Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’ụtụ ₦55. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! June: Nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị na-esonụ dị peji 192 nke ọgbakọ nwere: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, “Ka Alaeze Gị Bịa,” Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, na Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ndị nkwusa chọrọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April na May kwesịrị ime ndokwa ha ugbu a ma tinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enyere ndị okenye aka ime ndokwa ozi ubi ndị dị mkpa, nweekwa magazin na akwụkwọ ndị ọzọ zuru ezu. E kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa aha ndị nile a kwadoworo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ga-adịrị ndị mmadụ mfe maka ime Ememe Ncheta n’afọ a na Saturday, April 11, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu ahụ pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ iji mee ihe n’uhuruchi ahụ. Ememe Ncheta ahụ ekwesịghị ịmalite mgbe oge gafeworo nke na ọ ga-enye ndị ka na-enwe mmasị ọhụrụ nsogbu ịbịa. Usoro ihe omume ahụ ekwesịghịkwa ịdị mkpagide nke na e nweghị ohere tupu ma ọ bụ mgbe ememe ahụ gasịrị maka ikele ndị ọbịa, ime ndokwa iji nọgide na-enyere ndị nwere mmasị aka n’ụzọ ime mmụọ, ma ọ bụ iji gbarịta mmadụ nile ume. Mgbe a tụlesịworo ihe nile nke ọma, ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-enyere ndị ga-abịa Ememe Ncheta ahụ aka karịsịa irite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe omume ahụ.
◼ Eri January 1, 1998, a nakwaghị akpọ Ala Mgbakọ anyị aha ahụ. A na-akpọzi ihe owuwu ndị a Ụlọ Mgbakọ.