Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/98 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 1/98 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1985 n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦40. Ọ bụrụ na ọgbakọ ọ bụla nwere Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, ha nwekwara ike inyefe mbipụta a n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦40. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị ọzọ dị peji 192 e bipụtara tupu 1985 bụ́ ndị e biri n’akwụkwọ na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego a e mere ka ọ dị ala. Akwụkwọ ndị ọzọ a pụrụ inyefe: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ n’ọnụ ego ₦55, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (nke nnukwu, ₦170; nke obere, ₦85). February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ A ga-enye ndị nkwusa nile e mere baptism nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu January 5 kaadị Advance Medical Directive/ Release na Identity Card maka ụmụ ha.

◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 1, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ì Nwere Echiche Chineke Banyere Ndụ?”

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 1998 na Sunday, March 29. A ga-enye ihe ndepụta. Ọgbakọ ndị onye nlekọta sekit na-eleta, ndị nwere mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-enwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị inwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu March 29, 1998.

◼ Òtù ndị okenye kwesịrị ịmara na mgbanwe ndị na-esonụ dị mkpa mgbe ọgbakọ na-aga mgbakọ maka ógbè ha: Mgbe e dokwara usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, ọgbakọ kwesịrị inwe nzukọ nile a na-enwe n’izu, nanị na a kagburu Nzukọ Ihu Ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Mgbe e dokwara ịga mgbakọ sekit, ọgbakọ ga-akagbukwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi; nanị Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ka a ga-enwe n’ọgbakọ n’izu ahụ.

◼ Òtù Na-achị Isi akwadowo ka e nwee mkpọsa pụrụ iche iji mee ka akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ ruo ndị mmadụ n’ebe ọ bụla n’ọnwa February. E kwesịkwara iji Teta! nke August 8, 1997, mee ihe n’ebe e nwere ya. N’ijikọ ya na mkpọsa a, na March 1998, ọgbakọ ọ bụla ga-ekwu okwu ihu ọha ndị pụrụ iche na-emetụta ndụ ezinụlọ. Onye isi oche ndị nlekọta kwesịrị ịhazi ka a mapawa ihe ndepụta okwu ndị ahụ na bọọdụ ima ọkwa.

◼ Na-amalite n’izu nke May 4, 1998, dịgide ruo izu nke February 15, 1999, a ga-amụ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya