Gịnị Ka M Ga-ekwu?
Mgbe anyị zutere ndị mmadụ n’ozi, ha wee zaghachi nke ọma, anyị na-achọ ịlaghachi ịgbakwuru ha àmà. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na anyị ejighị n’aka ihe anyị ga-ekwu iji malite mkparịta ụka ọzọ. Ị pụrụ ịnwale ụzọ a: Welite ajụjụ na-akpali mmasị, ma mgbe ahụ sapeta akwụkwọ Reasoning iji gosi azịza nke Akwụkwọ Nsọ. Ọ ga-enye aka inwe ndepụta ajụjụ dị iche iche ndị ị pụrụ isite na ha họrọ nke i chere pụrụ inweta nzaghachi kasị mma maka otu nleta kpọmkwem. Ndepụta dị n’okpuru, nke a chịkọtara site n’akwụkwọ Reasoning, na-egosi nọmba peji ebe a na-achọta azịza nke ọ bụla:
◼ Gịnị mere anyị ji aka nká na-anwụkwa anwụ? (98)
◼ È nwere ezi ihe ndị kpatara a ga-eji kwere na Chineke? (145)
◼ Chineke ọ̀ na-eche n’ezie banyere ihe na-eme anyị bụ mmadụ? (147)
◼ Ọ̀ bụ iwu na mmadụ ga-aga eluigwe iji nwee ezi ọdịnihu nke obi ụtọ? (163)
◼ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịmara na iji aha aka Chineke na-eme ihe? (196)
◼ Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emezu? (227)
◼ Gịnị bụ nzube nke ndụ mmadụ? (243)
◼ N’ihi gịnị ka e ji nwee nnọọ ọtụtụ okpukpe? (322)
◼ Olee otú mmadụ pụrụ isi mara okpukpe nke dị mma? (328)
◼ Onye dị ike hà aṅaa ka Setan bụ n’ụwa taa? (364)
◼ N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? (393)
◼ Gịnị mere ajọ omume ji jupụta? (427)
Ị pụrụ itinye ụdị ndepụta ajụjụ dị otú a n’ime Bible ma ọ bụ akwụkwọ Reasoning gị maka iji chọta ihe ngwa ngwa. Ibu ihe doro anya n’uche ị ga-ekwu ná nletaghachi ga-agba gị ume inwe okwukwe n’isochi mmasị nile ị na-achọta.