọganihu ngwa ngwa.—Lee Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peji nke 13-14.
12 min: “N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Anọgide Na-alaghachi?” Ajụjụ na azịza. Gụnye isi ihe ndị sitere n’igbe dị na peji nke 570 n’akwụkwọ Proclaimers.
18 min: Mkpa ọgbakọ. Okwu onye okenye ga-ekwu ma ọ bụ nkwurịta nke ndị okenye abụọ ga-enwe, na-eleba anya ná mkpa ime mmụọ nke ọgbakọ. Nye agbamume Akwụkwọ Nsọ na aro ndị bara uru maka imeziwanye.
Abụ 174 na ekpere mmechi.