Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/98 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị Echiche
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ùnu Nwere Obi Dị Nro Dị Ka Anụ Ahụ́?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 3/98 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya n’ụzọ pụrụ iche banyere uwe na ejiji anyị mgbe anyị na-eleta ihe owuwu Society dị na Brooklyn, Patterson, na Wallkill, New York, na alaka ụlọ ọrụ dị gburugburu ụwa?

E lere anya na ndị Kraịst ga na-ejikwa onwe ha nke ọma. Uwe na ejiji anyị n’oge nile kwesịrị igosipụta ịdị mma na ùgwù nke kwesịrị ndị ohu Jehova Chineke. Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe a na-eleta ihe owuwu ndị dị na New York na n’alaka ndị dị gburugburu ụwa.

Na 1998, a ga-enwe mgbakọ distrikti na mgbakọ mba nile. Ọtụtụ puku ụmụnna anyị sitere ọtụtụ ala ga-eleta isi ụlọ ọrụ Society dị na New York tinyere alaka dị iche iche ná mba ndị ọzọ. Ọ bụghị nanị mgbe a na-eleta ihe owuwu ndị a, kama n’oge ọ bụla ọzọ, ọ dị anyị mkpa ‘ime ka mmadụ mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke ozi n’ihe nile,’ tinyere uwe na ejiji anyị kwesịrị ekwesị.—2 Kọr. 6:3, 4.

Mgbe ọ na-atụle ịdị mkpa nke uwe na ejiji kwesịrị ekwesị, akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị kwuru okwu banyere mkpa ọ dị ịdị ọcha n’anụ ahụ, uwe kwesịrị ekwesị, na ejiji dị mma mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ubi na mgbe anyị na-eje nzukọ nile nke ndị Kraịst. Mgbe ahụ, na peji nke 131, paragraf nke 1, o kwuru, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa mgbe a na-eleta ebe obibi Betel na Brooklyn ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nke Society. Cheta, aha ahụ bụ Betel pụtara ‘Ụlọ Chineke,’ ya mere uwe, na ejiji na omume anyị kwesịrị ịdị ka ihe a tụrụ anya ya n’aka anyị mgbe anyị na-eje nzukọ maka ofufe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Ndị nkwusa Alaeze bi gburugburu ebe ahụ na ndị si n’ebe ndị dị anya karị bụ́ ndị bịara ịhụ na isoro ndị òtù ezinụlọ Betel kpakọrịta na ileta ihe owuwu alaka kwesịrị inwe otu ụkpụrụ ahụ dị elu.

Uwe anyị kwesịrị inwe mmetụta dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ banyere otú ha si ele ezi ofufe Jehova anya. Otú ọ dị, a hụtawo na ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ụfọdụ, mgbe ha na-eleta ihe owuwu Society, yiri ka ha adịghị elezi uwe ha anya ma ọlị. Uwe dị otú ahụ ekwesịghị ekwesị mgbe a na-eleta ebe obibi Betel ọ bụla. N’okwu a, dị ka ọ dị n’akụkụ ndị ọzọ nile nke ndụ ndị Kraịst anyị, anyị chọrọ ijide otu ụkpụrụ ndị ahụ dị elu ndị na-eme ka ndị Chineke dị iche n’ụwa site n’anyị ime ihe nile iji wee nye Chineke otuto. (Rom 12:2; 1 Kọr. 10:31) Ọ dịkwa mma isoro ndị anyị na-amụrụ Bible na ndị ọzọ kwurịta okwu, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-eleta Betel nke mbụ ha ma chetara ha mkpa ọ dị ichebara uwe na ejiji kwesịrị ekwesị echiche.

Ya mere mgbe ị na-eleta ihe owuwu Society, jụọ onwe gị, sị: ‘Uwe m na ejiji m ọ̀ bụ nke kwesịrị ekwesị?’ (Tụlee Maịka 6:8.) ‘Ọ̀ na-eweta aha ọma n’ebe Chineke m na-efe ofufe nọ? Otú m dị ọ̀ ga-adọpụ uche ndị ọzọ ma ọ bụ kpasuo ha iwe? M̀ na-esetịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị maka ndị ọzọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-eme nleta nke mbụ ha?’ Mgbe nile, site n’uwe na ejiji anyị, ka anyị “chọọ ozizi nke Onye nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.”—Taịtọs 2:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya