Na-enwe Obi Ụtọ n’Ịgba Àmà Zuru Ezu
1 Anyị nile na-enwe ọṅụ ime ihe anyị na-eme nke ọma. Mak 7:37 na-ekwu na ìgwè mmadụ kwuru banyere Jisọs, sị: “O mewo ihe nile nke ọma.” Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji nwee obi ụtọ n’ime uche Jehova! (Tụlee Abụ Ọma 40:8.) Site n’iche banyere aro ndị na-esonụ, anyị n’otu aka ahụ ga-enweta ọṅụ ka anyị na-erube isi n’iwu Jisọs ‘ikwusara ndị mmadụ na ikwusi ike.’ (Ọrụ 10:42) Na January anyị na-enyefe akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 e biri tupu 1985 bụ́ ndị ọgbakọ pụrụ inwe ma ọ bụ akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Olee otú anyị pụrụ isi jiri mbipụta ndị a gbaa àmà zuru ezu?
2 Ebe ndị mmadụ na-echekarị banyere okwu ahụ ike, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “N’agbanyeghị oké ihe ndị a rụzuru n’ihe banyere ọgwụ na ahụ ike, e nwere oké nhụsianya n’ihi nrịanrịa. N’echiche gị, gịnị kpatara nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jisọs Kraịst kwuru na ọrịa na-efe efe ga-abụ akụkụ nke mgbe ikpeazụ a. (Luk 21:11) Ma Bible na-akọwakwa oge mgbe ọrịa na-agaghị adịkwa. [Gụọ Aịsaịa 33:24.] Rịba ama ụzọ akwụkwọ nta a si akpali olileanya ná nkụzi Bible ahụ gbara ọkpụrụkpụ.” Mee ka okwu ndị kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ ị na-enyefe pụta ìhè, wee nyefee ya n’ọnụ ego ahụ e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦40.
3 Mgbe ị na-agba àmà mberede na nso ọma ahịa, ị pụrụ ikele ekele wee sị:
◼ “Ọ̀ na-eyi gị ka ihe hà na-agala ọnụ nke ukwuu n’ụbọchị ndị a nke na o siri ike inweta ego ga-ezunụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ì chere na oge ga-emesịa ruo mgbe a ga-enwe ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’akụ̀ na ụba?” Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ webata nhota Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị site n’akwụkwọ ị na-enyefe. Gaa n’ihu site n’ịsị: “Akwụkwọ a na-egosi ụzọ, site n’Alaeze ya, Chineke ga-esi gwọta nsogbu ndị na-eme ka ndụ sie oké ike taa.” Nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego ahụ e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦40. Ị pụrụ ikwu otú nkwurịta okwu ahụ si tọọ gị nnọọ ụtọ wee jụzie: “È nwere ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi gaa n’ihu ná mkparịta ụka a n’oge ọzọ?” N’ụzọ dị otú a ị pụrụ inwe ike inweta aha na adres ebe obibi onye ahụ.
4 Ị pụrụ inwe ohere ịnwale ụzọ nke a nke iche ihe n’ihu mmadụ banyere udo ụwa, na-eji akwụkwọ “Ịdị Ndụ Ebighị Ebi”:
◼ “N’echiche gị, n’ihi gịnị ka o ji sie oké ike inweta udo ụwa? [Nye ohere maka nzaghachi, gosizie ihe osise dị na peji nke 20-21.] Nke a bụ ihe osise nke ihe omume Bible a kọwara ná Mkpughe. [Gụọ Mkpughe 12:7-9, 12 kpọmkwem site na paragraf nke 17. Mgbe ahụ gụpụta okwu nkọwa so ihe osise ahụ.] Enweghị udo n’ụwa bụ otu n’ime ihe si n’ịchụdata Ekwensu n’ụwa pụta. Akwụkwọ a na-aza ọtụtụ ajụjụ dị mkpa, obi dịkwa m ụtọ ime ka o ruo gị aka ma ọ bụrụ na ị ga-agụ ya.”—Iji nweta ụzọ ndị ọzọ dị irè isi chee akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ihu mmadụ, lee peji azụ nke mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke September 1995, February 1995, September 1994, September 1993, na August 1992.
5 Mgbe ị na-alaghachi ịhụ ndị gosiri mmasị, ị pụrụ ịgbalị ịmalite ọmụmụ Bible site n’iji ụzọ njekwu a mee ihe:
◼ “Mgbe ikpeazụ anyị kwurịtara okwu, i kwuru otu ihe na-adọrọ oké mmasị. [Kwuo ihe onye ahụ kwuru.] Anọwo m na-eche banyere nke ahụ, ọ ga-amasịkwa m iso gị kerịta ihe si ná nnyocha ụfọdụ m mere n’isiokwu ahụ pụta. [Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ kwesịrị ekwesị.] Anyị na-ekwu ka anyị duzie usoro ọmụmụ ihe n’efu nke meworo ka ọtụtụ nde mmadụ nwee ike ịchọpụta nkụzi ndị gbara ọkpụrụkpụ nke Bible n’ime oge dị mkpụmkpụ. Nnyocha dị otú ahụ pụrụ iwulite obi ike gị ná mmezu e ji n’aka nke nkwa Chineke.” Kọwapụta ajụjụ ụfọdụ a ga-aza. Ọ bụrụ na onye ahụ ajụ ịnakwere ọmụmụ Bible, kọwaa na anyị nwekwara usoro pụrụ iche na-aga ngwa ngwa nke na-ewe nanị minit 30 kwa izu ruo izu 16. Gosi broshuọ Na-achọ, sapeta ihe ọmụmụ nke 1, jụọkwa ma ị pụrụ ime ngosi nke ihe ọmụmụ mbụ.
6 Cheta Iji Mpempe Akwụkwọ Eme Ihe: A pụrụ iji ha mee ihe n’ụzọ dị irè n’okwu mmeghe gị iji kpalite mmasị n’ihe ime mmụọ, ma ọ bụ a pụrụ inyefe ha ma ọ bụrụ na a naraghị akwụkwọ ọ bụla. N’ebe e nwere mmasị, jiri ozi e biri ebi dị n’azụ mpempe akwụkwọ ahụ gbaa onye ahụ ume ịnakwere ọmụmụ Bible ebe obibi na ịbịa nzukọ anyị.
7 Dị nkà n’ọrụ gị, ị ga-enwekwa ọṅụ na ya. Na-eburu n’uche mgbe nile ịgba àmà zuru ezu, na-enwetakwa obi ụtọ n’ịrụ akụkụ nile nke ozi ahụ nke ọma.—1 Tim. 4:16.