Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/98 p. 7
  • Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu n’Ozi Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu n’Ozi Anyị
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikwusara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Ihe Ị Ga-eme Mgbe Onye Nwe Ụlọ Na-asụ Asụsụ Ọzọ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • ‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Unu Nwere Ike Ịga Chọọ Ha Tupu Unu Agaa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 1/98 p. 7

Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu n’Ozi Anyị

1 “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu,” ka Pita kwuru, kama “onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Anyị na-eje ozi anyị taa ná nghọta zuru ezu nke eziokwu ahụ e kwupụtara n’ụzọ doro anya. Ya mere, ọ dị mkpa na anyị tinyere mgbalị nile iji merie ihe ọ bụla ga-egbochi anyị iji ozi ọma ahụ jekwuru onye ọ bụla.

2 Mgbe anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ebe ụfọdụ, ọ naghị eju anya ịhụ ndị na-adịghị asụ ma ọ bụ aghọta asụsụ e ji eme ihe n’ọgbakọ anyị. Ihe mgbochi asụsụ na-eme ka ụfọdụ ghara iritezu uru n’ozi Alaeze anyị na-ekwusa. Ndị ntị chiri, bụ́ ndị na-eji asụsụ ogbi akparịta ụka, so ná ndị a. Gịnị ka a pụrụ ime iji nye aka imeri ihe mgbochi asụsụ nke na-egbochi anyị iji ozi ọma ahụ ejekwuru ndị a n’ụzọ dị irè?

3 Society ezigaworo ọgbakọ nile na Nigeria fọm S-70a, Sign-Language Follow-up Slip. Nzube nke mpempe akwụkwọ a bụ iji jide n’aka na e nyere ndị na-eji asụsụ ogbi eme ihe ohere inweta ozi Alaeze n’asụsụ ha.

4 Ọ bụrụ na ị dịghị aghọta asụsụ ogbi, i wee hụ onye ntị chiri n’ókèala unu, i kwesịrị idejupụta otu n’ime mpempe akwụkwọ ndị a n’ụzọ ga-ekwe ngụta. E kwesịrị ime nke a ọbụna ma ọ bụrụ na onye ahụ egosighị mmasị n’eziokwu ahụ. Ikekwe ị gaghị enwe ike mgbe nile inweta aha onye ahụ, ma i kwesịrị idepụta adres na asụsụ ọ na-aghọta. A pụrụ itinye mpempe akwụkwọ ahụ n’igbe akụkọ ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Odeakwụkwọ ga-achịrị mpempe akwụkwọ ahụ, lee ma e dejupụtakwara ha nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ngụta, wee zigara ha Society ma ọ bụ ọgbakọ kasị nso ebe a na-atụgharị okwu gaa n’asụsụ ogbi. Ha ga-agbalị ikenye onye ntụgharị okwu asụsụ ogbi ọrụ ịga leta onye ahụ ntị chiri.

5 Gịnị ma ọ bụrụ na e nweghị onye ntụgharị okwu nọ nso ileta onye ahụ ntị chiri? Mgbe ahụ, Society ga-amalite idere onye ahụ ntị chiri akwụkwọ ma tinye aha ya ná ndepụta anyị nke ndị ntị chiri. Ọ pụrụ mgbe ahụ ịtụ ọda akwụkwọ na Bekee maka ndị ntị chiri site n’ọgbakọ.

6 Kpọọ ha òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ ịbịa nzukọ ndị Kraịst. Na-ekere òkè n’ịnọnyere ndị ntị chiri. Na-edetu ihe n’oge nzukọ ma soro ndị ntị chiri bụ́ ndị nwere mmasị kerịta ha. Mee ka ha na-ekere òkè ná nzukọ. Ha pụrụ idetu azịza ha maka paragraf ụfọdụ kpọmkwem ma mee ka mmadụ gụpụta azịza ha.

7 Gịnị ọzọ ka ndị okenye pụrụ ime? Ndị okenye pụrụ ikenye otu n’ime ndị ọsụ ụzọ ka ruo eru, nke nwere mkpalị dị nnọọ mma ileta onye ntị chiri bụ́ onye gosiri nnọọ ezi mmasị. Ọ bụrụ na onye ahụ ntị chiri gụrụ nnọọ akwụkwọ, ọ pụrụ ikwe omume ịmụ ihe, na-eji ụzọ ime ihe nke pensịl na akwụkwọ na-eme ihe. Ụfọdụ pụrụ inwe ike inwe ọmụmụ ihe na-eji vidio, bụ́ Knowledge That Leads to Everlasting Life [Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi], n’asụsụ ogbi nke America eme ihe. Ndị ọzọ pụrụ irite uru site n’ịmụ broshuọ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!

8 Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ịmụrụ anya iji mpempe akwụkwọ nsochi ndị ahụ eme ihe ma ọ dị mkpa. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị fọm S-70a, a pụrụ idetu ihe ọmụma dị mkpa ná ntakịrị mpempe akwụkwọ ma weta ya n’ụzọ a kọwara n’elu. Site n’itinye ezi mgbalị iji jiri ozi ọma ahụ jekwuru mmadụ nile n’agbanyeghị asụsụ ha, anyị ga na-egosipụta ịhụnanya Chineke anyị, bụ́ Jehova, “Onye na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Tim. 2:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya