Maịka
6 Biko, nụrụnụ ihe Jehova na-ekwu.
Bilienụ, zaranụ ọnụ unu n’ihu ugwu ukwu niile,
Ka ugwu nta niile nụkwa olu unu.+
2 Ugwu niile, nụrụnụ ihe Jehova kwuru na e mere ya.
Ntọala ụwa nke siri ike, nụrụkwanụ,+
N’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu.
Nụrụnụ ihe ọ sị na ndị Izrel mere ya:+
3 “Ndị m, gịnị ka m mere unu?
Oleekwa otú m si mee ka ike m gwụ unu?+
Kwuonụ ihe m mere unu.
Agbapụtara m unu n’ala unu bụ ndị ohu.+
Eziteere m unu Mosis, Erọn, na Miriam.+
6 Olee ihe m ga-eji bịa n’ihu Jehova?
Olee ihe m ga-eji kpọọrọ Chineke nọ n’elu isiala?
M̀ ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bịa n’ihu ya?
M̀ ga-eji ụmụ ehi gbara otu afọ bịa n’ihu ya?+
7 Puku kwuru puku ebule ọ̀ ga-adị Jehova mma?
Mmanụ nke na-asọ ka iri puku kwuru iri puku iyi ọ̀ ga-adị ya mma?+
M̀ ga-enye ọkpara m maka isi m nupụrụ?
M̀ ga-enye mkpụrụ nke afọ m maka mmehie m?*+
8 Gịnwa bụ́ mmadụ, Jehova agwala gị ihe dị mma.
Gịnịkwa ka ọ na-achọ n’aka gị?
9 Olu Jehova na-akpọ obodo òkù.
Ndị nwere ezigbo amamihe ga-atụkwa egwu aha ya.
Nụrụnụ ihe mkpanaka na onye họpụtara ya na-ekwu.+
10 È nwere akụ̀ a kpatara otú na-adịghị mma
Ma ọ bụ efa* na-ezughị ezu, nke rụrụ arụ, ka dị n’ụlọ onye ajọ omume?
11 Aka m ọ̀ dị ọcha ma m nwee ihe na-adịghị mma e ji atụ̀ ihe
Na akpa nkume e ji atụ̀ ihe, nke e ji egwu wayo?+
12 N’ihi na ndị ya bara ọgaranya bụ ndị tigbuo zọgbuo.
Ndị bi n’obodo a na-aghakwa ụgha.+
Ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.+
13 “N’ihi ya, m ga-eti gị ihe, merụọkwa gị ahụ́.+
M ga-eme ka ị tọgbọrọ chakoo n’ihi mmehie gị.
14 Ị ga-eri ihe ma afọ agaghị eju gị.
O nweghị ihe ga-adị gị n’afọ.+
O nweghị ebe ị ga-ebusa ngwongwo ị kwapụtara, ndị ọzọ aghara iburu ya.
M ga-enyefe ndị iro gị ngwongwo ị kwapụtara.
15 Ị ga-akụ mkpụrụ, ma ị gaghị aghọrọ ya.
Ị ga-azọcha mkpụrụ oliv, ma ị gaghị ete mmanụ ya.
Ị ga-emepụta mmanya ọhụrụ, ma ị gaghị aṅụ mmanya.+
16 N’ihi na unu na-eme ihe niile Ọmraị na ezinụlọ Ehab mere.+
Unu na-akpakwa àgwà otú ha kpara.
Ọ bụ ya mere m ga-eji mee obodo a ihe ọ ga-abụ, ndị mmadụ hụ ya, ya eju ha anya.
Ndị bi n’obodo a ga-abụkwa ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+
Ndị dị iche iche ga-akọchakwa ha.”+